Chineke agwala m alụla nwaanyị ọzọ - Rev. Chris Okotie

Aha onyonyo, Rev. Chris Okotie akọwaala etu Chineke si gwa ya chefuo maka ọlụlụ nwaanyị
Chineke agwala m alụla nwaanyị ọzọ - Rev. Chris Okotie

Rev. Chris Okotie bụ ụkọchukwu nwe ụlọụka 'Household of God Church' nakwa otiegwu a ma ama, agwala BBC Pidgin etu Chineke si gwa ya okwu maka alụmdinanwunye nakwa etu o si banye ndọrọndọrọ ọchịchị.

Gbasara alụmdinanwunye o kwuru sị "Anaghị m alụ nwaanyị ọzọ o, anaghị m alụzị n'ihi na Jesus agwala m na nke a ahụ agwụla n'ihi na mgbe m chegharịrị, anọ m na mahadum mgbe ahụ, aghọtaghịkwanụ m ebumnobi Chineke maka ndụ m.

"Ana m ekwukarị na achọrọ m ezinaụlọ nke m na ihe ndị ọzọ so ya..."

Rev. Chris Okotie
Nkọwa foto, Chris Okotie
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ọ gara n'ihu kwuo sị:

"Mana mgbe ọ (alụmdinanwunye) na-adabaghị ugboro abụọ n'ihi na ana m eche na eso m n'ime di kacha mma n'ụwa a, ndị ma m ga-agwa gị nke a. Mana ọ dabaghị.

"Agakwuru m Chukwu kere m sị ya, gịnị na-eme? Ọ gwara m sị 'akpọghị m gị maka ụdịrị ihe a. Akpọrọ m gị dịka Paul, mana anwara m ịkwụsị gị mana ị geghị ntị mgbe ahụ. Ụdịrị ndụ m chọrọ ka i biri bụ ụdịrị nke ị ga-ewere ndụ gị nyefee m nakwa ọrụ m ji maka ya kpọọ gị.

"Ya bụ na alụmdinanwunye anọghịzị m n'uche ọzọ, ma ncha."

Maka ndọrọndọrọ ọchịchị

Okotie bụkwa onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị zọrọla ọkwa onyeisiala Naịjiria ugboro ugboro, kọwara etu o si banye n'ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Okotie zọrọ ọkwa onyeisiala ugboro atọ n'okpuru pati Justice Party nakwa Fresh Party nke o hibere, mana isi ya apụtaghị.

Ọ gara n'ihu tinye ọnụ n'ihe gbasara ntuliaka afọ 2023, o kwuru na ọ bụ APC na PDP kacha nwee 'structure' ugbua.

O kwuru na ọ bụ eziokwu na a na-anụ maka Labour Party ugbua, mana o ji ya tụnyere mgbe o ji pati na-abụghị abụọ a zọọ ọkwa.

Gee ihe ndị o kwuru n'uju: