Onyeisiala Tinubu agwala ndị isi ọrụ nchekwa ihe a na-atụanya n'aka ha ugbua

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Ahmed Tinubu

Ebe foto si, Bayo Onanuga / X

Nkọwa foto, Bola Ahmed Tinubu
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu agwala ndị isi ọrụ nchekwa na ya chọrọ ka ndị mmadụ na-ahụta akaọrụ ha n'ihe ha na-eme banyere ọnọdụ nchekwa.

Tinubu kwuru na ya achọghị ka ọ bụrụ mgbe ọbụla ha achọ ihe ha ga-ata ụta maọbụ bekwashịaka sị na ọ bụ ya gbochiri ha ime nke ọma.

O kwuru nke a mgbe o nyechere ha ọkwa ha dịka ndị ụlọomeiwu Sineti kwadochara ha.

N'okwu ya "dịka onyeisi ndịagha, enyela m unu ọrụ nke ndị Sineti kwadoro. A chọrọ m ka unu rụọ ọrụ a n'ụzọ kasị mma e ji arụ ya".

"E nwepụ nchekwa obodo mara na ihe ndị ọzọ agaghị enweisi. Ụmụamaala anyị na obodo anyị ga-enwe ezi nchekwa nke ga-enyereaka ka ha rite erere si na gọọmenti".

"Jiri akọnuche nakwa obi unu niile na nkanuụzụ dị mkpa buso agha megide ihe na-echere ọnọdụ nchekwa obodo anyị akamgba".

"Anyị agaghị ekwe ka ọgbaaghara bidoro kamgbe afọ 2009 na-aga n'ihu ọzọ".

Tinubu kwukwara na agbanyeghị na ndịagha meriri ndị na-eyi ọha egwu, chụpụ ha na mpaghara dị icheiche mana ọrụ ka dịkwa.

Anyị ga-eme ka ndị na-eyi ọha egwu banye n'ọsọ ụkwụ elu ala – CAS Aneke

Sunday Kelvin Aneke bụ onyeisi ndịagha ụgbọelu na Naịjirịa

Ebe foto si, NigeriaArmyInfo/x

Nkọwa foto, Sunday Kelvin Aneke

Sunday Kelvin Aneke bụ onyeisi ndịagha ụgbọelu na Naịjirịa ekwela nkwa na ha ga-ebuso ndị na-eyi ọha egwu agha ruo na ha abanye n'ọsọ ụkwụ elu ala.

Aneke mere ka a mata nke a dịka ụlọomeiwu Sineti mechara ya nnyocha ma kwado ya n'Ọktoba 29, 2025.

Aneke kwuru na etu ya si arụ ọrụ ya gbadoro ụkwụ na nkuzi, nkanụzụ, nchekwa nakwa iwepụta usoro ọhụrụ ga-aba uru.

O kwuru na "onye na-agba ọsọ agaghị enwe ohere ịkpa ajọ nkata megide onye ọ na-agbara ọsọ".

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụghị naanị n'ịkwa mgbọ ka e ji amara ike ndịagha mana ọ bụ site n'akọnuche na ịkwụrụ chịmchịm megide ihe ọbụla bịara n'ụzọ gị".

Ụlọomeiwu Sineti akwadoola ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa ọhụrụ

Oge ndị isi ọrụ nchekwa gara na Sịneti ka e mee ha nnyocha.

Ebe foto si, NigeriaArmyInfo/x

Ụlọomeiwu Sịnetị Naịjirịa anabatala ma kwado ndị isi ọrụ nchekwa Naịjirịa ha mere nnyocha ma gbaa ajụjụ ọnụ.

N'ime ndị ahụ gunyere Olufemi Oluyede ga-arụ ọrụ dịka Onysisi ọrụ nche, Wahidi Shaibu dịka onyeisi ndịagha, Idi Abbas dịka onyeisi agha mmiri, nakwa Kennedy Aneke dịka onyeisi agha n'ikuku.

