Prince Harry: 'Egburu m mmadụ 25 na Afghanistan' na ihe ndị ọzọ Nwaeze Harry kwuru n'akwụkọ ya.

Dịka ọtụtụ ndị mmadụ na-eche ka akwụkwọ Nwaeze Ingland bụ Harry pụta n'ụbọchị iri nke ọnwa Jenuwarị a, enwerela ụfọdụ ihe dị na ya bụ akwụkwọ pụtarala ihe.

Agbanyeghị na akwụkwọ a apụtabeghị n'ọtụtụ ebe, kama ewepụtala ua na mba Spen n'ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị.

Aha akwụkwọ ya nke ọ kpọrọ 'El la Sombra n'okwu ndị spen nke pụtara "N'ime Onyinyo" dịka a na-atụanya na nke ga-apụta n'okwu bekee ga-abụ "Spare".

Ihe gbara ọkpụrụ anyị matarala ọ dere n'ime akwụkwọ a

  • Nwanne ya nwoke bụ Nwaeze William lụsoro ya ọgụ aka maka nghọtaghe ọyịyị ya na Meghan Markle
  • Ọ nụrụ ọgwụ n'ana n'anya nke gụnyere Koken, Igbo na 'Magic Mushroom'.
  • Ọ gburu mmadụ 25 mgbe ọ bụ ọkwọọ ụgbọleu ndị agha na mba Afghanistan.
  • Onye na-ahụ ohu gwara ya na nne ya nwụrụ anwụ bụ Princess Diana kwadoro etu o siri bịrị na mba Amerịka.
  • Ọ depụtwakwara na ya na nwanne ya nwoke gwara nna ha bụ Eze Charles nke III ka ọ hapụ ịlụ nwunye ya nke abụọ bụ Camilla onye bụ Nwunye Eze ugbua.
  • O kwuru na ọ chọrọ ka ya na ezinụlọ ya kpezie n'udo kama tupu nke a emee, ọ chọrọ ka ha kweta na ọ bụ ha butere nghọtaghe dị n'etiti ha.