You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe na-egosi na enwere onye na-emetọ nwatakịrị na nzuzo
Ọtụtụ mgbe ka akụkọ ndị gbasara ndị na-emetọ ahụ ụmụaka, nke bekee kpọrọ 'sexual molestation', na-apụta n'akwụkwọ ntaakụkọ dị icheiche na Naịjirịa.
Nke kacha wuo nsonso a bụ nke onye na-eme ihe ejije ama ama bụ Olarenwaju Omiyinka eji Baba Ijesha, onye ụlọikpe tụrụ nga afọ iri na isii maka ebubo ịmetọ nwatakịri.
Onye na-ahụ maka akparamagwa ụmụaka na ndị na-etolite etolite bụ Sama Benedict tinyere ọnụ na ya bụ okwu.
Sama Benedict kọwara ‘Sexual Molestation’ dịka agwa ọbụla mmadụ kpasoro nwata n'ụzọ iji nwee mmekọ ahụ maọbụ igosi mmasị inwe mmekọ ahụ, ọ bụghị naanị mgbe onye ahụ tinyere ahụ ya n'ahụ nwatakịrị ahụ nke bekee na-akpọ 'penetration'.
Maka akụkọ a, anyị ga-akpọ Sexual Molestation mwakpo okenye mere ahụ nwata.
Sama kwuru sị, "Agwa ọbụla nke e mere iji kpalite agụụ inwe mmekọ ahụ n'ime nwatakịrị, maọbụ mmadụ na nwatakịrị inwe mmekọ ahụ, maọbụ bụ mwakpo okenye mere nwatakịrị”.
O kwuru na enwere ọtụtụ mgbaama, mana ọ naghị adị mfe onye na-enweghị ọzụzụ ịchọpụta mgbaama ndị a.
“Ọ bụ ya mere e ji agwa nne na nna ka ha gaa hụ ndị ọ bụ ọrụ ha inyochapụta ihe ndị a,” Benedict kwuru.
Ihe mgbaama abụọ gbara ọkpụrụkpụ bụ: Nke Akparamagwa na nke anya na-ahụ
Nke Akparamagwa
Sama kwuru sị, "Ihe ịgbaama mwakpo okenye mere nwata nke anya na-ahụ na-abụkarị ndị dọkịnta na-achọpụta ya, ebe nke akparamagwa bụ nke onye nkịtị nwereike iji anya chọpụta”
1) Oke nchegbu nke bekee na-akpọ 'anxiety', na obi ịda mba nke bụ 'depression' na bekee maọbụ ọnodụ onyeikpe mara (guilty feeling)
Ị ga-achọpụta na nwa ahụ ga na-anọrọ onwe ya mgbe ọbụla ọ dị ka enwere ọdachị mere ya.
Sama kwuru sị, “E nwere otu nwata akwụkwọ sekọndrị bi n’ụlọ akwụkwọ bidoro na-anọ n’onwe ya. N’ihi na onye nkuzi ya wakporo ya ma sị ya na ọ gwa onye ọbụla na ọ ga-anwụ”.
“Ụjọ jị nwatakịrị a dịka ọ chere na ọ ga-anwụ, ọ chekwara na ikpe ga-ama ya maka ihe mere.”
Nke a mere ka ọ nọrọ naanị ya tupu o mechaa gbuo onwe ya.
Kama oge ọ na-anwụzị ka ọ gbara ama na ọ bụ onye nkuzi ha wakporo ya.
Sama Benedict kwuru sị, “Ọ bụ ụjọ na-eme ha ji anọpụrụ onwe ha ma na-enwe obi ịdamba. Ọ na-eme kwa ha a na-eche igbu onwe ha”.
2) Ehịghị ụra nke ọma
Ụmụaka okenye na-awakpo na nzụzo ụfọdụ oge anaghị ehi ụra nke ọma.
Sama kwuru sị, “ Ha agaghị ehi ụra nke ọma n’ihi ụjọ ga na-atụ ha ma ha ga na-arọ ajọ nrọ”.
3)Etu ha sị eri nrị
Sama kwuru sị, "Ụmụaka okenye na-awakpo nwereike bido iri oke nrị karịa etụ ọ kwesịrị maọbụ ọ gaghị enwe mmasị iri nrị ọzọ”.
4) Ngosipụta ụjọ
Sama kwuru na ọtụtụ ndị awakporo ọkachasị ụmụaka okenye wakporo na-atụkarị ụjọ ịga ebe awakporo ha maọbụ ebe yiri ebe awakporo ha.
O kwuru sị, “Ha ga na-atụkwa ụjọ ndị yiri onye ahụ wakporo ha, ọ bụ ya mere ụfọdụ ụmụaka ụmu nwaanyị na-abịa ụlọọgwụ anyị na-achọ ka ọ bụrụ nwaanyị dọkịnta ga-eleta ha n’ihi na nwoke ọbụla ha hụrụ na-echetara ha onye ahụ wakporo ha”
“Mgbe ịchọpụtara na nwatakịrị bidoro ịtụ ụjọ ị ga-ụlo ụfọdụ, ya burugodi onye ezinụlọ, mara na e nwere ihe ha na-ezere”, dịka Sama siri kwuo
O kwuru na ọzọkwa bụ mgbe enwere otu onye maọbụ ndị okenye ụmụaka anaghị ekwe ka ahapụ ha na onye ahụ.
