Ihe anyị ma gbasara ogbunigwe Amerịka tụrụ n'akụrụngwa nuklịa mba Ịran

Ebe foto si, Reuters
- Onye dere ya, Thomas Mackintosh
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Onye dere ya, Nadine Yousif
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 6
Onyeisiala Donald Trump kwuru na Amerịka emeela mwakpo ogbunigwe "gara nke ọma" n'ogige ngwaagha ọgwụrụmba atọ dị n'Ịran, ma kwuo na "ekpochapụla" ha.
Izrel kwuru na ha na na mba Amerịka jikọtara aka kpaa nkata mwakpo ahụ. Ndị ọchịchị Ịran ekwupụtala na a tụrụ ogbunigwe n'akụrụngwa ndị ahụ mana ha kwuru na nke ahụ ejighị ike metụta ha.
Ogbunigwe ahụ a tụrụ n'ogige ngwaagha ọgwụrụmba bụ ọnọdụ gbara ọkpụrụkpụ n'agha dị ugbua n'etiti Ịran na Izrel.
Lee ihe ndị anyị ma.
Ọ bụ gịnị ka mba Amerịka tụrụ ogbunigwe, kedụ ngwaagha ha ji?
Otu n'ime ogige ndị e lekwasara anya bụ Fordo, akụrụngwa a na-agbanyeju uranium e zoro n'akụkụ ugwu, ma bụrụkwa nke dị mkpa maka atụmatụ Ịran nwere ịrụpụta ngwaagha ọgwụrụmba. Anyị amatabeghị ogogo mbibi e mere na ya bụ akụrụngwa.
Amerịka kwuru na ha tụkwara ogbunigwe n'ogige ngwaagha ọgwụrụmba abụọ ndị ọzọ dị na Natanz na Isfahan

Dịka e zoro ya n'akụkụ ugwu dị na ndịda Tehran, Fordo bụ nke e kwenyere miri emi n'ime ala karịa okpo Channel Tunnel jikọtara mba UK na Fransị.
N'ihi etu o siri mie n'ime ala, ọ bụ naanị mba Amerịka nwere ụdị nnukwu ogbunigwe "bunker buster" nke pụrụ ibibi ogige ahụ. Ogbunigwe Amerịka ahụ bụ nke a kpọrọ GBU-57 Massive Ordnance Penetrator (MOP).
Arụ ya dị 13,000kg (30,000lb) ma nweekwa ike ịbanye n'ime okwute ruru mita 18 (60ft) maọbụ ala nkịtị dị mita 61 (200ft) tupu o tiwaa, dịka ndị ọkachamara siri kwuo.
N'ihi etu Fordo siri dị omimi, atụchaghị anya na mwakpo MOP ga-agacha nke ọma, mana ọ bụ naanị ya bụ ogbunigwe nwereike inyetụ ihe a chọrọ.
Ndị mgbasaozi Amerịka kwuru na ọ bụ MOP ka e ji mee mwakpo ahụ.

