Etu ụkọ ego na ọnọdụ siri ike si emetụta ndị na-akpa anụmanụ

Aha onyonyo, Ọnọdụ obibi ndụ ọjọọ emetụtala ụmụ anụmanụ anyị
Etu ụkọ ego na ọnọdụ siri ike si emetụta ndị na-akpa anụmanụ
Etu ụkọ ego na ọnọdụ siri ike si emetụta ndị na-akpa anụmanụ
    • Onye dere ya, Kelechi Anozia
    • Ndị mere akụkọ a, Video Journalist

Ndị nwere ụmụ anụmanụ akọwaala etu ọnọdụ obibi ndụ ọjọọ na-akawanye njọ na Naịjirịa si emetụta ha n'oge a.

Ha kwara arịrị gbasara etu ọtụtụ mmadụ si agbahapụ ụmụ anụmanụ ha n'oge a n'ihi ihe isiike na ọnụ ngwaahịa na-arị elu, ọkachasị nri ụmụ anụmanụ.

Na mkparịtaụka BBC na ụfọdụ ndị na-akpa anụmanụ nwere na nso nso a, otu n'ime ndị a gbara ajụjụ kwuru na ọ na-akpachapụ anya gbasara ndị ọ na-ekunye ụmụ nkịta ya n'ihi na ọ gaghị amasị ya ọ bụrụ ma ha gbaa n'ite mmadụ ọbụla.

Otu nwaanyị na-akpa nkịta na-alụbeghị di kwuru na ọ naghị ahụta ihe dị iche n'etiti ya onwe ya ịbụ nne nkịta maọbụ nne mmadụ.

Onye nke ọzọ kwuru na ụmụ anụmanụ ya zọpụtara ndụ ya oge ọ na-agabiga mmụọ ịda mba na oke gbalụgbalụ.

N'okwu ya, nwoke ahụ sịrị "enweghị m ike ịnọ hụ nkịta m ebe agụụ na-agụ ya maọbụ ebe ọ na-ata ahụhụ."

Nwaagbọghọ a gbara ajụjụ kwuru na ya zọpụtara ụmụ nwamba abụọ ihe dịka afọ abụọ gara aga oge a chọrọ iji okwute tụgbuo ha.

"A kpọbatara m ha n'ụlọ m, lekọta ha anya ma kunye ha ndị mmadụ," ka o kwuru.

Ọ gara n'ihu kọwaa na nri nwamba arịala elu n'ebe ọ dị ukwuu nke mere o ji were nlekọta nke onwe ya kpọrọ ihe dị mkpa karịa nke nwamba ya.

Ọtụtụ n'ime ha kwuru na ha anaghịzi azụtanwuru ụmụ anụmanụ ha nri n'ihi oke ọnụahịa ha dị. Ọnọdụ a meziri ka ha na ụmụ anụmanụ ha na-erikọta nri ọnụ.