Etu ịta chịngọm, iji akpa wakịrị wakịrị ga-esi tinye gị na nsogbu n'ụfọdụ mba

Ebe foto si, Getty Images
Dịka a tụrụ nwafọ Naịjriịa bụ Dinchi Lar nga otu afọ na Dubai maka isete foto ime ụlọọrụ ọdụ ụgbọelu mba United Arab Emirates (UAE) ma zIpụta ya na soshal midia, okwu a atụọla ọtụtụ n’anya dịka ndị mmadụ na-ekwu na ha amaghị na ime ihe dị etu a megidere iwu mba ahụ.
Ụlọọrụ na-ahụ maka ụmụafọ Naịjirịa bi na mba ndị ọzọ bụ Nigerians in Diaspora Commission, zipụtara ozi kọwa na a tụrụ nwaada Lar nga maka ọ dara iwu mba ahụ na-ahụ maka nkesa ozi na ịntanetị bụ “ UAE cybercrime law.”
Akwụkwọ ozi a kwuru “Isete foto maọbụ ihe onyonye mmadụ nke onye ahụ amaghị na ị na-eme ma zipụta ya na soshal midia dara iwu ‘UAE Cybercrime law’ bụ nke ga-eritere mmadụ otu afọ n’ụlọ nga maọbụ ịda nga ego ya ruru $137,000 maọbụkwanụ ma ịga nga nakwa ịkwụkọ ụgwọ ịda nga ahụ ọnụ”.
Ka ozi a pụtara, ọtụtụ ndị mmadụ na-ajụzị kedụ ihe ndị ọzọ mmadụ nwereike ime na njem nke a ga-eme ka anwụchịe maọbụ tụọ onye ahụ nga na mba dị iche iche.
Marakwa na ọ dị mpa ime nnyocha ma chọpụta ihe ndị megidere iwu mba ọbụla ị chọrọ ị gaa mee njem n’ime ya site na intanetị maọbụ ọba ozi ụlọọrụ nnọchiteanya mba ị chọrọ ịga.

Ebe foto si, Getty Images
Lee ụfọdụ ihe ndị ị leliri anya nwereike imegide iwu n’akụkụ ụwa dị iche iche

Iji okwu rere ure kpọọ iyi n’ọha:
E nwere ọtụtụ okwu ọha na-anaghị anabata dịka okwu metụtara aramara, ịkpọ oke agbụrụ nakwa ndị ọzọ. Onye ọbụla e jidere na-ekwupụta okwu ndị a n’ihu ọha ga-akwụ ụgwọ ịda ngha ruru $130,000 na mba United Arab Emirates. Agwa a megidere iwu na Mexico.

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ita Chịn gọọm n’ọha:
Iwu ụfọdụ mba dịka mba Singapore megidere mmadụ ịta chịn gọọm n’ọha kemgbe afọ 1992. N’afọ 2004, e nyere ndị ji chịn gọọm agwọ ọrịa eze ishi maọbụ ọrịa ndị ọzọ ohere pụrụiche ita chịn gọọm mana ha ga-egosiriri akwụkwọ ikike dọkịnta nyere ha.
Iji akpa ‘Nylon’:
Na ọtụtụ mba iji akpa wakịrị wakịrị ‘nylon’ tinye ibu megidere iwu dịka ha kwetere na akpa a na-emetọ ihu ọha. Mba ndị ebe ihe a megidere iwu gụnyere mba Rwanda, Kenya , Zimbabwe, China, India nakwa mba ndị ọzọ.
Ịgwọ ọgwụ:
Atụmatụ ịgwọ ọgwụ ọbụla, iri amụsụ nakwa ihe ndị yiri ya bụ ihe nwereike ime ka a tụọ mmadụ nga ruo otu afọ na mba Ireland. Iwu mba Kenya nke akụkụ iwu 319 megidere ịgba afa. Iwu mba Kenya megidekwara ịji ọgwụ merụọ mmadụ ahụ maọbụ mmekpa mmadụ ahụ dịka e nwereike ịtụ onye megidere iwu nga ruo afọ 10. Iwu mba Naịjirịa nke 210 megidekwara ịgwọ ọgwụ maọbụ maọbụ mkwupụta na mmadụ na-agwọ nsi dịka e nwereike ịtụ onye ahụ nga ruo afọ abụọ. Akụkụ 213 iwu a megidekwara mmadụ ire ihe e ji agwọ nsị eji eme mpụ.

Ịnụ mmanya na-aba n'anya n'ihu ọha:
Ọtụtụ akụkụ ụwa anaghị anabata ka ndị mmadụ ṅụọ mmanya na-aba n'anya n'ihu ọha nke gụnyere mba Mexico. Mana ọtụtụ mba ebe iwu a kacha kpụrụ ọkụ n'ọnụ bụ mba ebe ụka alakụba bụ okpukperechi ndị mmadụ kacha eso. Iwu ụka alakụba megidere ndị mmadụ ịṅụ mmanya na-aba n'anya, ya mere imee njem gaa mba ndị dịka mba Saudi Arabia, Somalia, Sudan, Yemen, Libya na ndị ọzọ
Ime mgbasaozi ụka:
Ụfọdụ mba nabatara okpukperechi dị icheiche mana ihe ha anaghị anabata bụ atụmatụ mgbasaozi ụka n’ihu ọha ọbụla. Mba ebe ụdịrị ihe a na-eme bụ mba United Arab Emirates ọkachasị n’akụkụ Dubai. Mba ndị ọzọ ebe mgbasaozi ụka megidere iwu gụnyekwara Jamaica, Bolivia, Russia nakwa China.
Isete foto maọbụ onyonyo:
Iwu ụfọdụ mba megidere ndị mmadụ isete foto maọbụ ihe onyonyo n'akụkụ mba ha dị iche iche. Nke gụnyere mba ebe okpukperechi ndị mmadụ megidere ya maọbụ ebe e nwere ihe zoro ezo ha achọghị mmepụta ya n'ihu ọha. Mba ebe ihe dị etu a na-eme gụnyere: Algeria, South Korea, The Sistine Chapel, Vatican City, Red Light District, Amsterdam, United Arab Emirates, Japan, Valley of the Kings, Luxor, Egypt, Mumbai, India na ebe ndị ọzọ. Na mba France, isete foto ndị uweojii maọbụ ụgbọala megidere iwu maọbụladị isete foto ihe ọzọ ma gosipụta onye uweojii n'ime foto gị nwa ntịị.
Otu ihe dị mkpa n'ime njem bụ mmadụ ịgba mbọ tinye anya n'ala ma chọpụta iwu nakwa omenala mba maọbụ obodo onye ahụ zubere ime njem iji gbalahụ nsogbu nakwa ida iwu.









