You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Gọvanọ Dave Umahi emeriela ntụliaka imeụlọ APC maka ọkwa omeiwu Ebonyi South
Gọvanọ Ebonyi Steeti bụ Dave Umahi emereila ntụliaka imeụlọ APC emegharịrị nke eji ahọpụta onye ga-anọchite anya patị ahụ na ntụliaka omeiwu Ebonyi South.
Ọ bụ onyeisioche ntuliaka otu APC bụ Emmanuel Adebayo Kehinde kwuru na ọ bụ Umahi meriri n'ime mmadụ ise zọrọ ya bụ ọkwa.
Ọ bụ Austin Chukwu Umahi, Ann Agom-Eze. Ibiam Margret Ezenwaanyị na Chiko Elizabeth Nwataego ka ha na Dave Umahi zọrọ ya bụ ọkwa.
Ezenwaanyị nwetara vootu atọ, Nwakaego nwetara ise, ebe agụpụrụ vootu asaa.
Agom-Eze enwetaghị vootu ọbụla, ebe Umahi nwetara vootu narị abụọ na iri isii nke o ji were merie ya bụ ntuliaka.
APC emereila ntuliaka LGA na nke ọchịchị ime obodo niile nọ n'Ebonyi Steeti
Ngalaba na-ahụ maka ntuliaka nke Ebonyi Steeti bụ Ebonyi State Independent Electoral Commission bụ EBSIEC n'ịchafụ akpọpụtala mpụtara ntuliaka nke ọkpuruọchịchị na nke ọchịchị ime obodo emere na steeti ahụ n'ụbọchị satọde.
Ihe ha depụtara gosiri na ọ bụ otu All Progressive Congress bụ APC n'ịchafụ meriri ọkwa ọchịchị nke okpuruọchịchị niile na steeti ahụ.
Onyeisioche ngalaba a bụ Jossy Eze kwuru na n'ime ọkwa ọchịchị ime obodo nke ruru 171 n'ime okpuruọchịchị 13 e nere n'Ebonyi steeti, na otu APC meriri ha niile.
O kwukwara na otu APC meriri ọkwa ọchịchị nke okpuru ọchịchị iri na atọ enwere n'Ebonyi Steeti.
Aha ụfọdụ ndị a na mpaghara ha meriri bụ : Nwagba Ogbo - Abakaliki LGA, Uche Ibiam - Afikpo North LGA, Nkama Ekwumaka - Afkpo South LGA, Bernard Uburu - Ebonyi LGA, Moses Nomeh - Ezza North LGA, and Nneka Nwali - Ezza South LGA, Sunday Nwankwo - Ikwo LGA, Ogbonnaya Aja - Ivo LGA, Stephen Nwankpa - Izzi LGA, Obinna Onwe - Ishielu LGA, Chinonso Ajah - Ohaozara LGA, Ikechuwu Onwe - Ohaukwu LGA, na Chidiebere Agwu - Onicha LGA.
Eze kwuru na ndị nke nọ n'ọchịchị tupu emee ya bụ ntuliaka ka apụ n'ọchịchị n'ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Ọgụst.
Cheta na ụfọdụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ekweghị iso mee ya bụ ntuliaka dịka ha na-ebo ebubo nrụrụaka.
Etu e siri wakpoo onye ntaakụkọ BBC Igbo na ntuliaka okpuruọchịchị Ebonyi Steeti taa
Awakporo onye ntakụkọ BBC Igbo n'ebe a na-eme ntuliaka okpuruọchịchị Ebonyi na Ward 11 nke dị n'Ndiagu dịka ọ hụtara ndị nnọchiteanya otu ndọrọndọrọ ọchịchị na-eme nrụrụaka.
Onye ntakụkọ a hụrụ ka ha ji aka na-ebinyere onye nke ha ọtụtụ mgbe.
O kwuru na mgbe ha chọpụtara na ha nwuchiri ya ma napụ ya ekwe ntị ya.
Ha jigidere ya ma hụ na ọ wepụrụ foto na ihe onyonyo o jiri sete ndị a na-eme nrụrụaka a.
Onye ntaakụkọ a hụrụ na ọ bụ ndị otu patị APC na-eme ya bụ nrụrụaka.
BBC kpọrọ onyeisi otu patị a n'Ebonyi steeti bụ Stanley Okoroemegha maka ya bụ ihe mere kama dịka akụkọ a na-apụta, ọzaghị ekwe ntị ya maọbụ zaa ozi ezịgara ya n'ọba ozi ekwentị ya
Etu o siri gaa n'ebe ndị ọzọ
Taa ka ngalaba Ebonyi State Independent Electoral Commission (EBSIEC) na-eme ntuliaka ọkpụrụọchịchị na ọchịchi ime obodo nke Ebonyi Steeti.
Dịka o siri dị, ụfọdụ otu patị so ene ụfọdị ndị esoghị na ya bụ ntuliaka.
Ụfọdụ otu ndị so na ya bụ ntụliaka bụ All Progressive Congress (APC), Labour Party, Peoples Democratic Party (PDP) na ndị ọzọ ebe All Progressive Grand Alliance (APGA), Young Peoples Party (YPP) na ndị ọzọ ekweghị iso zọọ ya bụ ọrụ.
Onye ntakụkọ BBC Igbo gara ebe ahụ chọpụtara na n'ọdọ ntụliaka 001.002.003 na 004 nke dị n'Abakiliki na ntuliaka na-aga nke ọma ebe ahụ.
Ndị bịara ntuliaka n'ebe ndị a tụnyere onye ha chọrọ ịtụnye na enweghị nsogbu ọbụla.
N'ụfọdụ ebe ndị mmadụ pụtara nke ọma eme ụfọdụ ebe ndị mmadụ apụtachaghị.
Ndị onye ntaakụkọ BBC Igbo gbara ajụju ọnụ kwuru na obi dị ha mma etu ha bụ ntụliaka siri gaa.
Ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa nke Civil Defence nọ kwa n'ene ndịa iji hụ na ntụliaka a gara nke ọma.