Ụlọikpe atụnyela mmadụ ise na nga maka ebubo ịgba ajadu ọtọ n'ihi ịkpa ejula n'ọhịa arụsị

Ụlọikpe majie dị n’Enugwu enyela iwu ka e jichie na mkpọrọ mmadụ ise aka ha dị n’iti ajadu nwaanyị ihe, gbaa ya ọtọ maka ịtụtụ ejula n’ọhịa arụsị n’obodo Agụnese, Mmakụ dị n’okpuru Ọchịchị Ọgwụ, rue abalị iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ 2023 bụ oge Ọkaikpe ukwu ga-enye ntuziaka banyere ikpe ahụ.

N'abalị iri na otu nke ọnwa Novemba afọ 2022, a kpụrụ mmadụ ise ; Jonathan Nwangene, gbara afọ; Maduabuchi Madueke gbara afọ 34; Obioma Nwangene gbara 39 ; Anikene Samuel gbara afọ 24 na Chukwuebuka Agu gbara 32 n'ụlọikpe maka ebubo ise metụtara ebubo ịkpa nkata imerụ mmadụ nnukwu ahụ,ise akaje ahụ onyonyo ma tinye ya na soshal midia dịka o si megide Iwu mpụ intanet nke afọ 2015.

O doghị anya ihe mere ndị uweojii ji tọhapụ otu onye n'ime mmadụ isii ahụ ndị ahụ ha nwụchibụrụ maka imekpa nwaanyị ajadu ahụ bụ Stanley Okoro ma mee ya onye akaebe n'ikpe ahụ.

N’ikpe ahụ nke ụlọọrụ ‘Women Aid Collective’ (Wacol) na ndị ọkaiwu Tamar/ SARC na-akwado ajadụ nwaanyị ahụ, onyeisi ụlọọrụ Wacol bụ Ọkaiwu Joy Ezeilo kwuru na Wacol ga-ahụ isi ikpe ahu rue na njedebe, iji hụ na ọ bụ ihe ịdọ aka na ntị ya ndị na-ada iwu eleghị anya n'azụ.

Cheta na izu ole na ole gara aga, ndị ntorobia ji nwaọgụ wakporo otu ajadu n'ụlọ ya, tie ya ihe ma gba ọtọ ma kenye ya ọmụ n'olu nakwa nukwu n'ebubo na nwaanyị ahụ ji iịkpa ejula azụ ụmụanọ dị ya hapụrụ ya were nwụọ afọ 13 gara aga kpara ejụla n'ọhịa arụsị obodo ha.

Ndị uweojii agbaala ụmụnwoke isii n'anwụ maka ịgba nwaanyị ọtọ n'Enugwu Steetị

Ndị uweojii Enugwu Steetị agbaala ụmụnwoke isii n’anwụ bụ ndị ha nwuchiri maka ịgba otu nwaanyị ọtọ ma kpọgharịa ya n’obodo Agunese, Afam-Mmaku dị n’okpuruọchịchị Awgu,n'ihi ebubo ịkpa eju n’ebe ha sị bụ ajọ ọhịa.

Nyocha ndị uweojii gosiri na ndị a tikwara di nwaanyị a na nwanne ya nwoke ihe ma merụọ ha ahụ oge ha bịara ịkpọrọ ya n’ụlọ ya ma ha chọrọ igbochi ha.

Ụfọdụ ndị a gụnyere; Okoro Stan dị afọ iri anọ na isii bụ onye ndu ndị kpara arụ a, Jonathan Nwangene dị afọ iri anọ na atọ, Maduabuchi Madueke dị afọ iri atọ na anọ.

Ndị ọzọ bụ Obioma Nwangene dị afọ iri atọ na itoolu, Anikene Samuel dị afọ iri abụọ na anọ nakwa Chukwuebuka Agu dị afọ iri atọ na abụọ.

Kọmishọna ndị uweojii bụ Ahmed Ammani enyela iwu ka e mee nnyocha tara ọchịchị ngwangwa banyere agwa a kpasịrị nwaanyị a.

