Etu e si chọpụta ozu nwafọ Anambra a n'ụlọ ndina dị na Bauchi Steeti

Ndị uweojii Bauchi Steeti ekwupụtala ọnwụ nwafọ Igbo bụ Chukwunonso Chukwujekwu nke okpuruọchịchị Anambra East dị n’Anambra State.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na Bauchi Steeti bụ Ahmed Wakili gwara BBC Igbo nke a ma sị na o mere n’ụbọchị mbụ nke ọnwa Disemba afọ 2022 bụ nke ụbọchị abụọ a malitere ịchọ nwamadị a achọ.

Akụkọ kwuru na nwamadị a gara emume ngwụcha afọ ndị Igbo e mere n’abalị Wednesde

N’okwu ya “nwunye nwoke a kpọrọ Grace Chukwunonso bịara mee mkpesa n’ụlọọrụ ndị uweojii na 30 Nọvemba, 2022 na ha na-achọ di ya bụ Chukwunonso achọ.”

“Ọ sị na di ya hapụrụ ụlọ ha ma gawa n’ụlọahịa ha dị na Boi mana kamgbe ahụ ahụghị ya anya ọzọ.”

Ngwa ngwa o mechara mkpesa a onye DPO nọ nyere iwu ka a malite ịchọ nwoke a, e mechara hụụ ozu nwoke a n’ụlọ ndina dị na Tundun Wada nke okpuruọchịchị Bogoro.”

Ozu nwoke a tọgbọ n’ala dịka ọfụfọ na asụmmiri si ya n’ọnụ na-asụpụta”.

Wakili kwuru na e buuru ozu ya gawa n’ụlọọgwụ General dị na Bogoro ebe ekwupụtara ọnwụ ya.

Ọ gara n’ihu kwuo na kọmishọna ndị uweojii sị ka e mee nyocha ma chọpụta ihe gburu Chukwunonso.

Ihe dị mkpa banyere Chukwunonso

  • Chukwunonso Chukwujekwu bụ nwafọ Nando dị n’okpuruọchịchị Anambra East nke Anambra Steeti.
  • A mụrụ ya n’ụbọchị ise nke ọnwa Jenụwarị, afọ 1985.
  • Ọ lụrụ nwunye ya bụ Grace Chukwunonso ebe ha mụtara ụmụ atọ.
  • Tupu ọnwụ ya nwamadị ji echichi a kpọrọ ‘Onyewetehi nke Nando’ nakwa Kaigaman Boi bụ nke onye ndu Boi bụ Bala Ibrahim Likita chiri ya n’afọ 2019.
  • Chukwunonso ebiela n’obodo Boi Bauchi Steeti ihe ruru afọ iri abụọ.