Anyị azọpụtala nwata ahụ a tọorọ n'Enugwu-Ezike - Ndị Uweojii

Ebe foto si, Screengrab
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti bụ Daniel Ndukwe ekwuola na ha azọpụtala otu nwatakịrị ihe onyonyo gosiri ebe ụmụ nwoke jị egbe ma kpuchie ihu ha bịara tọrọ ya n'ụlọ nne na nna ya.
Ndukwe dere sị, "Ndị ụweojii n'ụbọchị 27 nke ọnwa Maachị site n'enyemaka ndị mmadụ zọpụtara otu nwatakịrị aha ya bụ Kamsiyo dị afọ 10 na mpaghara Nsụka.
O kwuru na ọ bụ n'elekere iri na otu nke abalị ka ha hụrụ ya bụ nwatakịrị ebe ndị omekome a hapụrụ ya maka egwu eyiri ha.
Ndukwe kwuru na ọ bụ n'ụlo nna na nna ya nke dị n'Ukwuinyi Ogrute nke dị n'Enugwu-Ezike, nke okpuruọchichị Igbo-Eze North n'ụbọchị 26 nke ọnwa maachị afọ 2023 n'ihe dịka elekere anọ nke mgbede.
Dịka o si dị Ugbua, ndị uweojii ekwuola na ya bụ nwata alọghachịla n'aka nne na nna ya.

Ebe foto si, screengrab
N'otu aka ahụ ka kọmịshọna ndị uweojii bụ Ahmed Ammani na-ekwu ka e bido nyocha na-atifughị oge ma jide ndị kpara ya bụ arụ.
Amani kwuru na ịtọrọ nwatakịrị jogburu udele ma sigbuo nkapị, ma sị na ha agaghị e ji nyocha a egwu egwu.
Cheta na ndị mmadụ malitere ikwu maka ntọrọ nwata a mgbe ihe onyonyo ya fesara na soshal midia n'ụbọchị ole na ole gara aga.
Ndị mmadụ na-arụ aka na ọ bụ ndị ọrụ nchekwa 'vigilantee' bịara nwuchie nwata a n'ihu nne na nna ya.
Ndị uweojii ekwughi ma ọ bụ ndị 'vigilantee' nwuchiri nwata kama ha sị na ọ bụ ndị ntọrị.









