You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
AFCON 2025 tebụlụ: Etu mba na mba ga-esi ezute onwe ha n'asọmpi a
Asọmpi Iko Mba Afrịka ebirila ọkụ malite n'ụbọchị 21 Disemba 2025 ruo ụbọchị 18 Jenụwarị 2026 na mba Moroko.
Moroko bụ ndị a na-agba asọmpi a na mba ha adịla mbụ were ọkpụ goolu abụọ chara acha merie Kọmọrọs na-agbanyeghi ọgba bọọlụ ha bụ Achraf Hakimi ka si na mmerụ ahụ na-alọta.
Mba ndị ọzọ dịka Senegal, Ivory Coast bụ ndị ji iko a ugbua na Naịjirịa nke onyendu ha bụ Victor Osimhen so na ndị a na-atụ anya ga-akpa ike n'asọmpi Afcon nke afọ a.
Asọmpi nke afọ a kwesịburu ịbịa n'etiti afọ mana achọghị ka ya na asọmpi ndị ọzọ a na-agba na mba Yurope sọkata isi.
Nke a mere e ji buru ya bịa n'ọnwa Disemba ka ohere dị maka asọmpi Ikom Mbaụwa FIFA a ga-agba n'ọnwa Juun.
Nke a bụ mbụ a na-agba Afcon n'oge dị etu a n'afọ. Obodo ebe ndị a ga-agba asọmpi a gụnyere Rabat, Kasablaca, Marrakech, Agadir, Tangier na Fez.