Ka ikpe Nnamdi Kanu si gaa n'ụlọikpe n'abalị 14 nke ọnwa Novemba, afọ 2022

Ụlọikpe Ukwu nke Etiti dị n'Abuja ehigharịala ikpe Nnamdi Kanu ọzọ taa bụ ụbọchị Monde, abalị 14 nke ọnwa Nọvemba, 2022.

Kanu abịaghị n'ụlọikpe taa maka ikpe ya, mana otu n'ime ndị ọkaiwu ya bụ Mike Ozekhome, gwara ụlọikpe na mgbagha mkpebi nke Ụlọikpe Mkpegharị nyere Kanu ka dị n'ụlọikpe Kachasị.

Ọ rịọrọ ka e higharịa ya rue mgbe a ga-amata mpụtara ihe Ụlọikpe Kachasị kwuru.

Ọkaiwu nke Gọọmentị Etiti bụ Mohammed Abubakar, kwetara n'arịrịọ a.

Na mkpebi ya, ọkaikpe nọ n'isi ikpe ahụ bụ Jọstis Binta Nyako nyere ntuziaka ka ebugharịa ikpe ahụ rue oge a ga-ekpebi mgbagha nke e kpebiburu.

Ọkaiwu Kanu bụ ifeanyị Ejiofor, kwuru na Nyako kwuru na ya enweghị ikike ikpe ihe ọzọ n'ikpe Kanu.

N'okwu ebubo ọhụrụ nke Gọọmentị Etiti wetakwara megide Kanu n'ụlọikpe, Ozekhome kwuru na e nyebeghị ya ozi banyere nke ahụ.

"Ọ sịrị, "E nyebeghị anyị akwụkwọ ebubo ọhụrụ ahụ, anyị gụrụ ya na soshal midia."

Ozekhome, onye kwuru "Ọ bụ mgbe anyị bịara n'ụlọikpe ka anyị hụrụ na e denyere ya n'ebubo ndị a na-ebo."

Ihe a na-atụ anya n'ikpe Nnamdi Kanu taa

Taa n'' Ụlọikpe Etiti dị n'Abuja ka a nụ okwu n'ikpe megidere Nnamdi Kanu , onye ndu otu nwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenious People of Biafra (Ipob) nke Gọọmentị Etiti wetara.

Jọstịs Binta Nyako tinyere ikpe ahụ nke ndị ọkaiwu Gọọmentị Etiti gbanwere ebobo a na-ebo ya ma tinye ebubo asaa ọhụrụ, taa bụ abalị 14 nke ọnwa Novemba afọ 2022.

Gọọmentị Etiti chọrọ ka a malitegharịa ikpe banyere Kanu na-agbanyeghị mkpebi ụlọikpe nyere n'abalị Oktoba 13 afọ 2022 nke gbadoro ụkwụ n'etu e si tọọrọ ya na Kenya were kagbuo ebubo nile eboro ya.

N'akwụkwọ ikpe ahụ nke bukwa ụfọdụ ebubo gọọmentị boburu Kanu, ha na-ebo ya Kanu nyere iwu site n'ozi ọ gbasara n'ikuku na Naijiria nile si na onye ọbụla edoweghị iwu nọrọnụlọ dee akwụkwọ ozi okike ihe o nwere na ndụ.

Ha kwuru na ozi ahụ ọ gbasara mere ka ụlọakwụkwọ, ọdọahịa, ụlọakụ mechie ọrụ na steeti dịga n'ọwụị̀a Anyanwụ , ọbụladị na enweghị ngagharị ụgbọala na ndị mmadụ.

Ebubọ ọzọ bụ na nagbata afọ 2018 na 2019 na Kanu gbasara ozi kpọọ oku ka e gbusịsịwa ndị ọrụ nchekwa na ndị ezinaụlọ ha nke megidere iwu machiri iyi ndụ egwu na Naijiria nke afọ 2013.

Ha bokwara ebubo na Kanu kpokuru ndị mmadụ si ka rụwa ogbuigwe.

Gọọmentị bokwara ya ebubo ịtụbatara nwa e ji agbsaozi n'redio ma kpoo oku ka ndị mmadụ

A na-atụ anya n'ikpe ahụ nke akara ya bụ FHC/ABJ/CR/383/2015A na ndị ọkaiwu gọọmentị na nke nnamdi Kanu ga-agwa ụlọikpe okwu banyere ikpe ahụ na-aga n'ihu ugbua.

Cheta...

Cheta na Gọọmentị Naijiria nwụchiri Nnamdi Kanu, onyendu otu nwere onwe Biafra a kpọrọ Ipob, n'ọnwa Juun 2021 na mba Kenya, kpụlata ya ma kpụpụ ya ụlọikpe maka ebubo metụtara iyi ndụ egwu nakwa ịkpa nkata ịkwatu Gọọmentị.

Mana n'abalị 13 nke ọnwa Oktoba, Ụlọikpe Mkpegharị gbadoro ụkwụ n'etu e zi tkpọlata ya, nke ụlọikpe ahụ kwuru megidere iwu Naijiria na nke mba ụwa, nye iwu ka a tọhapụ ya, si n'ikpe amaghị ya.

Gọọmentị Etiti anabataghị mpebi ahụ nke mere ka ha gbagharịakwụkwọ n'Ụlọikpe Kachasị.

Ndị ọkaiwu gbadoro ụkwụ na Kanu nwere ikpe dị iche iche n'ụlọikpe dị iche iche nke gụnyere ikpe a na-ekpebu ya tupu ọ gbapụ na Naijiria n'afọ 2017.

Onye budị Nnamdi Kanu?

Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu na-achọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigenous People of Biafra (Ipob) bụ otu Kanu hiwere n'afọ 2012.

Ndị uweojii nzuzo Naijiria bụ Department of State Services (DSS) na Bekee nwuchiri ya mbụ n'Ọktoba 19, 2015.

A kpụpụrụ ya ụlọikpe na Nọvemba 18, afọ 2015.

Na Septemba afọ 2017, ọ gbafuru n'ụlọ nna ya dị n'Afara Ukwu, Umuahia oge ndị agha wakporo be ya.

E mechara hụ ya mbụ ọzọ na mba Izrel dịka foto ya gbara na mba na soshal midia.

N'afọ 2018, Gọọmentị Naịjiria nke Muhammadu Buhari bụ onyeisi ha, kpọrọ Ipob "ndị oyi ndụ egwu".