Hamas ekwela ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma chọọ nkwụsị agha na-adịgide na nzaghachi mba Amerịka
Nchịkọta akụkọ ndị kachasị mkpa mere na mbaụwa n'ọnwa Mee 2025.
Mkpuchi Na Eme Ozugbo
Uzoamaka Ewuzie, Ikechukwu Kalu, Michael Ngene, Chinonso Ugorji, Michael Ilediagu, Adline Okere
Otu ha na Al-Qaeda nwere mmekọ ekwuola na ha wakporo ndịagha mba Mali
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ndịagha ndị Mali
Otu na-eyi ọha
egwu ha na otu Al-Qaeda nwere mmekọ ekwuola na ọ bụ ha wakporo ogige ndịagha
mba Mali n’obodo Boulikessi.
Ihe karịrị
ndịagha 30 nwụrụ na mwakpo ahụ mere ụbọchị Sọnde, 1 Juun, 2025 mana ndị ọchịchị
ekwubeghị ka nke ọ bụ eziokwu.
Ụbọchị Mọnde,
2 Juun, 2025, otu Jama’a Nusrat ul-Islam wa-Muslimin (JNIM) kwuru na ọ bụ ogige
ndịagha Timbuktu ka ha chọrọ ịwakpo, dịka ndị obodo kwuru na ha nụrụ ụda egbe.
Ozi ndịagha
wepụtara ụbọchị Mọnde 2 Juun, 2025, kwuru na ha gbochiri mwakpo ndịagha
nnupuisi mere na Timbuktu gbuo mmadụ 14 n’ime ha ma nwụchie mmadụ 31.
Hamas ekwela nkwa ịtọhapụ mmadụ iri ha ji ma kwuo na ha chọrọ ka ịkwa mgbọ kwụsị
Ebe foto si, Reuters
Nkọwa foto, Ụmụaka nọ n'ogige ụlọ kụkpọrọ akụkpọ na Gaza
Hamas ekwuola
na ha dị njikere ịtọhapụ mmadụ iri ha ji nakwa ozu mmadụ 18 na nzaghachi oku
mba Amerịka kpọrọ ka a kwụsị ịkwa mgbọ na Gaza.
Otu Hamas
kwuru na ha chọrọ ka Izrel tọhapụ ụfọdụ ndị Palestinia ha ji, mana mba Izrel
ekwubeghị ihe ọbụla maka nke a.
Cheta na
obi ọchịchị White Houes mba Amerịka nọrọ na mbido izuụka kwuo na Izrel ebinyela
aka n’atụmatụ ahụ Steve Witkoff wepụtara.
Ọzọkwa, mba
Izrel malitere mgbochi n’okeala ha na Gaza ma malitekwa mbuso agha megide otu
ndị Hamas na 18 Maachị 2025 nke mebiri nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ ọnwa abụọ n’etiti
mba abụọ ahụ nke mba Amerịka, Kataa na Ijiput wetere.
Ihe
ruru mmadụ 54,381 anwụọla n’agha Gaza kemgbe Izrel malitere ịtụ ogbunigwe
megide mbuso agha ndị Hamas mere n’Izrel na 7 Ọktoba 2023 nke gburu mmadụ otu puku
na narị abụọ ma jidekwa mmadụ narị abụọ na iri ise na otu ndị ọzọ dịka ụlọ ahụike
ndị Hamas siri kwuo.
E ruoola mmadụ 151 nwụrụ n'oke idemmiri mere na Nịja steeti nke Naịjirịa
Ebe foto si, Mikail Musa
Nkọwa foto, E ruoola mmadụ 151 nwụrụ n'oke idemmiri mere na Nịja steeti
Ihe ruru
mmadụ otu narị na iri ise na otu anwụọla na mpaghara etiti nke Naịjirịa maka
oke idemmiri mebiri ọtụtụ ụlọ obibi ma chụpụ ọtụtụ puku mmadụ n’ụlọ n’izu a.
Ụlọọrụ na-ahụ
maka gbatagbata na Nịja steeti a kpọrọ Niger State Emergency Management Agency
(Nsema) gwara ụlọ mgbasa ozi BBC na ọnwụ mmadụ e biliela n’ọnụọgụgụ site na 115
mgbe idemmiri ahụ mechara n’obodo Mokwa ruo 151 ugbua.
Ọnụ na-ekwuchitere
ụlọọrụ Nsema gwara BBC na ihe karịrị ụlọ dị narị ise na mmadụ karịrị puku atọ
ka ihe mberede idemmiri ahụ metụtara.
O kwuru na ụfọdụ
ezinaụlọ gwara ha na ihe dịka ndị ha hụrụ n’anya mmadụ abụọ maọbụ ise nwụrụ nke
gụnyere ụmụaka.
Ụlọọrụ ahụ dọrọ
aka na ntị na ọnụọgụgụ ndị nwụrụ anwụ nwereike ibili dịka idemmiri bugara ndị
mmadụ n’oke osimiri Riva Nịja.
