Ihe ị kwesiri ịma maka akwụkwọ a gbara Sinach

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Nwata nwanyị na-eti egwu ụka bụ Osinachi Joseph Ogbu a mara dịka Sinach bụ otu onye na ndị na-eti egwu na-enwuenwu na Naịjirịa.

Ugbua a kpụpụla ya ụlọikpe maka egwu ya a kpọrọ ‘Waymaker’ maka ebubo ime ihe dara iwu gbasara ịwere egwu mmadụ dere.

Akụkọ kwuru na onye na-arụrụ ya egwu bụ Michael Oluwole kpụpụlụ Osinachi n’ụlọikpe dị elu na Lagos.

Oluwole chọrọ ka ụlọikpe nwee mkpebi sị na ya so nwere egwu “Waymaker’ ahụ dịka onye meputara ya ma gwa Sinach ka ọ nye ya ijeri naịra ise (N5b) maka ịda iwu megide ikike ya.

Ikpe ahụ pụtara n’ụlọikpe ọkaikpe Ambrose Lewis-Allagoa n’ụbọchị wenesde.

Akụkọ na-ekwu na Michael Oluwole bụ na-agwa ụlọikpe sị na ya rụrụ ọrụ n’imeputa egwu ahụ.

Ọ kwuru na ya kụrụ ọtụtụ ngwọ-egwu mgbe a na-eti egwu ahụ ma soro hazie ya n’ụlọ nkụpụta egwu.

Ọ kọwara n’agbanyeghi na ha enweghi nkwekọrịta e dereede na Osinachi kwesiri ịkwụ ya ego ma nye ya oke n‘ego Osinachi wetere ebe ọ gara tie egwu ahụ na ego ndị ọzọ ọ wetere n’egwu ahụ.

Ọkaikpe Michael Oluwole na-agwa ụlọikpe ka onye iwu ka Oluwole na Osinachi kee ego niile egwu ahụ nwetere nhatanha.

Ha gwara ụlọikpe ka Sinach nweputa ego niile egwu ahụ nwetara nakwa nkwekọrịta niile o jiri egwu ahụ nweta ma nye Oluwole nke ya.

Mana ọkaikpe Osinachi bụ Emeka Etiaba gwara ụlọikpe na ọ bụ sinach bụ ‘onye dere egwu ahụ naanị ya’.

Etiaba kwuru na a kwụọla Michael Oluwole ego maka ọrụ niile ọ rụrụ n’ụlọ ntiputa egwu.

Onye bụ Sinach?

  • Ezigbo aha Sinach bụ Osinachi Joseph Egbu.
  • Ọ bụ onye Edda dị n’okpuru ọchịchị Afikpo Saụt n’Ebonyi steeti.
  • Dị ya bụ onye Ngwa dị n’Abia steeti.
  • Ọ gụrụ ihe a kpọrọ “Physics’ na mahadum Port Harcourt mana ọ hapụrụ ihe ọ gụrụ bido na-eti egwu.
  • N’ajuju ọ sara BBC na mbụ ka ọ kwuru na ọ bụ ụkọchukwu Chris Oyakhilome nke ụlọụka Christ Embassy nyere ya aka n’egwu ya.
  • Egwu Sinach na-enwuenwu gunyere ‘Waymaker’, nakwa ‘I know who I am’ ma ‘Great are you Lord’ ma ‘Aesome God’ na egwu ndị ọzọ.
  • N’afọ 2029 ka ọ bụ onye n’Afrịka mbụ gara tie egwu na mba India.

Gịnị ka ị ma maka egwu 'Waymaker' na-ese okwu

Sinach nweputara egwu ‘Waymaker’ n’afọ 2015.

Mana nwantịntị oge, egwu ahụ sonyere n’egwu na-enwuenwu ma merie ndekọ niile egwu ndị ọzọ nwere na ngaraba iti egwu ụka.

N’afọ 2020 n’oge ọrịa Covid19 bidoro ka egwu ‘Waymaker’ malitere bụrụ egwu a kachasị akpọ na mba Amerika maka na ọ na-akasị ndị mmadụ obi n’ego ahụ.

N’otu afọ ahụ ka Sinach nwetara nturu ugo na ihe nrite a kpọrọ “GMA 2020 Award” nke mere onye mbụ na Naịjirịa na enweta ihe nrite ahụ.

Ọ nwetekwara mmeri dịka ọkụ egwu nke BNI n’afọ 2021.