Ọ gịnị na-esere ndị obodo Amechi/Obeagu na gọọmentị Enugu steeti?

Ọgbaghara dapụtara n’akụkụ mpaghara Centenary Estate dị n’ime obodo Amechi/Obeagu n’ụbọchị Wenezde. Nke a na-abịa dịka ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ mmepe obodo bu ụgbọala e ji akwatụ ụlọ ma kpọrọ ọtụtụ ndị uweojii wụchie na mpaghara ahụ.
Ụlọọrụ ọrụ Enugu Capital Territory Development Authourity (ECTDA) kọwara na ha natara ikike n’aka ụlọikpe n’izu gara aga ịmalite kwatuwe ụlọ ndị nọ na mpaghara ahụ mana ya bụ okwu kpatara ọtụtụ ọgbaghara dịka ndị obodo ahụ kwuchiri ụzọ na-eme ngagharịiwe ma gbaa isi akwara na agaghị akwatu ụlọ ọbụla ebe ahụ.
Ndị obodo ahụ buuru akwụkwọ asambodo dị icheiche na-adọ gọómenti Enugwu aka na ntị ka ọ ghara íkwatu ụlọ ọbụla ebe ahụ dịka ha kwuru na ha agaghị adị ndụ mmadụ nara ha ala nna ha.
Ya bụ ngagharịiwe malitere ebe ahụ n’ụbọchị Tuzde dịka ndị obodo ahụ nụrụ ozi ọbịbịa ndị gọọmentịụ.
End of Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị

Ndị uweojii gbaliiri ebe elu aghara aghara were chụsaa ndị ahụ pụtara ime ngagharịiwe ma gbakwa gaasị mmiri anya ebe ahụ.
Igwe ndị Obeagu Awkunanaw bụ Igwe Mile Nnukwu bụ onyendu ndị obodo Obeagu boro Gọọmenti Enugu ebubo na ọ chọrọ iji nkarị nara ha ala obodo ha.
Mana ozi gọọmentị sara ebubo niile eboro ha ma kwuo na ha jị ikike ụlọikpe ukwu Enugu nyere ha nke akara ya bụ No E/1061/2019 were bịa ịkwatu ụlọ ndị ahụ dịka ya bụ akwụkwọ nyere gọọmentị ikike iwere ala ruru hektas 1087 ebe ahụ bụ nke ha kwuru na ha na ndị ụlọọrụ na-arụ ụlọ ebe ahụ (Private Estates International West Africa Limited) nwere nkwekọrịta maka ya.
Ozi a nke onyeisi ụlọọrụ EDTDA bụ Josef Umunnakwe Onoh wepụtara kwukwara na ha enyela ndị na-arụ ụlọ ebe ahụ ọtụtụ ozi ịdọ aka na ntị ugboro ugboro kemgbe afọ 2021 ma gwakwa ha n’otu izuụka gara aga ka ha kwakọrọ pụọ.

Mana gịnị bụ iwe ndị obodo a kpọm kwem?
Otu onye ụlọ ya so na nke mbụ a chọrọ ikwatu ebe ahụ bụ Nnaji Sunday White, kwechiri sị na ya bụ ụgbọala agaghị akwatu ụlọ ya ka ya dị ndụ.
Mazị Nnaji Sunday gwara BBC Igbo na ebe ahụ bụ ala nna ya nke mere ma ya agaghị agba ọsọ ọbụla. Ọ gara n’ihu gosi akwụkwọ niile o jiri kwụọ ugwu ala ya ma nata ikike ịrụ ụlọ tupu omalite rụwa ụlọ ya.
Ọtụtụ ndị nwee ụlọ ebe ahụ ndị na-abụghị ndị obodo ahụ jichakwa akwụkwọ ụlọ ha pụta were na-ekwu na gọọmenti chọrọ ịbịa nara ha ala ha n'aka ike.
Ọtụtụ na ime ha gwakwara onye ntaakụkọ anyị ebe ahụ na-enweghidị ihe iti aka n’obi maọbụ ohere ihaziri ha ala ọzọ gọọmentị nyere.










