You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
2023 Nigeria Elections: Ikpe udo, nchekwa, ndị ntorobia na ihe ndị cheere Onyeisiala ọhụrụ aka mgba
- Onye dere ya, Uche Akolisa
- Ndị mere akụkọ a, Senior Journalist
Dịka Bola Ahmed Tinubu nke pati 'All Progressives Congress' banye n'oche dịka Onyeisiala Naijiria n'obi Gọọmentị Etiti bụ 'Aso Rock' dị n'Abuja, n'ụbọchị 29 nke ọnwa Mee, afọ a, ya bụ ije abụghị ụtaba achị n'aka agba egwu n'ihi n'ọtụtụ ihe cheere onyeisiala ọhụrụ aka mgba n'oge a Naijiria nọ na nnukwu nsogbu.
Lee ọrụ ụfọdụ ndị ọkachamara n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Dkta Dennis Ekemeize na Ọkammụta Okey Ikechukwu kwuru a na-atụ anya ga-wasịsị Tinubu ọgọdọ n'ukwu n'ọrụ onyeisiala:
1. Ikpe udo
Obi adịghị ndị mmadụ mma dịka ntuliaka si gaa.
Ndị zọrọ ọkwa ahụ mana o ruteghị ha aka, na ndị na-akwado ha, anaghị achị ọchị.
Ọ bụ ọrụ dịịrị onyeisiala na-abata 'ịchịkọta onye ọbụla dịka otu obodo," otụ onye ma ihe ekwe na-akụ n'okwu ndọrọndọrọ ọchịchị bụ Dennis Ekemezie gwara BBC Igbo.
Ekemezie kwuru sị: " Ọ (Onyeisiala ọhụrụ) ga-ebidogodi n'ihe a kpọrọ 'National Reconciliation', ụdị nke Bishop Desmond Tutu nke South Africa na "Oputa Panel', iji leta ma gwọọ ọnya nke nkewa dị na Naijiria. ma kpalitekwa ụmụ Naijiria ịhụ na Naijiria bụ nke anyị niile."
"Ka e nwee ọgbakọ ụmụ Naijiria maọbụ bọlite akwụkwọ ọgbakọ ọha Naijiria (National Conference) nke e mere n'oge nke Goodluck Jonathan maọbụ nke Jọstis Oputa mere, a na-akpọ 'Oputa Panel'."
2. Ikwalite Akụnaụba
E jighị Igbo agwa ya onye ọcha na obodo bụ igwe ugbua na Naijiria.
Ego adịghị, ọrụ adịghị, agụ na ụbịam na-asụ ọtụtụ ndị mmadụ akwụ.
Ekemezie sị, "Ndị Naijiria enwezịghị ntukwasi obi n'ego Naijiria. O kwesịrị ka a mara ihe a ga-eme ka ego Naijiria nwee ugwu soro chịwa n'ego ndị ọzọ nọ n'ụwa."
3. Atumatu nchekwa obodo
Na mpaghara Ugwu, ndị Boko Haram na-akpa ike, n'Ọwụwa Anyanwụ, a na-arịa nsogbu ndị na-eti mkpu nnwereonwe, na Ndịda Ndịda, ndị na-ezu ohi mmanụ agbịdị na-eme nke ha, ntọ na mpụ ndị ọzọ na-arịkwa ibe ya elu.
A na-atụ anya na onyeisiala ọhụrụ ga-eleba ihe ndị a anya iji belata ha.
Ọkammụta Okey Ikechukwu na-eche na ọrụ mbụ chere n'ihu onyeisiala nabata bụ, "ịchịkwa obodo ka ọ ga-abụ onye naba n'abalị ya amụchie anya. Nke aghasaala n'ebe nile; n'ụgwụ Awusa, n'ala Igbo na mba mmiri."
N'otu aka ahu, Ekemezie si kọwaa, "E toro m na mpaghara Ugwu, ọ bụ ihe na-eme n'ebe ahụ mere m ji gbalata n'ihi na enweghịzị nchekwa zuru Naijiria ọnụ."
Malite n'afọ 2009 rue Julaị afọ 2015, mkpamkpa ndị Boko Haram ebutela ọnwụ mmadụ ruru 20,000, ebe mmadụ dị otu nde 1.3 bụ ndị gbapụrụla ọsọ ndụ, dika ozi ngalaba na-ahụ maka ikike dịịrị onye n'otu United Nations siri kwuo n'akwụkwọ ha wepụtara n'afọ 2015.
