You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu e si emetọ ụmụaka n'aha onyinye ọlaedo n'ebe a na-egwupụta ọlaedo na mba Saụt Afrịka
- Onye dere ya, Mayeni Jones
- Ndị mere akụkọ a, BBC News, Johannesburg
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
Otu ihe na-agbagwoju anya ma na-agba Jonathan anya mmiri bụ ihe ọ hụrụ ka ọ na-arụ ọrụ ma birikwa n'ebe a na-egwupụta ọlaedo dị na Saụt Afrịka bụ etu e si emmetọ ụmụaka.
Ọtụtụ n'ime ha bụ ndị e nyere ọrụ na-akwụ ha obere ego mana ndị ọzọ bụ ndị a kpọbatara maka ọrụ mmekọahụ.
Jonathan dị naanị afọ iri abụọ ugbua, ọ gara mba Saụt Afrịka dịka e kwere ya nkwa ịrụ ọrụ nakwa inweta ego n'ebe a na-egwupụta ọlaedo.
Anyị na-ekpuchi njirimaara ya maka ndị ajọ mmadụ bụ ndị na-ahụ maka ngwupụta ọlaedo ahụ nwereike ịwakpo ya.
Jonathan kọwara etu onọdụ ha si dị, ukpomọkụ, awa ha na-anọ n'irụ ọrụ, etu ha si arụ ọrụ bụ nke metụtara ahụike ya.
"Ana m ahụ ụmụaka dị naanị afọ iri na ise n'ebe a na-egwu ọlaedo. Ọtụtụ n'ime ha dị afọ iri na asaa".
"Ọtụtụ ndị mmadụ na-emetọ ụmụaka. Ọ bụ ihe mgbanwa obi nke m na-anabataghị".
"Ndị okenye na-ekwe ha nkwa ọlaedo tupuu ha edinaa ha n'ike".
"Ọ bụrụ na nwatakịrị chọrọ ego, ọ ga-ekweta ka e dinaa ya n'ike maka nkwa ọlaedo".
"Jonathan kọwara etu ụmụaka ndị a na-esi abịakwuta ndị na-egwu ọlaedo ka e chekwaa ha mana ndị na-egwu ọlaedo ga-agwa ha ihe nke ha chọkwara".
Ọtụtụ ka a na-eji idina n'ike ata ahụhụ maka na ha dara mba ime ihe a sị ha mee.
Jonathan kwuru na ọtụtụ ụmụaka rụrụ ọrụ n'ebe ọ rụrụ ọrụ bụ ndị mbịarambịa na-amaghị ihe na-eme.
Onye na-eme nyocha maka ihe a na-egwupụta n'ala nakwa onye ha-ahụ maka ikike dịịrị ndị na-egwupụta ihe bụ Makhotla Sefuli kwuru na nke a bụ eziokwu.
Ọ sị na ndị adịgboroja ahụ na-egwu ọlaedo bụ ụmụaka ka ha na-achọ ka ha rụọrọ ha ọrụ na Saụt Afrịka.
Ọtụtụ n'ime ụmụaka ndị a bụ ndị a tọọrọ site na mba ndị ọzọ dị Saụt Afrịka nso. Ha na-ekwe ha nkwa inye ha ọrụ dị mma.
"Mana ha bata na Saụt Afrịka, a nara ha akwụkwọ njem ha. Ọ bụ ihe a ma ama na a na-emetọ ụmụnwoke" Sefuli kwuru.
BBC na mmadụ abụọ bụ ndị na-arụ ọrụ n'ebe a na-egwupụta ọlaedo n'ụzọ adịgboroja ekwuola okwu.
Tshepo abụghị ezigbo aha ya, ọ sị na ya hụrụ ụmụnwoke ndị okenye na-amanye ụmụaka aka ndị nwoke ịkwako n'ike.
"N'ọtụtụ oge ka ha na-eme ya maka ego. Ọtụtụ bụ ndị e nyere ọrụ maka naanị imetọ ha".
Ọ kwuru na mmetọ ahụ na-emetụta ụmụaka nke ukwuu.
"Ọ na-eme ha agbanwe agwa ha ma na-enwe ọnọdụ enweghị ntụkwasị obi n'ebe mmadụ nọ".
N'oge ndị uweojii na ndị na-egwu ọlaedo n'ụzọ adịgboroja nwere nsogbu ka ọtụtụ arụ na ihe na-eme n'ọdọ ịgwupụta ọlaedo pụtara ihe.
Ihe a mere n'ebe a na-egwu ọlaedo na Buffelsfontein, dị nso n'obodo Stilfontein dị na mpaghara Ugwu.
