Ihe mere o ji dịka otu Ohaneze Ndigbo a na-ekwu okwu ire abụọ

Otu Ohaneze Ndigbo ekwuola na ọ bụghị ha kelere Bola Ahmed Tinubu dịka a kpọpụtara aha ya ka onye meriri ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa e mere n'ụbọchị 25 nke ọnwa Febrụwarị 2023.

Alex Ogbonnia, bụ ọnụ na-ekwuru otu Ohaneze Ndigbo, kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC Igbo dịka akụkọ pụtara na otu Ohaneze Ndigbo kelere Tinubu maka mmeri ya ma kpọkwaa oku ka o cheta ndị Igbo n'ọchịchị ya.

Ogbonnia kwuru na onye wepụtara akwụkwọ ozi ekele ahụ, bụ Okechukwu Isiguzoro, abụghị onye ndu n'otu Ohaneze Nadigbo kama ọ bụ onye na-enupu isi.

Ọ gara n'ihu kwuo na otu Ohaneze ndị Igbo nke George Obiozor lara mmụọ bubu onyeisi ya kwụsị ike n'azụ Peter Obi bụ onye ji aha otu 'Labour Pati' zọọ ọkwa Onyeisiala.

Ogbonnia kwuru na "otu Ohaneze Ndigbo agaghị akpọ Bola Tinubu onyeisiala a họpụtara ọhụrụ ruo mgbe ụlọikpe kpebiri ya bụ okwu dịka Peter Obi wegarala okwu ahụ n'ụlọikpe ma na-ekwu na ọ bụ ya meriri ntuliaka ahụ".

Gbasara nkewa dị n'otu Ohaneze Ndigbo, nke mere o ji dịka otu ahụ eji ọnụ abụọ ekwu okwu, Ogbonnia sị na ọ bụ n'ihi nnupu isi ụfọdụ ndị otu ahụ, mana ụlọikpe enyela iwu ndị ahụ kwụsị ịkpọ onwe ha ndị isi otu Ohaneze mana ha achọbeghị ịkwụsị.

Ohaneze Ndigbo ọ dịzị abụọ?

N'aka nke ọzọ, Mazi Okechukwu Isiguzoro, onye kwuru na ya bụ odeakwụkwọ na mpakala Ohaneze Ndigbo ọzọ nke onyeisi ya bụ Chidi Ibe, gwara BBC Igbo na ọ bụ ha kelere Tinubu n'aha ndị Ohaneze.

Isiguzoro kọwara na ihe mere ha ji mee otu ahụ bụ maka na ha achọghị ka ihe mere n'afọ 2015 oge Buhari bụụrụ onyeisiala Naịjirịa mekwa ọzọ ebe ọ dịka ndị Igbo enwetaghị ụfọdụ ọkwa gbalitere agbalite n'ọchịchị ya.

O kwuru sị: "Anyị na-akwado Peter Obi ka ọ gawa ụlọikpe, mana anyị achọghị itinye akwa anyị niile n'otu ekete, ọ bụ ya mere anyị ji kelekwaa onye nke a kpọpụtarala aha ya dịka onye nwetara mmeri, ma rịọkwaa ya ka o cheta ndị Igbo n'ọchịchị ya."

Isiguzoro kwuru na otu Ohaneze nke ha nwere nkwado ọtụtụ ndị gọvanọ na mpaghara ọwụwụwa anyanwụ bụ ndị na-enye ha nkwado.