Onweghị ebe m ma m ga-agbaga - Nwoke idemmiri juru n'ime ụlọ ya

Idemmiri n'Anambra
Nkọwa foto, Ashley Ifeanyi na-ejisi ụgbọmmiri akpagharị n'ime ụlọ ya.

Ashley Ifeanyi biliri n'otu ụtụtụ gawa ọrụ, mana tupu ọ na-alọta, idemmiri ejula n'ụlọ ebe ya na nwunye ya, ụmụ ya na nne na nna ya bi, n'Ogbaru, Anambra steeti.

Oge ọ batara, mmiri ahụ etorula ya n'ikpere; oche, akwa ndina na ihe ndị ọzọ o ji biri n'ụlọ abụrụla mmiri mmiri.

Ụgbọmmiri ka Ifeanyi jizi akpagharị n'ime ụlọ ya maka na mmiri ejupụtala ebe dum, ọ chọghịkwanụ ịpụ ga soro ndị ọzọ biri n'ebe e wepụtara maka ndị na-agba ọsọ ndụ a kpọrọ 'Internally Displaced Peoples' (IDP) Camp.

"Aga m anọ ebe a. Onweghị ebe m ga-aga. Onye ka m ga-ahapụrụ ụlọ m?," Ifeanyi kwuru.

"M si ebe a pụọ, ndị ohi nwereike ịbata bukọrọ ihe nke fọrọ afọ, maobụ agwọ na ụmụ anụmanụ ndị ọzọ ejiri ebe a mere ụlọ ha."

Ifeanyi so na ndị nwere chi ọma. Ọtụtụ ndị agbataobi ya bi n'ụlọ ọgbakọ obodo, ndị ọzọ bi n'ogige ụlọọgwụ, maọbụ n'ụlọụka dị icheiche, makana mmiri ekpuchiela ụlọ ha."

Etu ọ dị n'Anambra ka ọ dị na Kogi

Idemmiri na Kogi
Nkọwa foto, Idemmiri na Kogi

NKogi steeti bụkwa ebe ọzọ idemmiri mebiri ihe ọtụtụ ndị Mmadụ na Naịjirịa n'afọ a.

Habeebat Lawal so na ndị ya bụ idemmiri chụpụrụ n'ụlọ ha, onweghị kama otu ihe ọ zọpụtanwuru n'ime ụlọ ya.

Ugbua, o bizi n'otu ụlọakwụkwọ praịmarị ebe ya na ndị ọzọ gbagara ọsọ ndụ.

"Ọ bụrụgodu na idemmiri a talata, anyị enweghị ebe anyị ga-aga. Nri aọ̄ịghị, ego adịghị iji zụta cement maọbụ gbamgbam, maọbụ iji kwabanye n'ụlọ ọzọ," Habeebat kwuru.

Habeebat Lawal
Nkọwa foto, Habeebat Lawa, onye Kogi, bizi n'ụlọakwụkwọ praịmarị

Nsogbu idemmiri abụghị ihe ọhụrụ maka ụfọdụ steeti na Naịjirịa, ọ kachasị ndị dị nso n'osimiri Naịja na Benue.

Mana nke afọ a so na nke kacha njọ na-eme na Naịjirịa kamgba ụwa.

Afọ iri gara aga, na 2012, ka a hụrụ ụdị ọdachi idemmiri a, nke a na-ahụbeghị ụdị ya kamgbe afọ iri anọ. Ihe ruru mmadụ 431 tufuru ndụ ha n'ọdachi ahụ.

Na nke afọ 2022, ihe karịrịmmadụ 600 anwụọlarị, ebe ọnụọgụgụ ruru nde 1.3 ka ya bụ idemmiri chụpụrụ n'ụlọ, dịka ngalaba gọọmentị si kwuo.

Ọtụtụ ụlọ nakwa ala ubi ka ya bụ idemmiri lakwara n'iyi.

Ihe na-akpata ọdachi idemmiri dị ọtụtụ; ha gụnyere enweghị ezigbo ọwa mmiri si apụ, maọbụ ọwa mmiri sụchiri asụchi.

