Egwuregwu Olimpiks 2024 ebidola na Paris

Otu Naịjirịa pụtara n'ọgbọ na mmemme mmalite Paris Olympics

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Egwuregwu Olimpiks 2024 ebidola na Paris, France.

E mere mmepe ahụ n'ogige mmiri nakwa ọtụtụ ebe ọzọ dị iche iche n'obodo Paris.

Nke a bụ oge mbụ a na-emeghị mmepe egwuregwu Olimpiks n'ama egwuregwu.

Mba 206 ga-esonye n'egwuregwu Olimpiks 2024 ma zọọ ọla dị iche iche n'egwuregwu 32.

Ha gunyere mba Afrịka 54, mba Urope 48, mba ashia dị 44, mba 41 si Amerịkas ebe mba 17 si na mpaghara Oceania, ndị ọgbaọsọ Individual Neautral Athletes na otu Refugee Olympic team.

Ndị isi mbaụwa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị isi mbaụwa

Ndị nọ n'emume ahụ gụnyere Prịma mịnịsta mba Briten bụ Keir Starmer, ndị isi mbaụwa ruru otu narị, tiegwu Lady Gaga, Celine Dion na ọtụtụ ndị ọzọ.

N'ozi onyeisi kọmiti IOC bụ Thomas Bach nyere na mmeme ahụ, ọ kpọrọ oku ka ụwa niile jikọta onwe ha ma kwụsi ịlụ ọgụ. Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ maka ọgụ na agha mere Russia na Belarus ji ghara isonye n'egwuregwu Olimpiks afọ 2024.

Celine Dion

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Celine Dion
Ogige Eiffel Tower

Ebe foto si, Getty Images

Zinedine Zidane

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Zinedine Zidane