Agaghị m aza ụnụ hoohaa – Ka Speed Darlington gwara NAPTIP

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Darlington Okoye e ji Speed Darlington mara agwala ụlọọrụ NAPTIP ka ha wepụ aha ya n'ime aha ndị a na-achọ achọ maka mpụ n'ihi na o nweghị arụ ọbụla o mere.

Nwaamadị ahụ a maara dịka Akpị kwuru nke a n'ozi ọ gbasara n'akara ọbaozi Instagram ya n'ụbọchị Mọnde 30 Juun 2025.

O kwukwara na ya agaghị aza oku ndị NAPTIP kpọrọ ya n'ihi na o nweghị ndị nyere ha mkpesa na ya dinara ha n'ike.

"Agaghị m abịa. Ikwu okwu inyo abụghị arụ. Ụnụ chọrọ iji m gosi ndị nọ na soshal midịa na ụnụ na-arụ ọrụ," ka Akpị gwara NAPTIP.

O kwuru na ụlọọrụ NAPTIP ga-ebu ụzọ kwụọ ya nde naịra abụọ na ụma ise (N2.5m) ma kwụọrọ ya ụgwọ njem ụgbọelu tupu o nwee ike zaa oku ahụ.

Ọ sịrị na ịwụcha n'ụlọorụ NAPTIP bụ igbu oge ya n'ihi na enweghị ihe akaebe ụlọọrụ ahụ nwere megide ya.

Akpị jụrụ ndị ọrụ NAPTIP ma o nwere onye ha nụrụ ọ kpọrọ aha oge o mere onyonyoo ahụ ha na-ekwu okwu ya.

Ọ gbakwunyere na ụmụnwaanyị ndị ahụ tiri mkpu ka ụlọọrụ NAPTIP nwụchie ya bụ ndị "agadị nwaanyị" gaferela afọ iri abụọ na afọ iri atọ nakwa ụmụnwoke ndị enweghị akaọrụ.

Onye ọbụla hụrụ Speed Darlington 'akpị' jide ya maọbụ kpọtụru anyị - NAPTIP

Ụlọọrụ na-ebuagha megide ịtụ mgbere mmadụ na Naịjirịa bụ National Agency for the Prohibition of Trafficking Person (NAPTIP) enyela iwu na onye ọbụla hụrụ Darlington Okoye e ji Speed Darlington maara ka a nwụchie ya maka ebubo idina nwaanyị n'ike, mwakpo mmadụ n'ịntanetị na ihe ndị ọzọ.

NAPTIP kwuru nke a n'ozi ha wepụtara n'akara soshal midia n'ụbọchị Fraịde 27 Juun, 2025.

"Ụlọọrụ NAPTIP na-achọ Darlington Okoye e ji Speed Darlington maara maka ebubo idina nwaanyị n'ike, nakwa mwakpo n'ịntanetị.

"Onye ọbụla nwere ozi banyere ebe nwamadị a biko kpọtụru ụlọọrụ NAPTIP ngwa ngwa," ka ozi ahụ kwuru.

Nke a na-abịa dịka oti egwu a ma ama jụrụ ịga zaa ọtụtụ oku ụlọọrụ NAPTIP kpọrọ ya n'ihi ihe onyonyo fesara na soshal midia ebe o kwuru na o dinara nwata nwaanyị dị afọ iri na ise.

Speed Darlington wepụtara ihe onyonyo n'ụbọchị 27 Mee, 2025 nke butere nkatọ site n'ọnụ ọtụtụ ndị mmadụ na soshal midia.

N'ime otu ụbọchị ihe onyonyo ahụ pụtachara, gọọmentị Lagọs Steeti degaara ụlọọrụ NAPTIP mkpesa ka ha nyochaa okwu ahụ.

Ụlọọrụ a zigaara ya ozi site n'aka onyeisi ngalaba na-ahụ maka mpụ n'ịntanetị bụ Ngamaraju Mangzha ma sị ya bịa n'ụlọọrụ ha dị n'Abuja n'ụbọchị 30 nke ọnwa Mee

Na nzaghachị, Speed Darlington nabatara ozi ọkpụkpọ oku ahụ ma kwuo na ọ gaghị abịanwu n'ụbọchị ahụ kama na ọ ga-abịa n'ụbọchị 26 Juun.

N'azịza ahụ, o kwuru na o nweghi mgbe ọbụla o jiri dinaa nwata dị afọ iri na ise n'ike na ihe niile o kwuru n'onyonyo ahụ bụ ihe ịkpa amụ n'ịntanetị a kpọrọ 'content'.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ bụ nwafọ Naịjirịa na-erube isi n'iwu na-achị obodo.

Ụlọọrụ a jụrụ ma sie ọnwụ na ọ ga-abịarịrị n'ụbọchị ahụ na ha agaghị anabata ịgba ya ajụjụọnụ mgbe o si masị ya.

Dịka ụbọchị iri abụọ na isii nke ọnwa Juun bịachara ma gaa, Speed Darlington azaghị oku ahụ ụlọọrụ NAPTIP kpọrọ ya nke mere ha jiri achọ ya achọ ugbua.

Nsogbu ya a na-abịa n'ime ọnwa ise Speed Darlington ka si n'ụlọmkpọro pụta site na nwuchi a nwuchiri ya n'ọnwa Nọvemba 2024 maka ebubo o boron a otiegwu Burna Boy na ogbo ya nke mba Amerịka bụ P.Diddy na-edina onwe ha.