“Ọ bụ m sị nwa m soro mee ngagharịiwe” - Nwaanyị e gburu nwa ya na Kano

Ebe foto si, Maryam Musa
Ismail Muhammad so na otu onye n’ime ọtụtụ mmadụ nwụrụ na ngagharịiwe ụmụntorobia mere maka oke agụụ na ihe ụkọ na Naịjirịa bụ nke bidoro na mbido ọnwa Ọgọọst, afọ 2024.
Ismail Muhammad dị afọ ịrị abụọ na otu.
Nne ya gwara ya ga soro mee ngagharịiwe ahụ bụ nke e mere na Kano steeti nakwa mpaghara dị icheiche na Naịjirịa.
Otu ụbọchị ahụ ka a gbara Ismail egbe ma gbagbuo ya.
Nna Ismail nụrụ ụmụnwanyị atọ. Ha ruru ịrị abụọ na ezịnaụlọ ha, mana Ismail bụ dịọkpara.
Ọ na enyere aka ịzụ ụmụnwanne ya. Nna ya bubu onyeisioche na otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị n’okpuruochichi gọomentị ha mana ka ọnọdụ sị dị ugbua, ihe na-esiri ha ike.
N’ụbọchị agbagburu Ismail Muhammad, nne ya bụ Maryam sị n’ụlọ pụọ oge Ismail ka nọ n’ụlọ.
Nke a mere nne ya ji na-akpọ ya n’ekwenti ka ọ pụta soro mee ngagharịiwe ahụ maka na ha hụrụ ya dịka naanị ụzọ ha ga-esi gosi iwe ha maka oke agụụ.
Etu o si mee
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Maryam gwara BBC na ya amaghị na ya na-akpọ nwa ya ka ọ bịa nwụọ “Akpọrọ nwa m ka ọ bịa mee ngagharịiwe, mana amaghị m na-akpọrọ ya ka ọ bịa nwụọ”.
O kwuru na abalị fotere ụbọchị a gbagburu ya ka ya gara chịpụta akpụụkwụ ya, na ụwe ya gbaa ha na anwụ maka na ọ bụ ihe ọ ga-enyi soro ga mee ngagharịiwe bụ nke ha chọrọ ịga mee n’obi gọọmentị.
Ọ sị na obere oge ka ha ruru na obi gọọmenti ka ndị ọrụ nchekwa bidoro gbawaa ha egbe-awụrụ-anyammịrị. Maryam bụ onye so na-eme ngagharịiwe ahụ gbara ọsọ ma gbalaga. Mana nke a bụ oge ikpeazu ọ hụrụ Ismail nwa ya.
Oge Maryam nọ n’ụlọ na-akọrọ ndị mmadụ etu ndị ọrụ nchekwa sị jiri egbe awụrụ anyammịrị achụsasị ndị na eme ngagharịiwe, ọ maghị na nwa ya nwụrụ ebe ahụ. Oteghị aka ọzị abiara ya na nwa ya awụọla ebe ahụ o sị gbalaga.
Ismail na agụakwụkwọ nọọsụ. Ọ gwara nne ya na ya gụchaa akwụkwọ na ihe ga adịrị ha mma. Tupuu ọnwụọ, nne ya nwetere ya ọrụ ebe a na-ere uwe n’ime ahịa.
Afọ abụọ garaaga ka Ismail na arụrụ nwanne nna ya ọrụ. A na-akwụ ya N45,000. Ọkara ego ahụ na-anara ezinaulo ya. O na enyere aka na-akwụ ụgwọakwụkwọ ụmụnne ya.
Akwụrụ ya ụgwọ ọnwa abalị garaaga tupuu ụbọchị emere ngagharịiwe ahụ. O nwere ego kwụọ ọtụtụ ụgwọ ezinaulo ya gi ma jide ego ndịọzọ n’akpa ya tupuu a gbagbuo ya. Oge e bunatara ozu ya, enweghizi ego dịzị na akpa ya.
A gbara ya egbe ebe abụọ, azụ na isiaka ya.
Maryam kwuru “ọnwụ ya ga abụlụ m ihe mgbanwaobi na ndụ m niile. Naanị ihe anyị chọrọ na-aka gọọmentị bụ ikpe ziriezi”.
Na ụbọchị Sonde ka onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu kwuru na ya ma na ndị mmadụ nwụrụ na ngagharịiwe ahụ. Mana ndị uweoji ekwetebeghị na enwere ndị nwụrụ na aka ha.
Ha na-ekwu na ọ ga ahịa ahụ ịchọpụta ọnye ọrụnchekwa gbagburu nwatakiri ahụ.