Gọọmenti mba ahụ na-agba mbọ ịkwụsị ndị na-egwu ọlaedo n'ụzọ adịgboroja bụ nke ha siri na ọ napụrụ ha ego ruru $3.2bn (£2.6bn) n'efu n'afọ gara aga.
N'ọnwa Disemba 2023 ka gọọmentị ji usoro dị icheiche busoo ndị na-egwu ọlaedo adịgboroja ahụ agha.
Gọọmenti kwụsịrị ime ka mmiri na nri na-aga na mpaghara Stilfontein dịrị obere mana nke ahụ mechara butere ndị na-egwu ọlaedo nnukwu agụụ. Ọtụtụ n'ime ha kpọrọ nkụ ka okporoko nke mwere ụlọikpe jiri gwa gọọmenti ka ha kwụsị amụma igbochi nri na mmịrị ịga na Stilfontein.
Ọtụtụ ndị a zọpụtara n'ebe ahụ bụ ụmụaka. Ọtụtụ n'ime ha bụ ụmụaka na-enweghị akwụkwọ mana gọọmenti mere ha nnyocha ahụike.
Mana ụlọọrụ Department of Social Development (DSD) zọpụtara ụmụaka 31 na Stilfontein na-egwu ọlaedo. Ha niile bụ ndị Mozambik. N'ọnwa Nọvemba ka mba Saụt Afrịka dulara mmadụ 27 gaa Mozambik
Otu a na-akpọ "Save the Children South Africa" nyere aka mee ntụharị n'ajụjụ ọnụ a jụrụ ụmụaka ahụ dịka Onyeisi ụlọọrụ ha bụ Gugu Xaba gwara BBC.
"Naanị na ha chere na ha agaghị apụta n'ọnọdụ ahụ mebiri agwa ụmụaka a"
"Ndị okenye na-egwu ọlaedo na-ebido na-azụ ha ka ha chere na a hụrụ ha n'anya".
Ọ sị na ndi okonye ahụ na-eme ka ụmụaka ahụ kwaso ha iko ma maa ha elu n'ike sita n'ụbọchị ruo n'ụbọchị.
Nwada Xaba kwuru na ndị otu na-egwuputa ọlaedo adịgboroja ahụ na-ewe naanị ụmụntakịrị ọrụ n'ihi na ha na-adị mfe ịchịkwa ma dị ọnụ ala.
"Ụmụaka aghọtaghị mgbe ị na-ekwu: 'M ga-akwụ gị ego dịka 20 rands ($ 1; £ 0.80) kwa ụbọchị.' Ndị okenye na-ajụ mgbe ụfọdụ ịrụ udiri ọrụ ahụ, mana ụmụaka na-ahụ onwe ha n'enweghị ihe na ihe ụkọ ga-ekweta. Ya mere ọ ji dị mfe iji nwatakịrị na-arụ ọrụ ahụ, ọ na-adị mfe ịkpọrọ nwatakịrị na-enweghị ihe ọ maara gaa ebe ahụ.
E wezụga na a na-erigbu ya n'ụzọ ego, ọ na-ekwu na e nwere ndị òtù na-ewe ụmụaka kpọmkwem maka mmekọahụ na ịmetọ ha.
Ọtụtụ ndị na-egwuputa ọlaedo adịgboroja ahụ na-eji ọnwa ole na ole n'okpuru ala bụ ebe ha na-egwupụta ihe, ọ na-esikarị ike ha ịrịgo pụta n'elu ala. A na-enwetere ha ihe ha chọrọ n'okpuru ala.
"Ọtụtụ ụmụaka ka a na-atọrọ atọrọ ma dunye ha n'ọrụ ohu mmekọahụ. E wekwere onye na-eji ha atụmgbere na-anakọta ego n'isi ha oge ọbụla eji nwatakịrị a na-azụ ahịa ịkwa iko."
BBC jụrụ ndị uweojii na ndị DSD ma a ga-ebo onye ọbụla ebubo mmeko nwoke na nwanyị ahụ. Ha azabeghị ajụjụ anyị.
Otu onye na-arụ ọrụ na Stilfontein kwuru na ọtụtụ n'ime ụmụaka ahụ achọghị ịgba akaebe.
Ka ọ dị ugbu a, ụlọ ọrụ na-egwuputa ihe n'ụzọ iwu na-akwadoghị ka na-aga n'ihu.
Maka na nke a bụ atụmatụ nwere ohuru ruru 6,000, ọ bụ azụmahịa na-agaghị akwụsị n'oge ọ bụla n'oge na-adịghị anya, maka na ọtụtụ puku ụmụaka na-adịghị ike n'ihe ize ndụ gbasara udiri ọrụ ahụ.