Lee uru okwụrụ bara n'ahụike mmadụ

Okra bụ akwụkwọ nri a na-eri na mbaụwa gba gburugburu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Okra bụ akwụkwọ nri a na-eri na mbaụwa gba gburugburu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Okra bụ osisi nwere oke ọnụ na mpaghara ọdịda anyanwụ kọntinent Afrịka. A na-eji ya esi nri, bakwa iji ya gwụọ ọrịa. N'isiokwu a, anyị na-ele anya na uru ahụike nke okra bụ akwụkwọ nri dị oke ọnụ ahịa n'Afrịka.

Ọ bụrụ na ị gaa n'ahịa n'ọdịda anyanwụ Afrịka, o doro anya na ị ga-ahụ ndị na-ere okra n'ọdọ ahịa ha. Ọ bụ ezie na ọ bụ n'Afịka ka o si, okra, nke aha sayensị ya bụ Abelmoschus esculentus, na-eto na mbaụwa niile.

Nke bụ eziokwu bụ na e ji okra esi efere nri dị icheiche n'Afrịka, India bụ ndị kasị emepụta ya n'ụwa. H na-emepụta ihe ruru 6,126,000 ton kwa afọ.

Na-esote ya bụ Naịjirịa nke na-emepụta 2,033,129 tọn kwa afọ. Sudan so na mba na-emepụta okra kasị ukwuu kwa afọ. nke ha 304,712 tọn.

Akụkọ ndị ọzọ gbasara nri

Gịnị bụ okra?

E nwere ụdịrịr okra dị icheiche

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E nwere ụdịrịr okra dị icheiche

Ọkachamara n'ihe banyere nri na onyeisi otu NutriMali bụ Mamadou Seydou Bah kwuru na "Okra bara ụba na vitamin na mineral. Anyị nwere ike ịhụ vitaminotu B, karịsịa vitamin B2, B3, B6, B9 nakwa vitamin C. Ọ bụ osisi nke nwere vitamin K.

Okra juputara na antioxidants dị ka vitamin C, polyphenols, polysaccharides, na mineral dị ka nnyocha Yuan et al mere n'afọ 2018 siri kwu.

Antioxidants, "na-alụ ọgụ megide ihe a na-akpọ oxidation nke mkpụrụ ndụ n'ime ahụ mmadụ, nke free radicals kpatara," Bah na-ekwu.

Dị ka ọkachamara n'ihe banyere nri na Ivory Coast bụ Marion Ezzedine si kwuo, nnukwu vitamin C dị n'okra na-eme ka ọ bụrụ nri na-enyere ahụ mmadụ aka buo agaha megide ọrịa, sie ike ma na-enye aka ịlụso ịka nká cellular ọgụ.

Ọ bụrụ na ị na-achọ ịhapụ ibu, ị nwere ike iji okra mee nke a. N'ezie, obere abụba ya na-eme ka calorie ya dị ntakịrị.

Okra na-arụkwa ọrụ dị mkpa n'usoro mgbari nri n;ime ahụ mmadụ.

Enwere ike iri okra na ndụ maọbụ kpọọ ya n'anwụ

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Enwere ike iri okra na ndụ maọbụ kpọọ ya n'anwụ

"Ya mere, ọ bụ nri na-enyere aka ịhazi ihe na-agafe n'eriri afọ na ọkwa ọbara cholesterol ọbara," Ezzedine na-ekpughe.

Ihe oriri erimeri a na-ebelata nnabata nke carbohydrates na abụba.

Dị ka Dọkịta. Mamadou Seydou Bah si kwuo, okra bụ osisi bara ụba na manganese na magnesium.

Bah kwuru na "Manganese bara uru dị mkpa n'ịmepụta ọkpụkpụ, nakwa na protein metabolism. Ọ na-ekerekwa òkè na ịrụ ọrụ nke usoro ụjọ ahụ".

E wezụga uru nri ya, a na-ejikwa okra emepụta ọgwụ ọdịnala.

Mamadou Seydou Bah kwuru, "A na-eji okra eme ihe n'ọtụtụ ebe, ọkachasị maka ọgwụgwọ nodules na ọgwụ ọdịnala.

Kedu etu esi erite uru dị n'okra?

Miyan Kwan Kwan na Miyan Guzya bụ nrị mba Ghana e ji okra e si.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Miyan Kwan Kwan na Miyan Guzya bụ nrị mba Ghana e ji okra e si.
Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Dịka osisi dị oké ọnụ ahịa na'Afrịka, a na-eji okra esi ọtụtụ efere dị icheiche n'Afrịka.

Dabere n'ụdị efere nri ọ bụ, enwere ike iri okra e siri esi, maọdụ nke a na-esighi esi e ji eme salads, nke akpọrọ n'anwụ maọbụ ọbụna jiri ya sie ofe.

Na mba Senegal, a na-eji ya esi nri soupou kandja, ebe na mba Ivory Coast, a na-eji ya akwadebe ihendori gumbo. Enwere ọtụtụ ụdị gumbo dabere na obodo. Ndị mba Cameroon na Benin nwere ụdịrị gumbo nke ha.

Na mba Republik nke Guinea, okra bụ otu n'ime ihe eji akwadebe nri foutti, efere nri e ji akwụkwọ sọrel na okra esi.

Dịka Dọkịta Ezzedine si kwuo, "okra ga-enwe ike ịgbari ma ọ bụrụ na esi ya mana ihe ndị na-edozi ahụ n'okra na--bụ nke na-aka mma ma ọ bụrụ na esighi ya esi (karịsịa vitamin C nke na-enwe mmetụta okpomọkụ)."

Onye na-ahụ maka nri na-edozi ahụ Mamadou Seydou Bah na-adụ ọdụ ka ị ghara isi okra nke ukwuu iji zere mmebi ụfọdụ vitamin dị na ya. Ọ na-adụ ọdụ ka ị ghara ịhapụ okra na anyanwụ nke ukwuu maka ndị na-ahọrọ ya ma ọ bụrụ na ọ kpọ nkọ.

"Okra nwere udidi gelatinous nke enwere ike iji mee ka nri lọọalọ. Iji belata akụkụ gelatinous, rie ya na ndụ ma ọ bụ nke e siri ntakịrị," ka Oriakụ Ezzedine, ọkachamara n'ihe banyere nri na-aga n'ihu kọwaa.