Gịnị mere ụmụ Naịjirịa ji eme ngagharị iwe?

Ngagharịiwe megide ọtanisi nrị n'Ibadan
Nkọwa foto, N'izu gara aga, ngalaba na-elebanye anya na ndekọ bụ NBS n'ịchafụ kwuru na ọtanisi akawanyela njọ kemgbe afọ iri atọ gara aga site n'ọtanisi nri.
    • Onye dere ya, Nkechi Ogbonna
    • Ndị mere akụkọ a, BBC News, Lagos

Ngwa nri nkịtị adịla oke ọnụ nke mere na ndị mmadụ agaghịzi azụtanwu ya.

N'ụfọdụ ebe n'ala Naịjirịa, ndị mmadụ apụtala n'okporoụzọ igosi iwe ha maka etu ọnụ ahịa nri si agbago.

Ọtanisi na ihe isi ike bụ ihe ji mbaụwa niile mana na Naịjirịa, ọ kawanyela njọ maka gọọmentị iwepu ego 'subsidy' mmanụ agbịdị nakwa ọdịda naịra na-ada n'ebe ego ndị ofesi ndị ọzọ nọ.

Gịnị mere iwe ji ewe ụmụ Naịjirịa?

Agụụ bụ isi sekpụ ntị n'iwe na ngagharị iwe nke ndị mmadụ na-eme.

Na nso nso a, puku kwuru puku mmadụ gbapụtara n'okporoụzọ steeti ndị ugwu gụnyere Niger, Kano na Kogi nakwa Ibadan dị n'ọdịda anyanwụ Naịjirịa ịchọ ihe a ga-eme ọnọdụ obibi na-akawanye njọ.

Na Kano steeti, ebe ọnụ ahịa ụfọdụ nri nkịtị dịka osikapa, mileti nakwa ọka rịrị elu, ihe dịka mmadụ nde iri bi n'ụbịam, nke kachasị n'ala Naịjirịa niile.

N'izuụka gara aga, ngalaba na-ahụ maka ndekọ bụ NBS n'ịchafụ kwuru na ọtanisi nọzị na pasentị 29.9, nke kachasị n'ime afọ iri atọ nke si n'ọtanisi nrị nọzị na pasentị 35.4.

Ngagharịiwe megide ọtanisi nrị n'Ibadan

Kedụ etu ọnụ ahịa nri si rịa elu na Naịjirịa?

Ọnụ ahịa achịcha, ihe ọtụtụ ezinaụlọ ji eme nri ụtụtụ esirila na 500 naira ($0.33) gafee 1,500 ($0.87) n'ime naanị otu afọ.

Ngwa nri ndị ọzọ dịka akwa, azụ, anụ, osikapa na mmanụ ọkpa arịala oke elu nke ha.

Otu akpa osikapa bụ 50kg nọzị na 75,000 nke si na 35,000 rịa elu site n'ihe ọ bụbu n'otu afọ gara aga.

Otu jikọrọ ndị ọrụ Naịjirịa bụ NLC n'ịchafụ adọọla gọọmentị aka na ntị ha chọọ ihe ha ga-eme n'ime abalị iri na anọ, e wezụga nke a, ha ga-eme abụbụọrụ ka ibe ya n'ụbọchị 27 nakwa 28 ọnwa Febụwarị. Otu ahụ kwuru na ọnọdụ ahụ metụtakarịrị ndị ọrụ dịka ụgwọ opekatampe bụ puku naira iri atọ ($20) kwa ọnwa.

Ụlọakụ mwulite nke Afrịka bụ (AfDB) adọọla aka na ntị na Naịjirịa nakwa Itiopia, Angola na Kenya nwereike ịbanye ọnọdụ nsogbu na ọgbaghara maka ọnụ nri na mmanụ agbịdị na-arị elu.

Ngagharịiwe megide ọtanisi nrị n'Ibadan
Nkọwa foto, Ọnọdụ obibi nke ndị Naịjirịa na-akawanye njọ akarịala maka mwepu 'subsidy' nke mmanụ ụgbọala.

Kedụ ihe ndị mmadụ na-agbanwe

N'ụfọdụ ebe na mpaghara ugwu Naijirịa, ọtụtụ ndị mmadụ na-ewere ịhe a na-awụfu e wepụtara n'osikapa ka ha sịe ya dịka nrị.

Ịhe ahụ bụ osikapa nkwafu bụ ịhe e jị eme nri azụ, mana ọtụtụ jịzị ya egbọ mkpa agụụ.

Ọtụtụ ịhe onyonyo na soshal mịdịa na egọsị ebe ezịnaụlọ dị ịcheịche na eke nrị ka ọnwe ịke ịzu ha.

Ọnyọnyọ ọzọ na egọsị ebe otu nwanyị na ekewa otu azụ ụzọ ịtọọlụ ka ma ọ ga eke ya ụzọ anọ.

Ọ kọwara na nke a bu ka ezinaulo ya nwee ịke ịta azu.

Ngagharịiwe megide ọtanisi nrị n'Ibadan
Nkọwa foto, Otu dị icheiche jikọrọ ndị ọrụ akatọọla etu gọọmentị etiti si ekesa nri

Gịnị ka gọọmentị na-eme?

Osote onyeịsịala Naịjiria, Kashim Shettima kwuru na ha ehibela kọmitii ga-ahụ maka ọnụ ahịa ihe nrị.

Ndị Kọmịtị ahụ ga na-enyọcha ma na-ahazị ọnụ ahịa ịhe nri.

Gọọmentị etịtị nyekwara ịwụ ka ndị na-echekwa mkpụrụ akụ na Naịjirịa kesaa tọn 42,000 nke mkpuru ọka na mkpuru nrị ndị ọzọ dịka mịleti.

Nke a abụghị nke mbụ gọọmentị kwuru na ha na-ekesara ndị ogbenye na ndị na-adịghị ike enyemaka na Naịjirịa. Otu ọ dị, usoro nkesa nri ha na-enwetakarị nkatọ site n'aka ndị ọrụ na-arụ ọrụ bụ ndị na-ekwu na ọtụtụ n'ime nrị ahụ anaghị erute ezinaụlọ ndị kasị daa ogbenye nọ na mkpa.