5) Mgbanwe agwa, ọkachasị iwe
Sama kwuru sị, “ihe ịgbaama okenye ịmetọ na ịwakpo ahụ nwatakịrị bụ mgbe nwa ahụ bidoro na-ewesara nne na nna ya na ụmụnne ya iwe na-enweghị ihe kpatara maọbụ kpalie iwe ha”.
O kwuru na nwatakịrị ahụ ga na-anọrọ onwe ya, oge ụfodụ ọ ga-achọ ụzọ si n’ụlọ gbapụ.
6) Enweghị mmasị ihe ọbụla na ịdamba n’agụmakwụkwọ
Sama kọwara sị, “Ihe ịgbaama ọzọ bụ na nwatakịrị ahụ nwereike ọ gaghị enwe mmasị ime ihe ọbụla, ụfọdụ mgbe ị ga-ahụ na nwatakịrị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ga-ebido lawa azụ”
Ihe ọbụla na-amasị ha na mbụ agaghịzị amasị ha ọzọ.
7) Ịmerụ onwe ha ahụ
Sama kwuru sị, “Ụfọdụ ga-ebido ịmerụ onwe ha ahụ ha nke bekee na-akpọ ‘self mutilation’, ebe ụfọdụ nwereike ịgbanwe etu ha si ahụta ahụ ha”.
O kwuru na ụmụ ntakịrị a ga na-ahụta ahụ ha dịka ihe dị njọ.
8) Ụfọdụ ga-ebido iche maka igbu onwe ha
Sama kwuru sị, “ Ụfọdụ ụmụaka na-enwe mgbagwoju anya maka ihe ndị mmadụ na-eche maka ha, nke mere na ụfọdụ ga-asị ka ha gbuo onwe ha ka ihe niile bie”.
9) Ịgosipụta agwa mmekọ nwoke na nwaanyị nwatakịrị ekwesịghị igosi
Sama kọwara na ihe ịgbama ọzọ bụ mgbe nwatakịrị bidoro gosiwe maọbụ kpawa agwa mmekọ nwoke na nwaanyị nke nwatakịrị ekwesịghị ịma maọbụ gosi.
O kwuru sị, “Mgbe nwatakịrị na-egosi gị na ọ ghọtara mmekọ nwoke na nwaanyị karịa ndị okenye, ọ pụtara na o nwereike ịbụ na e metọọla nwatakịrị ahụ maọbụ na e nwere okenye na-egosi ya ihe na ezighị ezi.
O kwuru na ọ bụ ebe a ka nwatakịrị si mụta ihe ndị a.
10) Irube isi gafee oke
Sama kwuru sị: “Ụfọdụ mgbe, nwatakịrị okenye na emetọ maọbụ awakpo ahụ ya na-erubere okenye ahụ isi n’ụzọ pụrụiche maka ụjọ.
Tupu i kwuchaa okwu ha emeela ihe ahụ ị chọrọ n’ihi ha achọghị ka iwe wee gị ebe ha nọ. Ọtụtụ mgbe ha amaghị na ha na-akpa agwa ndị a” .
Ihe ịgba ama nke anya na-ahụ (Physical Signs)
Sama kọwara na ihe ịgbaama nke anya na-ahụ abụghị ihe a na-ahụkarị kama ọtụtụ mmadụ nwereike ịchọpụta ụfọdụ n’ime ha ọsịsọ.
O kwuru na ụfọdụ ihe ịgba ama bụ:
- Mmerụ ahụ
- Akụku ahụ ịcha uhie uhie
- Onya n’akụkụ ọnụ
- Ọnya n’ike, amụ, ọtụ maọbụ n’akụkụ ha
- Ọrịa mmekọ nwoke na nwaanyị
- Ọrịa metụtara ihe eji anyụ mamịrị
- Abụ na ihe ndị ọzọ isi ebe ndị a apụta
- Ụfụ mgbe nwatakịrị na-anyụ nsị maọbụ mamịrị
- Nwata ịnyụ mamịrị n’akwa maọbụ n'ụzọ ezịghị ezi
- Afọ ịfụ ụfụ
- Isi ọwụwa
Ihe ndị a bụ ụfọdụ ihe ịgbaama nke anya nwereike ịhụ,
Sama kwuru sị, “Ọtụtụ mgbe, ị kpọrọ ha gaa ụlọọgwụ, e nweghị ihe a ga-achọpụta, mana ị kkọgara ha ndị a zụrụ nke ọma maka akparamagwa ụmụaka, ha ga-enyocha ya ma jụọ ya ajụjụ dị aṅaa iji chọpụta nke bụ eziokwu”.
Ọ na-adịkarịrị ndị nne mfe ịchọpụta ihe ndị a dịka nwa ha ga na-ejide amụ, ike maọbụ ọtụ ya aka maka ụfụ ọ na-afụ ya.
Ihe ị ga-eme ma ị chọpụta njirimara ndị a
Sama Benedict kwuru na ọ dị ezigbo mkpa ka onye ọbụla chọpụtara ihe njrimara ndị a n'ebe nwatakịrị nọ kpọrọ ya gaa ụloọgwụ, ọkachasị nke na-enyere agwa ụmụaka aka maka enyemaka.