Mana tupu ndị ụlọomeiwu anabata ndị ahụ niile ha ji ihe ruru awa abụọ gbaa ha ajụjụ ọnụ.

A jụkwara ha kedụ ihe ha ga-eme n'oche ma ọ bụrụ na a nabata ha ịrụ ọrụ dịka ndị isi nchekwa.

Cheta na Onyeisiala Bola Tinubu bụ onye degara ụlọomeiwu akwụkwọ ka e mee ndị niile o wepụtara ka ndị isi ọrụ nchekwa nnyocha.

Ndị ụlọomeiwu Sineti amalitela inyocha ndịisi ọrụ nchekwa Naịjirịa ọhụrụ

Ndịisi ọrụ nchekwa Naịjirịa ọhụrụ na Onyeisiala Bola Tinubu mgbe ha na Onyeisiala Tinubu nwere nzukọ n'obi ọchịchị Aso Rock Villa.

Ebe foto si, Bayo Onanuga/Facebook

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

Ndị ụlọomeiwu Sinetị amalitela inyocha ndịisi ọrụ nchekwa Naịjirịa ọhụrụ nke Onyeisiala Bola Tinubu họpụtara.

Akụkọ ụlọmgbasa ozi mpaghara wepụtara na-ekwu na ndịisi ọrụ nchekwa Naịjirịa bịara n'ụlọ ọgbakọ ndị omeiwu Naịjirịa mgbe ọ kụrụ elekere iri nke ụtụtụ n'ụbọchị Wenezde 29 Ọktoba 2025 dịka ndịisi ndịagha ndị ọzọ so ha were bịa.

Cheta na ndị omeiwu Sinetị wepụtara ozi banyere ime nnyocha ahụ n'ụbọchị Tuzde 28 Ọktoba 2025, ma tinye ya bụ nnyocha n'ụbọchị taa bụ Wenezde, Ọktoba 29, ka ha gbanwere mkpebi ha mere ime nnoycha ahụ n'izu na-abịa.

Nkwuputa a bịara obere oge ka Onyeisioche Sineti bụ Godwill Akpabio, gụchara akwụkwọ ozi sitere n'aka Onyeisiala Tinubu, na-achọ nkwenye maka nhọpụta Onyeisi ndịagha nchekwa bụ Ọchịagha Olufemi Oluyede.

Akpabio kwuru na mgbanwe ahụ dị mkpa iji mee ka ndịisi agha nweeike ịrụ ọrụ ha ozugbo.

Chetakwa na Onyeisiala Tinubu gwara ndị Sineti ka ha tụlee usoro nkwenye ahụ ngwa ngwa iji hụ na nhazi nchekwa mba Naịjirịa na-aga n'ihu ma na-arụ ọrụ nke ọma.

Onyeisiala Tinubu achụọla ụfọdụ ndịisi agha na Naịjirịa ma gbanwee ụfọdụ

Onyeisiala Tinubu agbanweela ndị isi nchekwa Naịjirịa

Ebe foto si, Bayo Onanuga/X, Screenshot

Onyeisiala Bola Tinubu achụọla ma gbanwee ndịisi ndịagha ngalaba dị iche iche na Naịjirịa.

Nke a dị n'ozi onye ndụmọdụ pụrụiche nke onyeisiala gbasara mgbasaozi na nzirịtaozi ọhanaeze bụ Sunday Dare wepụtara n'ụbọchị Fraịde 24 Ọktoba 2025.

Dịka Dare siri kwuo, ọnọdụ a bụ n'ihi mbọ Gọọmenti Etiti Naịjirịa na-agba iji mee ka ọnọdụ nchekwa sikwuo ike.

Ozi ahụ kwuru na Tinubu họpụtara Ọchịagha Olufemi Oluyede ka ọ nọchịe anya Ọchịagha Christopher Musa dịka Onyeisi ndị nchekwa Naịjirịa.

Onye a họpụtara dịka Onyeisi ndịagha ọhụrụ bụ Ọchịagha W. Shaibu, ebe Air Vice Marshall S.K. Aneke bụ onye a họpụtara dịka Onyeisi ndịagha ụgbọelu ọhụrụ.

