Tourism in Enugu State: Etu mmiri na-asọpụta mmiri ọkụ na mmiri oyi si atụ ụwa n’anya n’Ezeagu
Ihe ịtụ n’aya dị ịcheịche juru ala Igbo, otu n’ime ha bụ isi mmiri na-asọpụta mmiri ọkụ nakwa mmiri oyi n’obodo Ihuezi Obinofia Ndiuno nke dị n’okpuruọchịchị Ezeagu nke Enugu steeti.
Mmiri a na-adọtara ndị obodo ọtụtụ ihe ọma nke ọkachasị dịka ndị njem nlere anya na-abịa agba ya bụ mmiri kiri.
Ọbịabịa dị njem a enyerela obodo aka ịbụ obodo mepere emepe.
Ndị bi ebe ahụ kwuru na mmiri a bụ ngọzị nye ha dịka ha na-asa ahụ ebe ahụ, asa akwa ha ebe ahụ, emesapụ ahụ ma nwee ekwuregwu n’ime ya.
Ọtụtụ ndị mmadụ na-aṅụkwa ya bụ mmiri ebe e jikwa ya esi nrị.
Otu onye sanyesị nke ngalaba “Geology” na mahadum Federal University of Technology, Owerri (Futo) kọwara BBC Igbo etu ihe ọnatarachi a na-atụ ụwa na ya si eme.
Kirie ihe onyoonyo a ka ijiri anya hụ ihe ịtụ n’anya a.
Ndị mere akụkọ a bụ Nnamdi Agbanelo na Chukwudi Okereke.