Maka ogbunigwe ndịagha tụrụ na Sokoto: Kashim Shettima agwala ezinaụlọ e gburu ndị nke ha 'ndo'

Ebe foto si, @officialSKSM/X
Osote onyeisiala Naịjirịa bụ Kashim Shettima arịọla mgbaghara n'aka ezinaụlọ e gburu ndị ha n'ime obodo abụọ dị n'Okpuru ọchịchị Silame na Sokoto steeti.
Ọ bụ n'ụbọchị Wenezde 25 Disemba 2024 ka ndịagha Naịjirịa gburu mmadụ iri na-amaghị ama oge ha tụrụ ogbunigwe iji kpochapụ ndị otu Lakurawa na-eyi ndụ egwu.
Dịka ọ gasịrị mkpụrụ ụbọchị atọ ya bụ njinji jiri, osote onyeisiala Naịjirịa bụ Shettima zigaara ezinaụlọ mmadụ ndị ahụ ndịagha gburu na-amaghị ama ozi nkasiobi.
O kwuru na ọ bụ ihe na-agbawa obi na ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha ga-eji ọbara ha kwụọ ụgwọ mmehie ndị oyi ndụ egwu oge a na-achọ ikpochapụ ha.
N'ozi si n'aka onye enyemaka mgbasaozi ya bụ Stanley Nkwocha, osote onyeisiala kpọrọ oku ka a ghọta ma kwadoo ndịagha n'ihi na ọ bụ ha na-akwụ ụgwọ kachasị iji chekwaa ndụ ndị ahụ e gburu na-amaghị ama.
O gosiri mwute n'ihi ọnọdụ ahụ ma kpọọ oku ka a gaa n'ihu na-akwado ndịagha Naịjirịa.
Gọọmenti Naịjirịa ga-enyocha ogbunigwe ndịagha tụrụ na Sokoto – Mịnịsta nchekwa

Ebe foto si, Bello Matawalle/X, BBC
Gọọmenti Etiti Naịjirịa ga-eme nnyocha miri emi gbasara ogbunigwe ndịagha tụrụ na-amaghị ama n'ụbọchị Wenezde 25 Disemba 2025, bụ nke gburu mmadụ iri (10) n'obodo Gidan Bisa nakwa Runtuwa dị n'Okpuru ọchịchị Silame na Sokoto steeti.
Ọ bụ odeakwụkwọ mgbasaozi aka na-achị Sokoto steeti bụ Ahmed Aliyu kpuhere nke a n'ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraịde 27 Disemba 2024.
Ọ sịrị na obere Mịnịsta na-ahụ maka nchekwa na Naịjirịa bụ Bello Matawalle rụtụrụ aka n'okwu ahụ oge ọ gara njem nkasiobi na nke Gọvanọ Sokoto steeti.
Ọ kọwara ihe mere n'obodo abụọ ahụ dịka nke na-agbawa obi ma kwuo na a ga-eme ezigbo nnyocha iji chọpụta ihe merenụ.
O gosikwara olileanya na a ga-enweta ikpe nkwụmọotọ n'okwu ahụ.
"Anyị amaghị ụma tụọ ogbunigwe ahụ gburu mmadụ iri na Sokoto Steeti" - Ndịagha Naịjirịa

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Isiụlọọrụ ngalaba nchekwa Naịjirịa ekwuola na ọ bụ ogbunigwe gbakwụnyere nke ha tụrụ ndị oyi ndụ egwu gburu ndị nkịtị mmadụ iri na Sokoto Steeti na ha amaghị ụma tụọ ndị a ogbunigwe.
Ọnụ na-ekwuru ngalaba a bụ Ọchịagha Edward Buba kwuru nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị Fraịde 27 Disemba, 2024.
Nke a na-abịa dịka mmadụ iri si n'obodo dị na Sokoto Steetị nwụchara ebe mmadụ isi merụrụ ahụ site n'ogbunigwe ahụ gbara.
Dịka Buba si kọwaa, o kwuru na ndị ọrụ nchekwa gbakọtara aka ọnụ ma tụọ ogbunigwe n'ogige ebe otu Lakurawa na-eyi ndụ egwu zoro n'ọhịa dị n'okpuruọchịchị Silame nke steeti ahụ.
"Ya mere mgbe ogbunigwe ahụ dara, nke mgbakwụnye na-eso ihe na-efe n'elu na-eso ya bụ nke butere ọnwụ mmadụ iri a na-ekwu maka ya. Ọ bụghị ogbunigwe ahụ tụgburu mmadụ iri ahụ kpọmkwam."
"Ndị ogbunigwe ahụ tụrụ kpọmkwem bụ ndị otu Lakurawa na-eyi ndụ egwu, ha repịara n'ọkụ si na ya," Ka Buba kwuru.
Buba gara n'ihu kwuo na ogbunigwe ndịagha tụrụ mezuru ebumnobi e jiri zube ya bụ ikposasị ma mebie ngwagha ndị otu a ji alụ ọgụ.
"Ogbunigwe a gburu nne na nna na ụmụnne m atọ" - Hauwa