Mịnịsta na-ahụ maka mmuru bụ Suleiman Adamu kwuru na ụdị mmiri ozuzo zoro n'afọ "karịrị nke zoro n'afọ 2012 oge e nwere ụdị ọdachi idemmiri a".

"Na Lokoja, n'afọ 2012, mgbakọ mmiri ozuzo ruru mita 12.84, mana n'afọ a, anyị ka nọ n'ọnwa Ọktoba, mana mgbakọ mmiri ozuzo eruola mita 13.22."

Gịnị kpatara idemmiri a?

Idemmiri na Naịjirịa
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Otu ihe so eme ka ọdachi idemmiri na-aka njọ bụ mgbutui osisi, maka na osisi dị n'ọhịa so n'ihe na-enye aka egbochi idemmiri ma nnukwu mmiri zoo.

N'afọ 2010, Naịjirịa nwere ọhịa ruru hekta nde 10.9. Nke a pụtara na pasentị 12 ala niile dị na Naịjirịa bụ ọhịa. Mana n'afọ 2021, ọhịa ruru hekta 96.500 efuola.

Mana dịka ụmụ Naịjirịa na-ebe akwa maka ọnọdụ akụnụba na-akpụ n'ala, mba Cameroon mepere ọdọmmiri 'Lagdo Dam' iji nye ohere ka mmiri pụlata ma wụbanye n'osimiri Benue.

Naịjirịa kwesịrị ịrụ ọdọmmiri nke ya a kpọrọ 'Dasin Hausa Dam', mana arụchabeghị ya n'agbanyeghị nkwa gọọmentị na-ekwe kamgbe ọtụtụ afọ.

Ọdọmmiri ahụ Naịjirịa kwesịrị ịrụ gaara akarị nke 'Lagdo Dam' ugboro abụọ na ọkara, nwee ike imepụta ọkụ latrik ga-eru watt 300, ma nwekwaa ike ịgba ala ubi ruru hekta 150,000 mmiri n'ime steeti atọ.

Mịnịsta mmiri bụ Suleiman Adamu kwuru na ọ bụ gọọmentị ndị chịrịNaịjirịa n'oge gara aga jụrụ ịrụcha ọdọmmiri ahụ, mana ọ sị na ọbụghị mmiri si na 'Lagdo Dam' kpatara idemmiri nke afọ a.

Ego anyị bitere iji kọọ nri alaala n'iyi - Baranabas

Jiga Barnabas
Nkọwa foto, Jiga Barnabas si na o bitere ego iji kọọ ala ubi ruru hekta 14

Dịka gọọmentị na-ekwu na ha amalitela ikesa ihe enyemaka maka ndị ọdachi idemmiri a dakwasara, Jiga Barnabas, onye ọrụ ugbo na-akọ osikapa kwuru na ya enwetabeghị ihe enyemaka ọbụla.

Barnabas kwuru na ya mefuru ihe karịrị otu nde naịra iji tinye n'ala ubi ya karịrị hekta iri na anọ, na-enwe nchekwube na nri ọ ga-akọpụta ga-ebu nnukwu ibu n'afọ a.

"Mana ugbua, ihe niile efulahụla m," Barnabas kwuru.

"Ọtụtụ n'ime anyị bitere ego ebite iji rụọ ọrụ ugbo nke afọ a. Ihe niile ahụ alaala n'iyi, anyị amakwaghị ihe anyị ga-eme."

Barnabas kwuru na ha-enweghị ike ịrụ ọrụ ugbo n'oge ọkọchị, n'ihi egwu maka mwakpo ndị ọchịehi.

N'oge gara aga, ọ bụrụ na idemmiri talatụ, ndị mmadụ na-alaghachi na be ha, ma chebirikwa idemmiri n'afọ ọzọ.

Mana dịka mgbanwe ihu eligwe na-eme ka mmiri ozuzo na-akawanye njọ kwa afọ na Naịjirịa, ndị bi na mpaghara ebe idemmiri ka enye nsogbu na-enwe olileanya na gọọmentị ga-ebili rụọ ọrụ ha iji chekwaa ndụ ndị mmadụ n'ọdachi idemmiri.