You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Etu mmemme iri ji si ghọrọ nkwafu ọbara na Nibo, Anambra steeti
Ndị uweojii Anambra steeti amalitela nyocha banyere mwakpo mere n'ụbọchị Sunde na Nibo dị na steeti ahụ ebe ndị amaghị ndị ha bụ gbagburu ụfọdụ mmadụ.
N'ozi ndị uweojii steeti ahụ weputara ha kwuru na ọ bụ mmadụ ise nwụrụ na ya bụ ihe dịka mmadụ atọ na-anata ọgwụgwọ.
Ozi ahụ kpọkwara oku ka ndị hụrụ ebe ihe ahụ mere bịa kpesara ndị uweojii iji nyere ha aka nyochapụta nke mere n'ezie.
Akụkọ na-ekwu na ọ bụ mgbe a na-eme mmemme ndị obodo ahụ kpọrọ "ọnwa asaa" n'ehihie ụbọchị Sunde ka nke a mere.
Otu onye dere n'akara Facebook ya sị "Ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ bakwutere obodo m nwere udo ma memila ihe ruru ụmụ nwoke iri mgbe anyị na-eme mmemme anyị".
O dobeghi anya ezi ọnụọgụgụ ndị nwụrụ n'ọdachị ahụ dịka akụkọ ọzọ pụtara n'ụtụtụ Monde na-ekwu na ndị nwụrụ e ruola mmadụ 16 n'agbanyeghi ihe ndị uweojii kwuru.