Anyammiri juru Hauwa anya dịka ọ kọwara BBC etu ọkụ siri gbagbuo nne na nna ya na ụmụnne ya atọ oge ndịagha wakporo obodo ha. Ọ bụ njisiike ka o ji gwa onye ntaakụkọ anyị aha ya.
Hauwa tipuru akwa nke mere ka ọtụtụ ndị obodo gbakọọ ma jide ya ma na-eti ya aka n'obi maka ọdachi ahụ dakwasịrị ezinaụlọ ya.
Mwakpo Dronu nke ndịagha Naịjirịa mere gburu mmadụ iri ma meruo mmadụ isii ndị ọzọ ahụ n'obodo Rumtuwa na Gidan Sama dị n'okpuruọchịchị Silame dị na Sokoto steeti.
Ndị nwụrụ site na mwakpo a gụnyere nna Hauwa, nne ya na ụmụnne ya atọ.
'A hụrụ m ka ọkụ na-agba ezinaụlọ m'
N'agbanyeghị na ndị obodo gbara mbọ ijitu Hauwa, otu ihe ọ gwara BBC bụ na "A hụrụ m ka ọkụ na-agba nne m, nna m na ụmụnne m atọ".
Otu onye obodo gwara BBC okwu bụ Usman Manuga, kwuru na ọdachi ahụ mere ngwa ngwa ha mseịrị ekpere Asr n'ụtụtụ Wenezde 25 Disemba, 2024.
N'okwu ya "Ka anyị mesịrị ekpere, anyị pụtara ikele nne na nna anyị, a nụrụ ka ndị mmadụ na-eti 'lee lee lee', a pụtara m ma hụ oge ogbunigwe mbụ ahụ dara n'obodo anyị".
N'ime mmadụ iri ahụ nwụrụ na ndị meruru ahụ, akụkọ kwuru na anụmanụ ruru otu narị nwụrụ site na mwakpo ogbunigwe ahụ.
Ọ bụ ihe mere n'amaghị ama - Gọvanọ Ahmad Aliyu

Ebe foto si, Ahmad Aliyu/Instagram
Gọvanọ Ahmad Aliyu na-achị Sokoto steeti nọrọ n'emume oliliozu ndị ahụ nwụrụ kwuo na mwakpo ogbunigwe ahụ bụ nke mere 'n'amaghị ama'.
"Ihe a ndị mmwute, ndịagha amaghị ama tụọ ogbunigwe ahụ", ka Gọvanọ Ahmad Aliyu kwuru.
Ọ gara n'ihu kwuo na kemgbe ndịagha nwetara ozi na ndị omekome batara steeti ahụ, ha emeela mwakpo ugboro atọ nke gara etu o kwesịrị. O kwuru na mwakpo nke a metụtara obodo a bụ nke mere n'amaghị ama.
Gọvanọ Ahmad Aliyu kwuru "Dịka ndị okpukperechi alakụba, anyị ga-nabata ya dịka uche chukwu ma ọ dị mma ma ọ dị njọ."
O kwuru na gọọmenti ya na ụlọọrụ ndị ọzọ ga-ejikọ aka mee nnyocha iji chọpụta ihe butere njinji ahụ ma rụọ ọrụ iji gbochie ya n'ọdịnihu.
Ọ gbara ama na o nyela obodo ahụ ihe a metụtara akpa ihe oriri dị otu narị nakwa ego dị nde naịra iri abụọ.
Ihe onyeisioche okpuruọchịchị Silame kwuru

Ebe foto si, NIGERIA AIRFORCE/FACEBOOK
Onyeisioche okpuruọchịchị Silame bụ Abubakar Muhammad kwuru na o nwetara oku na enwere ogbunigwe dara n'obodo ha. O kwuru na o mere nnyoch ma chọpụta na nkea bụ eziokwu.
Abubakar Muhammad onye kwuru na ya na Gọvanọ Aliyu so gaa mmemme oliliozu ndị ahụ nwụrụ, gbara ama na ọ bụ ụgbọelu agha abụọ ndịagha bụ ihe tụrụ ogbunigwe ahụ.
O kwuru na ndịagha na-ebuso ndị omekome agha n'obodo ahụ n'ihi na obodo ahụ dị nso n'ọzara Surame ebe akụkọ kwuru na ọ bụ ebe ogige ọgbakọ ndị omekome Lakurawa na-akpa mkpamkpa na Naịjirịa ugbua.
Nke a abụghị mbụ ụdịrị mwakpo a na-eme
Ndịagha Naịjirịa emeela mwakpo dị etu a ha kwuru na ha amaghị ama ugboro itoolu.
N'abalị Disemba 3, 2023, ogbunigwe ndịagha wakporo ọgbakọ ndị mmadụ na-eme emume Maulidi n'obodo Tudun Biri village dị Kaduna steeti.
Mwakpo ahụ bụ nke ndịagha kwuru na ọ bụ maka na ha chere na ọ bụ ọgbakọ ndị omekome. Mwakpo ahụ gburu mmadụ otu narị.
Ruo ugbua, e nwere ndị mwakpo ahụ metụtara gwara BBC na ha anaghịzi enweta nleta n'ụlọọgwụ maka ahụ ha meruru site na mwakpo ahụ.
Nnyocha BBC chọpụtara na ndịagha nke a bụ ugboro itoolu ndịagha na-atụ ogbunigwe n'obodo ndị mmadụ n'amaghị ama kemgbe afọ 2022 ruo ugbua.
Amnesty International akpọọla oku ka e mee nnyocha

Ebe foto si, Amnesty International Nigeria/X
Ụlọọrụ Amnesty International Nigeria akpọọla oku ka Onyeisiala Bola Tinubu nye iwu maka ezi nnyocha iji chọpụta ihe butere mwakpo ogbunigwe ahụ gburu mmadụ iri a ma hụ na e tiri ezinaụlọ ihe a metụtara aka n'obi









