Nnamdi Kanu: O nwereike irite mgbaghara Onyeisiala?

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu na Onyeisi IPOB bụ Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Bayo Onanuga / X na BBC

Nkọwa foto, Bola Tinubu na Nnamdi Kanu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Mgbaghara Onyeisiala Naịjirịa nyere mmadụ ruru otu narị iri asaa bụ okwu a kpụ n'ọnụ ugbua nke mere ndị mmadụ ji ekwu na Maazị Nnamdi Kanu kwesịrị ka a tọghapụ ya maọbụ nye ya mgbaghara onyeisiala.

Cheta na Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (IPOB) nke Gọọmenti Naịjirịa machiri dịka otu na-eyi ọha egwu.

Kanu nọ n'ụlọikpe ugbua maka ebubo dị icheiche Gọọmenti Etiti boro ya.

N'akụkọ a, BBC Igbo gbara ndị Ọkaiwu ajụjụ ọnụ banyere ihe iwu Naịjirịa kwuru maka inye mmadụ mgbaghara Onyeisiala nakwa etu o si metụta ikpe Nnamdi Kanu.

Nnamdi Kanu bụ

Akụkọ ndị gbasara Nnamdi Kanụ

Gịnị bụ mgbaghara Onyeisiala?

Mgbaaghara onyeisiala na-enye bụ nke Bekee kpọrọ "Presidential Pardon" bụ ikike onyeisiala nwere ịgbaghara onye ọbụla ụlọikpe mara ikpe.

Ọkaiwu Abuchi Ogbachulu kọwara na Ngalaba 175 (3) nke iwu Naịjirịa afọ 1999 nyere Onyeisiala ikike ịgbaghara ndị ụlọikpe mara ikpe site na ndụmọdụ "otu kansụl ọchịchị" nyere ya.

Mgbaghara ahụ pụtara na onye ahụ ikpe mara bụzi onye ọhụrụ na-enweghị ụta maọbụ ntaramaahụhụ dịịrị ya maka na onyeisiala agbagharaala ya.

Ogbachulu kọwara na ebumnobi mgbaghara ahụ bụ ime ebere, ịdịnootu obodo, na imegharị mmegide e mere mmadụ.

Olee ndị bụ 'otu kansụl ọchịchị '?

Onye Ọkaiwu ọzọ bụ Ọkaiwu Madukaji Onyekachi kọwara na 'otu kansụl ọchịchị' bụ otu jikọrọ ndị nọ n'ọchịchị nakwa ndị nọbu n'ọkwa ahụ oge gara aga mana Onyeisiala nọ n'ọchịchị bụ onyeisi ya.

Ọ sị na ndị nọ na "otu kansụl ọchịchị' gụnyere ndị bụbu onyeisiala, gọvanọ na osote ha, ndị nọbu n'ọkwa ahụ dịka Onyeisi sịnetị, onyeisi ụlọomeiwu nta, ndị nọbu n'ọkwa dịka Ọkaikpe Ukwu, ndị minista steeti nakwa ndị nọ n'ọkwa ahụ ugbua dgz.

Ọ gara n'ihu kọwaa na ọrụ ndị ahụ gụnyere inye Onyeisiala ndụmọdụ n'ọtụtụ ihe dị oke mkpa nke gunyere ihe gbasara inye mgbaghara nke onyeisiala na-enye ndị ikpe mara dgz.

Mkparịtaụka Nnamdi Kanu na BBC Igbo

Etu Nnamdi Kanu nwereike isi nweta ntọhapụ

Ọkaiwu Madukaji Onyekachi kọwara mgbaghara dịka "ihe a na-enye mgbe mmadụ dara iwu".

Ọ gara n'ihu kwuo na "Onyeisiala maọbụ gọvanọ nwere ikike inye mmadụ mgbaghara dịka onye Ọkaikpe Ukwu nke steeti na Gọọmenti Etiti nwekwara ikike ịkwụsị ikpe a na-ekpe mmadụ n'ụlọikpe mgbe ọbụla".

"Ụlọikpe amabeghị Nnamdi Kanu bụ onye a na-ekpe ikpe kamgbe afọ ole na ole gara aga ikpe, nke mmadụ ga-eji sị ka Onyeisiala nye ya mgbaghara".

"Mana site n'ikike Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa nwere, o nwere ike ịkwụsị ikpe a na-ekpe Nnamdi Kanu mgbe ọbụla".

"Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu nwereike ịgwa Ọkaikpe Ukwu Naịjirịa ka ọ kwụsị ikpe Nnamdi Kanu".

"Naanị ihe dị iche bụ na ụlọikpe amaghị ya ikpe tupu enye ya mgbaghara".

"Ọ dị n'aka onyeisiala Naịjirịa ijiri ohere a nye Nnamdi Kanu mgbaghara".

Usoro Onyeisiala si enye mgbaghara

Ọkaiwu Abuchi Ogbachalu kwuru na ngalaba 175 (1) nke iwu Naịjirịa nyere Onyeisiala ikike mgbaghara maọbụ iwedata ntaramaahụhụ dịịrị ndị dara iwu ụlọomeiwu mepụtara maọbụ ndị ụlọikpe ndịagha mara ikpe.

Ogbachalu gara n'ihu kwuo na Onyeisiala kwesiri ime nke a site na ndụmọdụ 'otu kansụl ọchịchị', ọkachasị mgbe ọ na-achọ inye onye dara iwu metụtara ndịagha mgbaghara.