Ọrịa ndị oke 'heat' na-ebute na etu ị ga-esi chekwa onwe gị

Ụbọchị dị ọkụ, ọ bụ eziokwu.

Nke a bụ maka na ụgụrụ gachaa, a banye oge ọkọchị. 

Mana ọ dị zi ka ọkọchị nke ugbua a ka njọ dịka igwe na-ezi ozi maka ihu igwe bụ Google weather si gosi.

O dobeghi anya ihe kpatara nke a dịka ụfọdụ na-atụ aka na mgbanwe ihu igwe dịka ihe butere ya.

N'agbanyeghị nke a, ngalaba ahụike mbaụwa niile bụ WHO n'ịchafụ ekwuola ihe ndị ị ga-eme iji gbalahụ ọrịa maọbụ mmerụ ahụ n'oke "heat"

Lee ha ebe a:

 - Gaa n'akụkụ kacha ju oyi n'ụlọ gị 

- Nọrọ n'ime ụlọ mgbe ụbọchị kacha dị ọkụ 

- E mena ihe ga-emekpa gị ahụ dịka ịgba ọsọ, ị chọọ ime nke a, mee ya n'ụzụ ụtụtụ tupu anwụ achawa. 

- Gbaa mbọ nọrọ na ndo ma ị pụọ n'ezi. 

- Ahapụna ụmụaka maọbụ ụmụ anụmanụ n'ime ụgbọala kwụ akwụ. 

-Ṅụọ mmiri mgbe niile ma gbahapụ mmanya ndị nwere oke suga na mmanya ike. 

- Saa ahụ gị ihe ruru ugboro atọ kwa ụbọchị. 

- Yiri uwe agaghị ekekpa gị ahụ. 

Lee ọrịa ndị so oge mkpomọkụ apụta

Ngalaba na-elekọta ngụ na mba Amerịka dọrọ aka na ntị maka ụfọdụ ọrịa ndị nwereike iso oge ọkọchị pụta. 

Ndị ha kpọrọ gụnyere - 

- Asthma bụ ọrịa nkubi 

- Ọrịa ngụ bụ COPD

WHO kwuru na oke mkpomọkụ nwereike ibute 

- Ajụ ibu mmadụ 

- Ụkọ mmiri n'ime ahụ 

- Isi ọwụwa 

- Ọkọ ịwụ mmadụ 

- Ike ọgwụgwụ