Onye na-azọtara ikike dịirị onwe gwara ndị uweojii na ụmụnwoke wakporo nwaanyị a maka ebubo na ọ gara nta eju n'ọhịa obodo ahụ na-asọ nsọ.

Akụkọ na-ekwu na ihe ruru ụmụ nwoke iri wakporo ụlo nwaanyị a ebe ya na ụmụ ya anọ na nne ya kara nkla bi.

Ha mechara gbaa nwaanyị a ọtọ ma mee ka ọ gbara ọtọ gazụọ obodo ahụ dịka ha ji osisi eti ya ihe.

E mechara zọpụta nwaanyị ajadu a, ma kpọga ya ụlọọgwụ kama akụkọ na-ekwu na ihe etiri nwaanyị mere ka ọ daa ọrịa.

Nwaanyị bụkwa onye obodo Agunese Affam- Mmaku.

Ihe BBC Igbo ma maka ya bụ okwu

Ihe onyonyo na-efegharị nke BBC Igbo hụrụ anya gosiri ebe ọtụtụ ụmụ nwoke gbara otu nwaanyị ọtọ ma kee ya ọmụ n'ukwu.

Akụkọ so ihe onyonyo ahụ na-ekwu na ọ bụ n'ihi na nwaanyị ahụ bụ onye ajadu gara kpakọta eju n'akụkụ ebe arụsị obodo ahụ dị ka e ji mee ya ụdị akaja ahụ.

Ya bụ ihe mere n'obodo Affam-Mmaku dị n'okpuruọchịchị Awgu n'Enugwu steeti.

A na-eche na nwaanyị ajadu ahụ gara ịkpa eju ọ ga-ere were zụọ ezinaụlọ ya mgbe nke a mere n'ụbọchị Satọde.

Wacol agbatarala nwaanyị ahụ ọsọ enyemaka

Otu a kpọrọ 'Women's Aid Collective' (Wacol) agbatarala nwaanyị ahụ ọsọ enyemaka dịka otu onye otu ahụ si gwa BBC Igbo.

"Anyị kpọgara nwaanyị a n'ụlọọgwụ St Anne dị n'Awgu ebe a nọrọ nye ya ọgwụgwọ maka ihe ụmụokorobịa ahụ tiri ya," onye otu Wacol kwuru.

"Ka ọ dị ugbua, nwaanyị ahụ achọbeghị ikwuru onye ọbụla okwu n'ihi na obi ịda mba ka ji ya maka ihe ahụ merenụ."

Dịka ndị Wacol si kwuo, nwaanyị ahụ kwuru na ọbụghị n'ọhịa arụsị ka nwaanyị ahụ ka ya tụtụtara eju ndị ahụ.

Wacol kwuru sị: "Nwaanyị ahụ gwara anyị na ya zụtara eju ahụ azụta, maka na ọ bụ ahịa ya na-azụ kwa mgbe kwa mgbe."

"Mana dịka o buzi eju ahụ na nkata na-apụta, ụfọdụ ụmụokorobịa jidere ya ma bo ya ebubo na ọ banyere n'ọhịa arụsị ha ga kpata ejula, ma malite iti ya ihe."

Gọọmentị etinyela ọnụ n'okwu a

Onyeisioche okpuruọchịchị Awgu bụ Okwudili Nwankwo apụtala katọọ ihe ahụ mere nwaanyị ahụ ma kwuo na ekwesighi ime mmadụ ụdịrị ihe ahụ.

O zigara ezinaụlọ nwaanyị ahụ ozi itiakanobi maka ihe mere nwanne ha ma kwee ha nkwa na ọ ga-enweta ikpe nkwụmọtọ.

N'ozi o wepụtara, Nwankwo kwuru na ụlọọrụ ya na ndị ọrụ nchekwa ejikọọla aka malite nnyocha banyere ihe ahụ mere.

Ọ sịkwa na ejidela ụfọdụ ndị so megbuo nwaanyị ahụ maka ịkpakọ eju n'alụsị obodo ahụ.

"Gịnị mere ndị obodo ahụ ji alụrụ alụsị ọgụ kama ịhapụ ya ka ọ lụọrọ onwe ya ọgụ" ka Nwankwo jụrụ n'ime ozi ahụ.