Ihe Abaribe kwuru maka mwega ikpe Nnamdi Kanu n'Uloikpe Kachasi

Sinetọ Enyinnaya Abaribe na-anọchite Abịa-South n’Ụlọomeiwu Ukwu Naijiria agbarụọla ihu na mwepụ Gọọmentị Etiti wepụrụ okwu n'ikpe onye ndu Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ Nnamdi Kanu, n’Ụlọikpe Kachasị n'agbanyeghị arịrịọ ndị Sinetọ na ndị ọzọ nwere agba rịọrọ ka atọhapụ ya.

Gọọmentị Etiti site n’ụlọọrụ Ọkaiwu Naijiria bụ Abubakar Malami, nọrọ n’abalị 19 nke ọnwa Ọktoba afọ 2022 gbaa akwụkwọ n’Ụlọikpe Kachasị iji gbagha mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere sị ka atọhapụ Kanu, na ikpe amaghị ya n’ebubo asaa metụtara iyi ndụ egwu nke ha gbaburu ya.

N’ozi si na mkparịtaụka BBC Igbo na Abaribe nwere n’ekwentị ụbọchị Fraide, Ọ sịrị na ‘ihe Gọọmentị Etiti mere tara ọjị anya'.

“Anyị nweburu olileanya na a ga-ege ntị n'arịrịrịọ anyị niile na nke ụmụamala Naijiria ihe ọma na-adị mma rịọrọ.

“N'agbanyeghị na Gọọmentị Etiti na-eche na ha nwere ikike ikpe ya bụ ikpe n’ụlọikpe, anyị ka na-eche na ihe kacha mma idozi okwu ahụ nakwa okwu mkpu nnwereonwe ndị ọzọ bụ isi ụzọ ndọrọndọrọ ọchịchị gboo ya.”

Na nso nso a, ndị Sinetọ 14 si Ọwụwa Anyanwụ (Anambara, Enugwu, Imo, Abia na Ebonyi) rịọrọ Gọọmentị Etiti ka ha ghara iwega ikpe Kanu Ụlọikpe Kachasị, sị na nke a nwere ike iweta imebi ịdịnaọtu Naijiria.

Cheta na Ụlọikpe Mkpegharị nọrọ n’abalị 13 nke Ọnwa Oktoba 13, 2022, nye iwu ka atọhapụ Kanu na ikpe amaghị ya n’ebubo iyi ndụ egwu.

Ụlọikpe Mkpegharị kwuru na ha gbadoro ụkwụ na ntọrọ e si mba Kenya tọrọ Kanu nke ụlọikpe ahụ kwuru megidere iwu Naijiria nakwa nke mbaụwa.

Ebe asaa ụlọọrụ Malami gbadoro ụkwụ agbagha mkpebi Ụlọikpe Mgbegharị

  • N’akwụkwọ ha ji gbaa Kanu akwụkwọ n’Ụlọikpe Kachasị nke ndị binyere ya aka Nke mbụ gụnyere direktọ na-ahụ maka iwepụ okwu Gọọmentị Etiti n’ụlọikpe bụ Mohammadu Abubakar, Osote onyeisi ikpe Etiti bụ Dkawe, Aalluko nakwa ọkaiwu G Nweze, Gọọmentị Etiti kwuru na Ụlọikpe Mkpegharị dajọrọ n’ikpe ya mgbe ụlọikpe ahụ kwuru na o nweghị ikike ikpe ya bụ ikpe n’ihi “ntọrọ a tọọrọ onye a na-ekpe ikpe.”

Ozi ahụ kwuru sị, “Onweghị ihe akaebe nke onye a na-ekpe ikpe wetara n’ụlọikpe mbụ iji gosi n’ezie na atọọrọ ya kpụlata ya na Naijiria dịka akụkọ 139 nke Iwu Ihe Akaebe nke afọ 2011 si kwuo, ebe ọ bụ na ọ na-ebo ebubo na a tọrọ ya n’ụzọ ezighị ezi.”

  • Gọọmentị Etiti kwuru na ụlọikpe Mkpegharị dajọrọ site na ikpebi na gọọmentị ekweghị irete uru site na ntọrọ ahụ ekweghị ekwesị “ebe ọ bụ na a hapụrụ onye a na-ekpe ikpe irite elele inupụ isi na ntuziaka ụlọikpe nyere oge ọ gbara ọsọ mgbe e neyere yuya ohere si ụlọ bawa ụlọikpe, ebe ikpe a na-ekpe ya ebibeghị, nke a bụghị ikpenkwụmọtọ nye gọọmentị na ndị ọzọmpụ onye a na-ekpe ikpe mere metụtara.”
  • Ụlọikpe Mkpegharị dajọrọ site na ikwu etu e si kpọlata Kanu etinyela aja na garị ma rụọ ebubo iyi ndụ egwu nakwa ebubo ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị.
  • N’ụlọikpe ahụ nyere mkpebi na eleghị anya onweghị ka etu e si kpụlata ya si metụta ebubo ndị eboro ya.
  • Na ndị Ọkaikpe Ụlọikpe Mkpegharị dajọrọ dịka ha kpere ikpe ahụ na-eleghị anya n’ikpe ndị e kperela maka ndị e si n’ụzọ dị aghaa kpọbata nke Ụlọikpe Kachasị si kpebielarala bụ ndị akagbughị ebubo ndị eboro ha.
  • Ụlọikpe Mkpegharị dajọrọ dịka ọ gbadoro ụkwụ rinne n’iwu otu jịkọrọ mba ndị dị n’Afrịka nke metụtara iyi ndụ egwu na nke ikike dịịrị onye nke Bekee kpọrọ “Organisation of African Unions Conventions on the Prevention and Combating of Terrorism”, “African Commission on Human and People’s Rights”, sị na okwu ndị e kpebiri na mba ndị ọzọ agbasaghị ime metụtara mpụ nke Naijiria.
  • “Ụlọikpe ahụ leghara anya ‘okwu onye wetara ikpe(gọọmenti) dịka o si metụta ACJA, 2015 nke gbadoro ụkwụ n’akwụkwọ 36 nke Iwu Naijiria nke afọ 199 9 nke pụtara na Iwu Ikpe Naijiria metụtara Mpụ nke Afọ 2015 (Administration of Criminal Justice Act, 2015) nke e ji ekpe ikpe onye Naijiria ọbụla pụtara na e kpeghị ya bụ ikpe dịka o kwesịrị.”
  • Ụlọikpe Mkpegharị mechiri anya ya na onye a na-ekpe ikpe ịgbaburu ọsọ n’ikpe ịkpa nkata ịkwatu gọọmentị tupu okwu ntọrị ya amaliterị, mkpebi ya gaara adị iche.”

Cheta na a nwụchiri Nnamdi Kanu mbụ n'ọnwa Oktoba, afọ 2015( 14.10.2015) maka ebubo ịkpa nkata ịkewapụ Ọwụwa Anyanw ochie na Naijiria were mee Biafra.

A gbahapụrụ ya ka o si ụlọ na-abịa ikpe n'ọnwa Eprelụ, afọ 2017.

Mana ọ gbapụrụ na Naijiria dịka ndịagha Naijiria wakporo ụlọ nna ya n'Afara-Ukwu, Abịa steeti n'abalị 17 nke Ọnwa Septemba afọ 2017.

Mana A nwụchigharịrị ya n'ọnwa Juun afọ 2021 na mba Kenya , kpụlata ya Naijiria maka ikpe ya ikpe.