4. Nkwalite njirimara Naijiria
Ịkpalite mmụọ ịbụ onye Naijiria n'ime ụmụ Naijiria bụ ihe ọzọ a na-ele anya onyeisiala ọhụrụ ga-elebanye anya.
Ụmu Naijiria bụ ndị e ji ịgbasi mbọ ike, nkwuwa okwu nakwa mmụta mara.
Mana n'afọ olemole gara aga, e ji ime mpụ, ịgba mgbere ọgwụ ike na nrụrụaka mara Naijiria nke mere ka ọtụtụ mba jiri anya e ji ele onye ekpenta ele akwụkwọ njirimara nwa afọ nke Naijiria (Nigerian Passport) na mba ndị ọzọ.
Ekemezie kwuru mkpa ọ dị ịkpọlitekwa mmụọ Naijiria n'ime ụmụ Naijiria.
"Onye Naijiria na-aga ebe ọbụla n'ụwa, ị hụ ya ị mara na ọ bụ onye Naijiria. Obi esie ya ike na ọ bụ onye Naijiria, na-emekwa ka onye Naijiria."
Njirimara onye Naijiria dịka Ekemezie si kwuo bụ: "Onye Naijiria na-agbasi mbọ ike, hụ ala Naijiria n'anya, hụkwa ụmụnne ya n'anya."
5. Nhazighari ngalaba ikpe na Naijiria
A na-ahụta ngalaba ikpe dịka olileanya ọha ndị mmadụ maka inweta ikpe nkwụmatọ mana na nsonso a, ụfọdụ ụmụ Naijiria na-enwe obi abụọ ịga ụlọikpe maka okwu dịịrị ha na ndị ọzọ.
Na nsonso a, ụfọdụ ụmụ Naijiria gụnyere onye so Peter Obi nke Labour Party zọọ ọkwa Onyeisiala Naijiria dịka Osote ya bụ Yusuf Datti Baba-Ahmed kwuru na ọ kachaghị ya obi ịga ụlọikpe.
O kwuru nke a dịka ọtụtụ na-akpọ oku ka ndị mpụtara ntuliaka 2023 adịghị mma n'obi gaa ụlọikpe.
Ekemezie sịrị, "Ọ ga-adị mkpa na e mere ka ngalaba ikpe kwụrụ ekeresu ma bụrụ ebe a na-enweta ikpe kwụ ọtọ ka ndị mmadụ wee nwee ntụkwasa obi na ngalaba ikpe."
6. Kedụ ihe ndị ntorobia chọrọ?
Mpụta ndị mmadụ ọkachasị ndị ntorobia, pụtara na ntuliaka 2023 gosiri na anwụrụ na-apụ ha n'isi n'iwe n'ihi ọnọdụ ndakpo obodo nke butere enweghị ọrụ, ndakpọ agụmakwụkwọ, n'enweghị olileanya.
Ndị ntorobia na-atụ anya na Onyeisiala, dịka Okammụta Okechukwu sịrị kọwaa, " ga-ama ihe o mere ka a ghara ịna-emechikwa ụlọakwụkwọ."Ndị gụrụ agụ enweta ọrụ."
A na-atụ anya na a ga-enwe ọzụzụ ndị na-eto eto.
Ikechukwu, onye bụ Kpọrọ oku ka eweghachita nkuzi 'Civic Education' nakwa History n'ụlọakwụkwọ Pramarị iji kụziri "ụmụaka etu e si akpa agwa, etu e si eme ihe".
7. Oke nhatanha nwoke na nwaanyi
A na-atụ anya na onyeisiala na-abata ga-etinye anya n'usoro nakwa atụmatụ ga- enye aka hụ na nwụnwoke na ụmụnwaanyị na-enweta oke dị nhatanha n'ọrụ nakwa na ndọrọndọrọ ọchịchị.
Na Naijiria, ụmụnwaanyị anaghị enweta rue pasent 35 oche n'ọkwa ọchịchị dịka mkpebi Ọgbakọ Beijing nke afọ 1995 tụpụtara maka kwalite uto ụmụnwaanyị.