Nkọwa foto, Mba Rọshịa ezigabeghị atụmatụ mkparịtaụka ya na mba Yukren
Onyeisiala
mba Yukren agbaghawo nkwa Rọshịa kwere na ha ga aga n'ihu na mkparịtaụka udo mgbe
mba ahụ kwupụtara na ọ ga-eziga ndị nnọchiteanya na mkparịtaụka a ga-enwe n’isi
obodo Tọkị bụ Istanbul n’ụbọchị Mọnde 2 Juun 2025.
Mba Rọshịa
ezigabeghị atụmatụ mkparịtaụka ya na mba Yukren – nke bụ isi ihe Yukren chọrọ. Ọnụ
na-ekwuchitere Kremlin bụ Dmitry Peskov kwuru na a ga-atụle ọnọdụ Rọshịa wepụtara
maka nkwụsị ọgụ na Tọkị.
Mana Onyeisiala
Volodymyr Zelensky na-ebo mba Rọshịa ebubo ime ihe niile ha nwereike iji ahụ na
nzukọ ọzọ a gaghị amịta mkpụrụ.
"Ka
nzukọ wee nwee isi, ebumnuche ya ga-edo anya, a ga-akwado nke ọma maka mkparitaụka,"
ka o kwuru.
Cheta na mba
Yukren ezigala atụmatụ ya na Rọshịa, nke na-egosi "njikere maka nkwụsịtụ ọgụ
zuru oke na enweghị ọnọdụ".
Ugbu a, Rọshịa
na-achịkwa ihe dịka 20% nke ókèala Yukren Yukren, gụnyere ndịda Crimea
peninsula nke Rọshịa weghaara na 2014.
Ihe mere n’ụbọchị ule ‘English’ agaghị emekwa ọzọ - Ụlọọrụ WAEC
Ebe foto si, Getty Images/WAEC
Ndị nkụzi na ụmụakwụkwọ na-ede ule WAEC n'Aba dị n'Abịa steeti akọwaala ihe ha
gabigara n’ụbọchị Wenezde 28 Mee 2025, bụ ụbọchị ha dere ihe ọmụmụ asụsụ Bekee.
Otu nwataakwụkwọ na-ede ule WAEC aha ya bụ Success gwara
onye ntaakụkọ BBC News Igbo na onye nlekọta ha bụ 'invigilator' butere akwụkwọ
ule nke abụọ bụ ihe ọmụmụ asụsụ Bekee mgbe ọ kụrụ elekere ịse nke mgbede.
O kwuru na ha dechara ule ahụ n'ihe dịka elekere asaa nke
abalị, ebe ha jizi ọkụ tọọchị nakwa ọkụ ekwentị ndị nkụzi ha na-ahụ ihe ha
na-ede mgbe ọchịchịrị gbara.
Nwataakwụkwọ ahụ kwuru na ya bụ ọnọdụ tinyere ha na
mgbagwojuanya, dịka ọ na-atụ egwu na nke a nwereike imetụta akara ha n'ule ahụ.
Otu onye nkụzi aha ya bụ Maazị Uche Imeuka gwara anyị na ụmụakwụkwọ
na-ele ule lechara mgbe ọ kụchara elekere asatọ nke abalị.
O kwuru na ihe kpatara nke a bụ na e butere akwụkwọ ule mgbe
ọ gafechara elekere isii, nke meziri e jiri malite ya bụ ule n'azụ oge.
O kwuru na e tinyeziiri ụmụakwụkwọ ọkụ ka ha jiri hụ ụzọ
dechaa ule ha.
N'ebe ụfọdụ, ụmụakwụkwọ kwuru na a mụnyeere ha ọkụ oriọna ka
ha jiri hụ ụzọ na-ede ule.
Onye ntaakụkọ BBC News Igbo n’Aba dị n’Abịa steeti sị ya hụrụ
ka ụmụakwụkwọ na-ede ule nọ n'okporoụzọ na-ala mgbe ọ kụrụ ihe dịka n'elekere
iri nke abalị n’ụbọchị Wenezde ahụ.
Ọnọdụ a metụtara ụmụakwụkwọ niile dere ule n'ụbọchị ahụ.
Ka o sina dị, ụlọọrụ West African Examinations Council
(WAEC) ekwuola na ọ bụ nsogbu ime njem na ọnọdụ enweghị nchekwa mere ha jiri
haziere ụmụakwụkwọ ule n’azụ oge n’ụbọchị Wenezde 28 Mee 2025.
N’ozi o wepụtara, ọnụ na-ekwuru WAEC bụ Moyosola Adeshina kọwara
na dịka ha mechichara oghere niile, ha zutere nsogbu ime njem nakwa nsogbu
nchekwa, bụ nke mere e ji hazie ule ahụ n’azụ oge.
WAEC kwere nkwa na ha na-agbakọrọ ụlọorụ nchekwa dị iche
iche aka iji hụ na ụdị mkpọbiụkwụ ahụ adapụtaghị ọzọ.
Ụlọọrụ ahụ jikwa obi ha niile rịọ ụmụakwụkwọ, ụlọakwụkwọ
nakwa ndị nne na nna mgbaghara maka ọnọdụ ahụ.
