Gana ekwetala ịnabata ndị Ọdịda Anyanwụ Afrịka mba Amerịka chụpụrụ

Onyeisiala mba Gana John Dramani Mahama

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala John Mahama kwuru na Amerịka bịakwutere Gana ka ọ nabata ndị ha gbaara ụgbọ nwamkpi
    • Onye dere ya, Thomas Naadi
    • Ndị mere akụkọ a, BBC Africa, Accra
  • Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Gana abụrụla mba ọhụrụ nabatara ndị achụpụrụ n'Amerịka dịka Onyeisiala Donald Trump na-ebu agha megide ndị kwagara mba Amerịka n'ụzọ iwu na-akwadoghị.

Onyeisiala John Mahama kwuru na ha ga-akpọrọ ụmụafọ si na mba dị iche iche dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka ka ha n'Amerịka nwere nkwekọrịta.

O kwukwara na mmadụ iri na anọ abịalarị na mba Gana.

Dịka o siri kwuo, mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka nwere iwu kwadoro ka ụmụafọ ha bata ma biri na mba dị na mpaghara ahụ ihe dịka abalị iri itoolu na-enweghị akwụkwọ njem visa.

N'ọnwa gara aga, mba Amerịka chụpụrụ ma kpọga ndị njem asaa na Rụwanda n'ọnwa Julaị, ise na Eswatini na asatọ ndị ọzọ na South Sudan.

BBC News Igbo amalitela nkesa akụkọ n'ọba ozi WhatsApp Chanelụ.
Nkọwa foto, Pịa aka ebe a ka i soro BBC News Igbo WhatsApp Chanelụ

Onyeisiala Mahama kwuru na mmadụ iri na anọ a chụpụrụ na mba Amerịka gụnyere ndị Naịjirịa na Gambia erutela mba Gana. Mana o kwubeghị mmadụ olee ndị Amerịka gbaara ụgbọ nwamkpi Gana ga-anabata.

O kwuru na Gana enyerela ndị Naịjirịa aka ka ha jiri ụgbọala laghachi mba ha ebe ha ka na-enyere ndị Gambia aka ịlaghachi mba ha.

"Amerịka bịakwutere anyị ka anyị nabata ụmụafọ abụghị ndị mba anyị agbaara ụgbọ nwamkpi n'Amerịka. Anyị kwetere na anyị ga-anabata ndị si mba dị n'ọdịda anyanwụ Afrịka," Mahama kwuru.

Ọ gbakwụnyere, "Ndị si mba niile dị na mpaghara Ọdịda Anyanwụ Afrịka anaghị achọ akwụkwọ njem visa iji bata mba anyị."

Mahama kọwara mmekọrịta dị n'etiti Gana na Amerịka dịka "ọnọdụ siri ike", dịka ọ rụtụrụ aka na nnukwu ụtụisi mba Amerịka tinyere na ngwa ahịa Gana na mmachi visa nke ndị si mba ya.

Otu ọ dị ugbua, o kwuru na mmekọrịta ha dị mma.

Cheta na ndị ọchịchị Trump agakwuola ọtụtụ mba Afrịka ka ha nabata ndị a chụpụrụ n'Amerịka dịka ọ na-egbochi mbata na mba ahụ n'ụzọ iwu akwadoghị.

Ụfọdụ n'ime ndị a chụpụrụ bụ ụmụafọ mba dịka Jamaika, Vietnam na Laos, ebe ndị otu na-ahụ maka ikike dịrị mmadụ na-ekwu na o mebiri ikike ha.

N'aka nke ọzọ, mba ụfọdụ agbala mgba megide atụmatụ mbula ahụ.

Naịjirịa, nke bụbu onye mmegide atụmatụ ahụ, ekwuola na ọ gaghị anabata ndị mkpọrọ nke mba ọzọ sitere n'Amerịka.