You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Aba-Port Harcourt Express Way: Ihe mere ndị ọkwọ ụgbọala ji gbachie okporoụzọ a
Ndị ọgwọ ụgbọala ukwu dịka Tanka, gwongworo na ndị ọzọ emeela ngagharịiwe ma gbachie ụzọ awarawa si Aba gawa Pọtakọtụ kamgbe ihe dị ka otu izuụka.
Ha kwuru na isi iwe ha bụ maka ọndọdụ ọjọọ okporoụzọ ahụ, ọkachasị na mpaghara Aba gawa Pọtakọt bụ nke ha sị na-emebisi ụgbọala ha.
N’ihi ngagharịiwe a, ọtụtụ ndị na-eme njem n’okporoụzọ ahụ na-ata ahụhụ ugbua maka ụzọ agaghị aga.
Otu n’ime onye ọkwọụgbọala bụ Ikechukwu gwara BBC Igbo na “Ọ bụ n’ihi ụzọ adịghị mma mere anyị ji were ụgbọala anyị kwuchie ụzọ n’ime ngagharịiwe.
“ọkpọrọụzọ ọjọọ a emebichaala ụgbọala anyị ma gbuokwa ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala site n’ihe mberede okporoụzọ.
“Ihe ọzọ anyị ji na-eme ngagharịiwe bụ etu ndị ọrụ nchekaa ji ana anyị ego n’okporoụzọ a na-agbanyeghi na ọ dịghị mma.”
Onye ọkwọ ụgbọala ọzọ kwuru na ọnọdụ ha ka njo site n’iwu Gọọmentị Abia tinyere nke sị ka ndị ọkwọ ụgbọala Tanka abatala Aba ruo mgbe ọ kụrụ elekere iri nke abalị (10pm).
Ọ gara n’ihu kwuo na ndị ọrụ ọtawaike Gọọmentị na-ana ha ụtụisi n’aha Gọọmentị ruchaa ihe dị ka elekere iri na abụọ nke etiti abalị (12am)
Kamgbe ha bidoro ngagharịiwe a, BBC Igbo chọpụtara na ọ naghị izi adị mfe ime njem e si Aba gawa -Pọtakọt.
Ndị ọkwa ụgbọala a gbara isiakwara na ha agaghị emepe ụzọ a ma ọ bụrụ na Gọọmentị Abia Steeti abịaghị leba anya n'iwe ha.
BBC Igbo gbara mbọ ịkpọtụrụ kọmishọna mgbasaozi nke Abia Steetị bụ Eze Chikamnayo mana ọ zaghị ekwentị ya.
Kepukepu kwuru na Gọọmentị Abia Steeti gbasara ozi ozi n'igwe redio ma gwa ndị ọkwọ ụgbọala ndị a ka ha si n'okporoụzọ ahụ pụọ.