Kedụ ihe amaghị gbasara mmetụta mwakpo ahụ?
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Ogogo mbibi mwakpo Amerịka butere n'akụrụngwa nuklịa ndị ahụ edochabeghị anya, maọbụ ma e nwere ndị nwụrụ anwụ na ndị merụrụ ahụ.
Otu na-ahụ maka ngwaagha na mba Ịran bụ Iranian Atomic Energy Organization kwuru na ogbunigwe a tụrụ n'ogige ngwaagha ọgwụrụmba ha atọ bụ "nnupụisi ọjọọ" megide iwu mbaụwa.
Ma Saụdi Arebịa ma otu International Atomic Energy Organization Agency (IAEA) ekwuola na ahụtabeghị mmụbawanye ikuku ọjọọ kemgbe e mechara mwakpo ahụ.
Onyeisi otu IAEA bụ Rafaelle Grossi akpọọla nzukọ gbatagbata nke bọọdụ ndị gọvanọ n'ụbọchị Mọnde.
Osote onyeisi ngalaba ndọrọndọrọ ọchịchị n'ulọmgbasaozi Ịran bụ Hassan Abedini kwuru na Ịran ekpochaala ogige ngwaagha ọgwụrụmba atọ ahụ "oge adịchabeghị anya".
Oge ọ pụtara n'ụlọmgbasaozi onyonyoo mba Ịran, ọ sịrị na mwakpo ahụ "ejighị ike metụta Ịran n'ihi na ekpochapụla ngwa ndị ahụ".
Oge ọ na-agwa ọha okwu n'ige onyonyoo, Trump sịrị na "e kposaala ma kpochapụ akụrụngwa nuklịa ahụ".
Mana oge ọ na-agwa BBC News okwu, onye bụbu osote Odeakwụkwọ mba Amerịka maka ihe ndị metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị na ndịagha bụ Mark Kimmitt kwuru ka ihe si kwụrụ.
"O nweghị etu a ga-esi kwuo na e bibiela ya kpamkpam," ka o kwuru.
Minista mba Ịran na-ahụ maka ihe na-eme na mba ndị ọzọ adọọla Amerịka aka na ntị na mwakpo ha mere na Fordo, Isfahan na Natanz ga-enwe "ntaramaahụhụ ebighịebi."
Abbas Araghchi kwuru na Ịran na-echekwa "atụmatụ niile" dị ha n'aka iji chekwaa nkwụrụnankeonwe ha.
Kedụ ka Ịran pụrụ isi megwara?
Ndị ọkachamara kwuru na kemgbe Izrel tụrụ ogbunigwe na mberede n'akụrụngwa nuklịa nakwa ogige ndịagha Ịran n'ụbọchị 13 Juun, Ịran adaala mba nke ukwuu.
Ịran nwekwara ike iweta mbibi ole na ole.
N'oge gara aga ka ndị ọchịchị Ịran dọrọ Amerịka aka na ntị ka ha hara itinye aka n'agha ahụ, ma kwuo na ọ ga-ebute "mbibi ọjọọ" ma bụrụkwa nke pụrụ ime ka "agha tiwapụ" na mpaghara ahụ niile.
Onye ntaakụkọ BBC na-ahụ maka nchekwa bụ Frank Gardner kwuru na Ịran kwesịrị ịhọrọ otu n'ime atụmatụ atọ iji zaghachi mwakpo Amerịka mere n'abalị:
- Ghara ime ihe ọbụla. Nke a pụrụ ichekwa ya na mwakpo Amerịka. Ha nwekwara ike ịhọrọ usoro mkparịtaụka n'etiti ha na Amerịka.
- Megwara ngwangwa ma mesie ya ike. Ịran bụ mba a maara nke ọma maka ogbunigwe 'ballistic missile' dịka ha rụpụtachara ma zoo ya kemgbe ọtụtụ afọ. E nwere ogige ndị Amerịka ruru 20 ha pụrụ ilekwasa anya na mpaghara Middle East. Ha nwekwara ike iji droonu wakpoo ụgbọmmiri ndịagha Amerịka.
- Megwara ma e mesịa, n'oge ọbụla ha kpebiri. Nke a ga-abụ ichere ka ọgbaaghara nke dị ugbua dajụọ tupu ha awakpoo ogige mba Amerịka na mberede.
Gịnị ka Donald Trump kwuru, kedụkwanụ ihe ndị na-egwu ndọrọndọrọ ọchịchị n'Amerịka kwuru?
Dịka Osote Onyeisiala bu JD Vance, Odeakwụkwọ Nchekwa bụ Pete Hegseth na odeakwụkwọ mba Amerịka bụ Marco Rubio kwụ ya n'akụkụ, Trump kwuru oge ọ na-agbasara ọha ozi na mwakpo ndị ọ ga-eme n'ọdịnihu ga-adị "ukwuu karịa" ewezuga ma Ịran ọ banyere na mkparịtaụka.
"Cheta na ọtụtụ ogige ndị ọzọ anyị lekwasara anya ka fọfụrụ," ka o kwuru.
Ọtụtụ ndị otu Republican nke Trump ewepụtala ozi na-akwado atụmatụ ahụ. Sịnetọ ndị Texas bụ Ted Cruz "toro" onyeisiala, ọchịchị ya na ndịagha Amerịka tinyere aka na mwakpo ahụ.
Ka o sina dị, onye otu Democrat a ma ama bụ Hakeem Jeffries kwuru na Trump nwereike itinye Amerịka "n'agha ọjọọ na mpaghara Middle East", ebe ndị ọzọ boro ya ebubo ileghara ọgbakọ Congress anya ma malite agha ọhụrụ.
Onye omeiwu kwụụrụ onwe ya bụ Bernie Sanders kọwara mwakpo Amerịka dịka "nke megidere iwu" n'ihi na onyeisiala enweghị ikike nke onwe ya ikwupụta agha n'obodo ọzọ. Naanị ọgbakọ Congress - ndị omeiwu a họpụtara n'ụlọnnọchiteanya na Sinetị bụ ndị nwere ike.
Mana iwu kwukwara na onyeisiala bụ ọchịagha na onyeisi ndịagha. Nke ahụ pụtara na ọ nwereike iziga ndịagha Amerịka ma buo agha na-ebughị ụzọ kwupụta agha.
Kedụ ka nke a siri malite?
Izrel mere mwakpo mberede n'ọtụtụ ogige nuklịa nakwa ogige ndịagha Ịran n'ụbọchị 13 June. Ha kwuru na ebumnobi ha bụ ikpochapụ akụrụngwa nuklia ahụ, nke Praịm Minista Benjamin Netanyahu kwuru ga-enwe ike mepụta ogbunigwe ọgwụrụmba n'oge na-adịghị anya .
Ịran na-ekwusi ike na ebumnuche nuklịa ha bụ maka udo. Na mmegwara, Tehran tụrụ Izrel ọtụtụ ogbunigwe rọket na droonu. Mba abụọ a gara n'ihu na-atụ onwe ha ogbunigwe aghara aghara kemgbe, n'agha ha si n'elu ebu onwe ha ihe karịrị otu izu ugbua.
Trump ekwuola kemgbe na ya anaghị akwado ka Ịran nwee ngwaagha ọgwụrụmba. Ndị mmadụ kwenyere na Izrel nwere ha, n'agbanyeghị na ọ kwadoghị maọbụ gọnarị nke a.
N'ọnwa Maachị, onyeisi nchekwa mba Amerịka bụ Tulsi Gabbard kwuru na dịka Ịran mụbawanyere ogogo uranium ha n'ụdị ahụtụbeghị, na ha anaghị arụ ngwaagha ọgwụrụmba - nnyocha nke Trump kwuru na "o zighị ezi" n'oge na-adịbeghị anya .
Amerịka na Ịran nọ na mkparịtaụka maka ngwaagha ọgwụrụmba oge Izrel mere ha mwakpo mberede. Naanị ụbọchị abụọ gara aga, Trump kwuru na ọ ga-enye Ịran izuụka abụọ ka ha banye na mkparịtaụka bara uru tupu ya awakpoo ha, mana oge o nyere maka nke ahụ bịaziri bụrụ nke belatara.