Real Admiral I. Abbas ka ọ họpụtara dịka Onyeisi ndịagha mmiri ọhụrụ, ebe Chief of Defence Intelligence bụ Major-General E.A.P Undiendeye ga-aga n'ihu n'ọkwa ya.

Onyeisiala kelere ndị isi nchekwa na-apụ apụ maka iji obi ha gaara Naịjirịa ozi, ma gwa ndị nke a họpụtara ọhụrụ ka ha ghara ime ka ntụkwasịobi e nwere n'ebe ha nọ bụrụ ihe efu.

Ozi ahụ gbakwunyere na mmadụ niile a họpụtara ọhụrụ ga-amalite ọrụ ozugbo.

Nke a na-abịa n'ime otu izuụka kepukpeu kwuru na ụfọdụ ndịaha Naịjirịa na-akpa nkata iwere ọchịchị n'ike, dịka a nwuchiri ndịagha mmadụ iri na isii a sị na aka ha dị n'ịkpa nkata ahụ.

Mana Ọchịagha Christopher Musa bụbu Onyeisi ndị ọrụ nchekwa na Naịjirịa so ndị a chụpụrụ ugbua kwuru na akụkọ ahụ bụ asị ọcha.

Ọ gara n'ihu kwuo na ihe mere e jiri nwuchie ụfọdụ ndịagha ahụ bụ maka nnupuisi ha mere n'ebe dị iche iche ha na-arụ ọrụ ma kwuo na a na-eme ha nnyocha.

O dobeghi anya ma ọ bụ n'ihi nke a mere ka Onyeisiala Tinubu gbanwee ndịisi ndịagha ndị a.

Onye bụ Ọchịagha Oluyede a họpụtara dịka Onyeisi ndị nchekwa Naịjirịa ọhụrụ?

Onye bụ Ọchịagha Oluyede a họpụtara dịka Onyeisi ndị nchekwa Naịjirịa ọhụrụ?

Ebe foto si, Screenshot

  • A mụrụ Ọchịagha Olufemi Oluyede n'afọ 1968 n'Ikere dị n'Ekiti steeti. Ọ dị afọ iri ise na asaa.
  • N'afọ 1987, Olufemi banyere n'ụlọ ọzụzụ ndịagha Naịjirịa bụ Nigeria Defence Academy dịka cadet.
  • A nabatara ya dịka second leutenant n'afọ 1992 oge ọ natachara ọzụzụ ndịagha Naịjirịa.
  • O ruru n'ogogo Major-General n'ọnwa Septemba, 2020.
  • Oluyede jidere ọkwa dị iche iche kemgbe a nabatara ya dịka onyeagha, ndị gụnyere; Platoon Commander and adjutant nke 65 Battalion, Company Commander nke 177 Guards Battalion, Staff Officer nke Guards Brigade nakwa Commandant nke Amphibious Training School.
  • O sonyere n'ọtụtụ ọrụ ndịagha gụnyere; ọrụ otu Economic Community of West African States Monitoring Group (ECOMOG) gara na mba Laịberia, ọrụ Operation HARMONY IV na mpaghara Bakassi, tinyere ọrụ Operation HADIN KAI na mpaghara North East, bụ ebe ọ bụụrụ Ọchịagha 27 Task Force Brigade.
  • Ọ gara ozi dịka 56th Commander nke otu Elite Infantry Corps, nke ụlọọrụ ndịagha Naịjirịa dị na Jaji na Kadụna steeti.
  • N'ọnwa Disemba 2024 ka a họpụtara ya dịka Onyeisi ndịagha ọhụrụ, n'ihi ọnwụ Ọchịagha Taoreed Abiodun Lagbaja.
  • N'ụbọchị Fraịde 24 Ọktoba 2025, Onyeisiala Bola Tinubu họpụtara Ọchịagha Olufemi Oluyede dịka Onyeisi ndị nchekwa Naịjirịa.