Obudu: Ị ma maka obodo a ụmụnwoke na ụmụnwaanyị nwere asụsụ nke ha?
- Onye dere ya, Chris Okereke
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist
- Ebeg o si, Cross River, Nigeria
Igbo si na anaghị anọ otu ebe ekiri mmanwụ. BBC Igbo mere njem gaa n’akụkụ ndịda Naịjirịa bụ obodo Obudu nke dị na Krọss Riva steeti.
Ọtụtụ nọ aha obodo a, ihe na-agba ha n’uche bụ mbara ebe nlereanya a ma ama dịka ‘Obudu cattle ranch’ nke bụ ebe a nazụ ma na-chekwa ehi n’akụkụ Krọss Riva steeti.
Agbanyeghị na mbara bụ ebe a ma ama, ọ nọghị n’ime obodo a bụ Obudu kama ọ nọ n’ime Obaniku nke bụ otu n’ime obodo isii dị n’Ogoja mgbe gboo.
Obodo Obudu nọ n’agbata ụzọ Ikọm, Ogoja, Benue na ya bụ Obudu cattle ranch na-ewu ewu.
Otu n’ime omenala ndị obodo Obudu na-atụ ọha n’anya bụ na ụmụnwoke na ụmụnwaanyị ha nwere asụsụ nke ha iche iche.

E nwekwara obodo ọzọ bụ obodo Ubang na Krọss Riva bụkwa ebe ụmụnwoke na ụmụnwaanyị nwere asụsụ nke ha iche iche.
Ndị bi ebe ahụ kọwara na ụmụnwoke na ụmụnwaanyị nwere asụsụ nke ha na-asụkọ ọnụ ma nwee nke ha iche.
Ndị obodo a dị uchu n’ọrụ ugbo dịka ha na-akpụpụta akpụ, dawa dawa na ihe ndị ọzọ.
N’afọ 1967 ka ekepụtara obodo Obudu dịka okpuruọchịchcị kwuru onwe ya.
Ndị mere akụkọ a bụ Chris Okereke, Nnamdi Agbanelo na Vining Ogu.



