Etu e si lie ụmụaka atọ ahụ si n'otu ezinaụlọ e gburu ma tinye ozu ha n'igwe njụoyi n'Anambra Steeti

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6

Akwa na ọnụma jụpụtara n'obodo Uga dị n'okpuruọchịchị Aguata nke Anambra Steeti mgbe a na-eme olili ụmụaka atọ ahụ si n'otu ezinaụlọ e gburu ma tinye ozu ha n'ime igwe njụoyi dị n'ụlọ ha.

E buuru ozu ụmụaka a aha ha bụ Chikaima dị afọ iri, Chimziterem dị afọ asatọ na Chimdirim dị afọ ise site n'ọbaozu nke ụlọọgwụ NAUTH dị na Nnewi ma gawa n'ụlọ nna ha dị n'obodo Uga ebe e liri ha.

Dịka e bu ozu ụmụaka ndị a na-alọta, ọtụtụ ndị mmadụ na-ebe akwa ma na-abụ ọnụ na "ọ gaghị adịrị onye ọbụla gburu ụmụaka a na mma."

Ndị ndu ụlọụka St Michael Katọlik dị n'Umueze Uga, nke gụnyere ụkọchukwu na ndị sista haziri olile ụmụaka ndị a.

Cheta na ọ bụ n'ehihie ụbọchị Satọde 1 Febụwarị 2025 ka ndị maọbụ onye a na-amaghị gara n'ụlọ ụmụaka ndị a ma gbuo ha, were ozu ha tinye n'ime igwe njụoyi dị n'ụlọ ha.

Dịka ọ dị ugbua, a matabeghi onye maọbụ ndị kpara arụ a. Ndị uweojii kwuru na ha ka na-eme nnyocha.

Ihe nne na nna ụmụaka kọọrọ BBC Igbo maka ọnwụ ha

Nna ụmụaka ahụ nwụrụ anwụ bụ Maazị Udochukwu Samuel Ejezie kwuru na njinji ahụ jiri n'ụbọchị Satọde 1 Febụwarị 2025 mgbe ọ fụrụ nkeji ole na ole ka ọ kụọ elekere iri na abụọ nke etiti ụbọchị.

Oge onye ntaakụkọ BBC News Igbo garuru be ya, ọ sịrị na ọdachi ahụ mere n'ebe ha bi n'azụ ụlọogwụ Nnamdi Azikiwe University Teaching Hospital (NAUTH).

Dịka o siri kwuo, nwunye ya hapụrụ ụmụ ya atọ n'ụlọ gawa ule na Our Lady of Lourds Ihiala n'ụbọchị ahụ maka oge ọ batara enweghị nke ọbụla n'ime ha ọ hụrụ.

"Ọ na-abụ nwunye m bata, ụmụaka apụta makụọ ya mana n'ụbọchị ahụ ebe niile ghe oghe oge ọ batara, ọ hụghị ụmụaka kama akpụkpọụkwụ ha fesara ebe niile," ka Maazị Ejezie kwuru.

O kwuru na ụlọ ha bi n'ime ya bụ nke a gbara ogige ma bụrụkwa naanị ha na nne onye nwe ụlọ bi n'ime ya. Mana oge ọdachi ahụ mere, ya bụ nwaanyị anọghị ya.

"Ndị ọzọ anyị na ha bi n'ụlọ bụ ụmụakwụkwọ na-agụ ihe ọmụmụ ahụike. E chere m na aka ha dị ọcha n'ihi na mụ na ha enweghị nsogbu ọbụla," ka o kwuru.

Ahapụrụ m ụmụ m atọ gaa ụlọakwụkwọ, lọghachi hụ ozu ha - Nne ụmụaka atọ e gburu n'Anambra steeti

Maazị Ejezie kọwara na o cheghị na e gburu ụmụ ya atọ iji gwọọ ọgwụ ego kama ọ hụtara ya dịka omume mmadụ kpachapụrụ anya mee iji megide ya.

Nwunye ya bụ Chikazor Ogochukwu Ejezie kwuru na ya cheburu na ụmụ ya gawara ụlọụka oge ọ batara ma ọ hụghị ha mana dịka ọ chọgidere ha ruo elekere asatọ nke abalị, ụjọ bara ya ahụ nke mere o jiri gwa ndị agbataobi na ndị ụlọụka.

"A kpọrọ m nwunye enyi di m onye ụmụaka ya na ụmụaka m na-eso aga cathechism, mana o kwuru na ụmụaka ya agahị cathechism ụbọchị ahụ. A jụrụ m ya ka ụmụ m anọ be ya, ọ gwara m mba na ha anọghị be ya", ka o kwuru.

"Otu onye agbataobi m gwara na ọ hụrụ ụmụntorobịa abụọ ka ha bịara na be m. O kwuru na nwaanyị pụtara ga zụta ihe ma laghachi n'ụlọ m".

Ọ gara n'ihu kwuo na ha malitere ịchụ ụmụaka ha ebe niile tupu ha hụ ha n'ime igbe njụoyi ahụ.

Etu e si chọpụta ozu ụmụaka atọ n'ime igbe njụoyi n'Anambra steeti

Akụkọ kwuru na e gbuola ụmụnne atọ gụnyere otu nwoke gbara afọ ise na ndị nke nwaanyị abụọ gbara afọ asaa na afọ itoolu n'otu n'otu ma kwanye ozu ha n'ime igbe njụoyi.

Ozi anyị nwetara kwuru na nke a mere n'obodo Nnewichi dị na Nnewi nke Anambra steeti.

Dịka ozi ahụ siri kwuo, ha bụ ụmụaka atọ nọ n'ime ụlọ oge nne ha bụ onyenkuzi nakwa nọọsụ pụrụ maka ule ya n'ụbọchị ahụ.

Akụkọ ahụ kwuru na dịka nne ha lọghachiri, ọ chọpụtara na ụzọ ha niile ghere oghe mana ụmụ ya anọghị ya.

Oge ọ chọchara ebe niile ma ọ hụghị ụmụ ya, ọ kpọkuru ndị obodo ka ha nyere ya aka. Ọ bụzi oge e meghere igbe njụoyi 'freezer' ka a hụrụ ozu ụmụaka atọ ahụ n'ime ya.

Nna ụmụaka ahụ kwuru na ha enyela mkpesa n'aka ndị uweojii ma dọnyekwa ozu ha n'ọbaozu.

Oge BBC News Igbo kpọtụụrụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Anambra steeti bụ Tochukwu Ikenga, o kwetara na akụkọ ahụ bụ eziokwu ma kọwaa na Kọmịshọna ndị uweojii steeti ahụ enyela iwu ka e nyefee okwu ahụ n'aka ngalaba na-enyocha mpụ na omekome dị n'Awka maka ilebara ya ezigbo anya.

Cheta na akụkọ yiri nke a mere n'izuụka ole ma ole gara ebe a hụrụ ozu ụmụaka atọ n'ime ụgbọala n'obodo Nise dị n'Anambra Steeti.

BBC Igbo na-agba mbọ ịnụta n'ọnụ nne na nna ụmụaka ndị a.