You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ihe mere m ji hapụ ụlọakwụkwọ 'Seminary' ma soro nzọmụkwụ nna m, Pericoma - Ebube Okoye (Diọkpara Pericoma)
Otiegwu ama ama ọkachasị n’ala Igbo bụ Pericoma hapụrụ nwa ya bụ Ebube Okoye ụkpụrụ na ụzọ ya dịka ọ na-esosi ụzọ ụkwụ ya n’ike n’ike.
Maazị Okoye kọwara BBC etu o si echepụta nakwa etipụta egwu ọ na-eti ugbua.
Ebube bụ diọkpara Pericoma bụrụkwa onye ọtụtụ ne-etọ maka etu o si akwado omenala Igbo.
O kwuru na nna ya bu ‘Saint’ maka etu o si bịe ndụ ya.
Ọ kọwara ihe mere o ji hapụ ụlọakwụkwọ ọzụzụ pụrụiche nke ụkọchụkwụ bụ "Seminary" ma lọghachịte na iso usoro nakwa okpukperechi nke omenala.
Onye bụ Pericoma?
Pericoma Okoye bụ onye am ama maka egwu ya nakwa etu o si kwadoo omenala Igbo nakwa okpukperechi ndị nnanna ya ha. Nke mere ụfọdụ ji gụọ ya “Arusi Makaja”.
O tinyere aka na-eme ka emume "Ikeji festival" dị ire n'Arondizuogu nke Imo steeti.
Ikeji emume iri ji a na-eme na mpaghara ahụ kwa afọ bido na ọnwa Maachị ruo ọnwa Eprel.
Ugbua, emume a abụrụla ihe na-adọtara steeti ahụ ọtụtụ ndị ọbịa nakwa na-akwalite akụnụba ha,.
Pericoma lara mmụọ n’afọ 2019.
Kirie ihe onyoonye a ka ịnụrụ ihe Ebube nwere ikwu maka nna ya nakwa ụzọ a ọ na-eso ugbua.
Ndị mere akụkọ a bụ Ebere Ekeopala na Chiemela Mgbeahuru.