Ndị ọgba bọọlụ isii a na-ele anya ga-amụke ka ọkụ n'Afcon 2025

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 5

Asọmpi Africa Cup of Nations agba nke iri atọ na ise ya ga-amalite na mba Moroko n'ụbọchị Sọnde 21 Disemba, 2025 ruo Sọnde 18 Jenụwarị, 2026.

Mba Moroko na-atụ anya ibute iko ọzọ kemgbe afọ 1976 bụ oge ikpeazụ ha butere ya ebe Mohamed Salah na-atụkwa anya na ya na mba Ijipt ga-ebute iko ọzọ kemgbe afọ 2010 ha butere ikpeazụ.

E nwere ọtụtụ ndị bọọlụ a ma ama mana BBC Sport Afrịka lebanyere anya na mmadụ isii a.

Azzedine Ounahi (ọgba etiti, Moroko)

Dịka a na-ekwu na onye ndu ha nakwa onye bụ tuuru ugo dịka onye kacha agba bọọlụ n'Afrịka bụ Achraf Hakimi na-agba mbọ ịdị njikere maka asọmpi a, mba Moroko na-achọ onye ọzọ ga-enye ha olileanya

Brahim Diaz na-agbara Real Madrid bọọlụ nyere goolu asaa n'asọmpi iji tozuo maka isonnye n'Afcon 2025, mana ọ bụ Azzedine Ounahi na-agba etiti ka a na-ekwu na ọ ga-achawa n'asọmpi a.

Onye nwetere ozuzu na Mohammed VI Academy, Ounahi tara ahụhụ na Marseille oge ọ gara ebe ahụ ka a gbachara asọmpi iko mbaụwa na 2022.

Nwaamdị a gbara afọ 25 bụ onye kwụ n'ọkụ ugbua kemgbe ọ gara Girona n'ọnwa Ọgọst.

Moroko ga-ezute Komoros, Mali na Zambịa n'otu A. Ha bụ ndị isi kara aka tinyere na ochee goolu ha bụ Yassine Bonou na Youssef En-Nesyri kwụkwara n'ọkụ - mana ọ bụ Ounahi ga-achawapụ ma ọ bụrụ na Hakimi agaghị esonye n'asọmpi a?

Mohamed Amoura (onyee goolu, Ọljirịa)

Ọ bụ kachasị nye goolu n'asọmpi iji tozuo maka asọmpi iko mba ụwa.

Amoura na-agbara Wolfsburg bọọlụ enyela goolu 11 n'asọmpi 8 ọ sọọrọ Ọljirịa kemgbe ọnwa Maachi nke gụnyere goolu o nyere oge ha zutere Mozambik.

Nke a mere ka a na-ahụta ya dịka a kwaa akwụrụ mba Ọljirịa.

Riyad Mahrez bụkwa onye ọzọ kara aka n'Ọljirịa tinyekwara ezi nghọta dị n'etiti ya na Amoura.

Ọljirịa ga-ezute Sudan, Bokịna Faso na Ekwitorịal Gini n'otu E.

Victor Osimhem (onyee goolu, Naịjirịa)

Nwaamadị na-agbara otu egwu bọọlụ Galatasaray bọọlụ bụ onye a ma ama ma bụrụ onye e kwuru na ọ ga-enyere Naịjirịa aka n'asọmpi a nke ukwuu.

Super Eagles Naịjirịa bụ naanị akara anọ ka ha nwetara oge nwaamdị dị afọ 26 na-anọghị na asọmpi ha ụfọdụ.

Osimhen dị oke mkpa nye onye nkụzi Eric Chelle. DR Kongo meriri Naịjirịa maka na e wepụrụ ya n'asọmpi ahụ ha sọrọ n'ọnwa Nọvemba.

Naịjirịa butere ikop Afcon ugboro atọ n'oge gara, ga-azute Tanzanịa n'asọmpi mbụ ha tupu ha ezute Yuganda na Tunisịa n'otu C.

Ibrahim Mbaye (Onyee goolu, Senegal)

Sadio Mane bụ ọkaibe n'otu egwu bọọlụ a meriri n'asọmpi Afcon afọ 2021, ebe Iliman Ndiaye na Ismaila Sarr na-agba asọmpi EPL bụ mmadụ abụọ nyeere ha aka nweta ọtụtụ goolu.

Mana ihe nwereike ịgbanwe maka na nwatakịrị a bụ Ibrahim Mbaye na-akpa ike dị egwu dịka Senịgal ga-ezute Bọtswana, DR Kongo na Benin n'otu D.

Ọ gbaara otu ntorobịa mba Frans bọọlụ n'oge gara aga ma bụrụ onye na-esgi ike ya n'otu ehwu bọọlụ Paris St-Germain dịka ọ malitere asọmpi ha na Barcelona.

Oge mbụ Mbaye gbaara Senịgal bọọlụ bụ oge ha zutere Brazil n'ọnwa gara aga.

Rogers Mato (onyee goolu, Yuganda)

Ndị a maara dịka 'The Cranes' alaghachitela n'Afcon ọzọ kemgbe afọ 2019 oge a gbapụrụ ha n'agba nke abụọ asọmpi ahụ, dịka ha na-akwado ịchịkọba asọmpi ahụ na 2027.

Otu egwu bọọlụ a nke Paul Put bụ onye nkụzi ha, gbara ndị nke abụọ n'asọmpi iji tozuo maka asọmpi iko mbaụwa ebe ọ bụ Rogers Mato kacha nyere ha goolu.

Nwaamadị a gbara afọ 22 nyere goolu abụọ oge ha meriri mba Mozambik na Septemba ma bụrụ onye na-apụ ọkụ n'otu egwu bọọlụ Vadar nke mba Masedonịa.

Yuganda ga-ezute, Naịjirịa, Tunisia na Tanzanịa n'otu C..

Ha nwere olileanya na Mato ga-enyere ha aka ruo agba nke abụọ n'asọmpi a.

Reinildo (onye na-agba azụ, Mozambik)

Mozambik na-eme njem mpaghara ugwu Afrịka n'agbanyeghị na ha erubeghị agba nke abụọ n'ugboro ise ha gbara asọmpi Afcon.

Mana nke a bụ oge mbụ ha nwere onye na-agba bọọlụ na Premier League mba Ịngland. Reinildo bụ onye mba Mozambik mbụ na-agba asọmpi EPL dịka o hapụrụ Atletico Madrid banye otu egwu bọọlụ Sunderland na Julaị.

Nwaamadị ahụ gbara afọ 31 enyerela aka kwalite Sunderland nke mere Tico Tico jiri kọwaa ya dịka a kwaa ọ kwụrụ nke otu egwu bọọlụ ahụ.

Tico Tico gwara BBC na ọ bụ onye nchịkọta na nhazi doro anya nke bụ ihe na-enyere otu egwu bọọlụ ọbụla aka.

Mozambik na mba Ivori Kost, Kamerun na Gabọn nọ n'otu F.