Ihe mere anyị jiri tụọ ogbunigwe n'ọhịa Orsumoghu nakwa ebe ndị ọzọ - Ndịagha ụgbọelu

Ndịagha Ụgbọelu Naịjirịa bụ Nigeria Airforce (NAF) akọwaala ihe mere ha jiri tụọ ogbunigwe n’ime ọhịa dị n’ụfọdụ mpaghara Naịjirịa n’ụbọchị Fraịde 11 Ọgọọst, 2023.

Nkọwa a dị n’akwụkwọ ozi ọnụ na-ekwuru ngalaba a bụ ọchịagha Edward Gabkwet wepụtara n’ụbọchị Satọde nke kọwara na ha tụrụ ndị a ogbunigwe n’ogige atọ n’otu ụbọchị.

O kwuru na ndịagha ha ji ụgbọelu tụọ ogbunigwe n’ogige ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) na Eastern Security Network (ESN) dị n’ọhịa Orsumoghu nke okpuruọchịchị Ihiala, Anambra Steeti.

O kwuru na mere nyocha ma chọpụta na ndị otu a nọ n’ogige ha na-akpata nkata ma na-akwado ịwakpo ndị mmadụ bi nso n’ebe ahụ na ọ bụ ya mere ha jiri tụbara ha ogbunigwe.

Gabkwet kwuru na ogbunigwe ha tụụrụ mezuru ihe e jiri tụọ ya mana ọ kọwaghị ma o nwere ndị maọbụ onye nwụrụ site na ya.

Nke a abụghị mbụ ndị ọrụ nchekwa Naịjirịa na-akwapo ogige ndị Ipob/ESN n’obodo Orsumoghu maka na o so n’ebe ndị ọnọdụ nchekwa dị ọjọọ na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ.

Kamgbe afọ 2021, e nweela ọtụtụ akụkọ banyere ntọrọ na ogbugbu ndị mmadụ gụnyere ndị ọrụ nchekwa na mpaghara Orsumoghu nakwa obodo ndị gbara ya gburu gburu.

N’ihi ya ndị ọrụ nchekwa na-tinyekaarị anya n’obodo ndị a na-ekwu na ndị Ipob/ESN na-enye nsogbu ndị a mana Ipob na-agọ na aka ha adịghị na ya.

Ebe ndị ọzọ ndịagha a tụrụ ogbunigwe

Ọchịagha Gabkwet kwuru n’otu ụbọchị ahụ na ndịagha tụkwara ogbunigwe n’ogige ebe a na-esipụta mmanụ agbidi adịgboroja dị n’obodo Bille nke okpuruọchịchị Degema, Rivers steeti.

N’otu aka ahụ, ndịagha ụgbọelu tụkwara ogbunigwe n’ebe nzuzo ndị na-eyi ndụ egwu dị n’obodo Arra nke dị n’akụkụ oke ọhịa Sambisa na mpaghara Ugwu Naịjirịa.

Ha kọwara na nyocha gosiri na ndị oyi ndụ egwu ji nwayọọ na-agbakọta n’ebe ahụ na nso nso a na-agbanyeghi na a chụpụbuola ha na mbụ.

O kwuru na ndị oyi ndụ egwu a bụ ndị gbara ọsọ ndụ site na mpaghara Lake Chad dịka ndị ọrụ nchekwa kwara ha mgbọ.

Na ogbunigwe a ha tụrụ n’obodo Arra mere ọfụma dịka ihe onyonyo gosiri na o gburu ọtụtụ ndị oyi ndụ egwu ebe ọtụrụ n’ime ha gbara ọsọ a ma gbochie ha iwere ọnọdụ obibi ebe ahụ.