Amerịka ga-agbakwunye ụtụisi 50% na ‘steel’ na ‘aluminium’ a tụbatara na mba ahụ
Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump ekwupụtala na mba Amerịka
ga-agbakwunye ụtụisi n’elu nke ha tinyere ugbua maka igwe steel na aluminium ndị a
tụbatara na mba ahụ.
Trump kwuru na malite n’ụbọchị Wenezde, a ga-agbakwunye ụtụisi
50% n’elu igwe steel na aluminium ndị a tụbatara na mba ahụ, na-abụghịzi 25% ọ
bụbu.
Oge ọ na-ekwu okwu n’ọgbakọ rally a haziri na Pittsburgh dị
na Pennsylvania, Trump kwuru na atụmatụ ahụ ga-enye aka kwalite ụlọọrụ steel ndị
e nwere na mba Amerịka ma belata ndabere ha nwere na mba Chaịna.
Trump kwukwara na a ga-etinye ijeri $14 maka mmepụta steel na
mpaghara ahụ site na mgbakọaka ụlọọrụ US Steel na Nippon Steel
nke mba Chaịna.
Ka o sina dị, o mechara gwa ndị ntaakụkọ na ya ahụbeghị maọbụ
binye aka na nkwekọrịta ikpeazụ nke atụmatụ ahụ.
Nkwupụta a Trump mere bụ nke ọhụrụ ya kemgbe ọ malitere
itinye ụtụisi aghara aghara dịka ọ banyere n’ọchịchị nke ugboro abụọ n’ọnwa Jenụwarị.
Igbo bụ Igbo, ụnụ asaala chi, Ngwụcha izuụka ọma nụ
Obiụtọ ka anyị ji anabata gị n'ọgbakọ BBC News Igbo taa bụ Satọde 31 Mee 2025.
Chinonso Ugorji nọ ebe a n'ụtụtụ a iwetere gị akụkọ niile na-akpọtụ n'ala Igbo, na Naịjirịa, n'Afrịka nakwa n'ụwa dum gbaa gburugburu mana Uzoamaka Ewuzie na Michael Ngene ga-esonyere ya ma e mesịa.
Biko gaa n'ihu nọnyere anyị taa.
Mkparịtaụka azụmaahịa nke mba Chaịna na Amerịka akwụsịla - Odeakwụkwọ ego mba Amerịka
Ebe foto si, PA Media / Getty Images
Nkọwa foto, Ụtụisi Onyeisiala Trump ka na-aga n’ihu maka n’obi ọchịchị Amerịka White House wegara ikpe ahụ n’ụlọikpe mkpegharị.
Mkparịtaụka
azụmaahịa nke e kwuru ga-adị n’etiti mba Amerịka na Chaịna akwụsịla, onye
odeakwụkwọ ego nke mba Amerịka Scott Bessent kwuru.
Okwu Bessent na-abịa ihe dịka izu atọ mgbe ekwenyechara
nkwụsị agha azụmaahịa nwa oge n'etiti mba abụọ ahụ akụnaụba ha kachasị ukwuu n'ụwa,
na-ekwenye na ha abụọ ga-ebelata tarifụ mmegwara.
Odeakwụkwọ Bessent gwara ụlọ mgbasa ozi Fox News n’ụbọchị
Tọzde 29 Mee 2025: “Echere m na n'ihi na mkparịtaụka ahụ nwere mgbagwoju anya,
na ọ ga-achọ ka ndị isi nke mba abụọ ahụ na-atụle onwe ha".
Cheta na ụtụisi Onyeisiala mba Amerịka Donald Trump
manyere na mbubata ngwaahịa niile sitere na mba dị iche iche ka ụlọikpe na-ahụ
maka azụmaahịa n’Amerịka wepụtara mkpebi
ọhụrụ n’ụbọchị Wenezde nke kwuru na Onyeisiala Trump gafere ikike ya.
Ụtụisi Onyeisiala Trump ka na-aga n’ihu maka n’obi ọchịchị
Amerịka White House wegara ikpe ahụ n’ụlọikpe mkpegharị.
Ndị uweojii agbagbuola nwoke a na-eyo eyo gburu nwataakwụkwọ mahadum na Saụt Afrịka
Ebe foto si, South Africa police / X
Nkọwa foto, A hụru ozu Olorato Mongale na Johannesburg ụbọchị Sọnde, 25 Mee, 2025
Otu onye a na-eyo eyo na aka
ya dị n’ọnwụ nwataakwụkwọ mahadum South African University anwụọla dịka ya na
ndị uweojii kwatara mgbọ.
Nwoke ahụ ka akụkọ
kwuru na aka ya dị n’ọnwụ Olorato Mongale, onye a chọpụtara ozu ya na Johannesburg
ụbọchị Sọnde, 25 Mee, 2025 dịka o mere awa abụọ a
malitere ịchọ ya achọ ka ọ gara ịhụ enyi ya.
Ọnụ na-ekwuru ndị
uweojii bụ Athlenda Mathe kwuru na n’ụtụtụ Fraịde, 30 Mee, 2025, ndị uweojii chọpụtara
nwoke ahụ a na-eyo eyo ebe o zoro n’ebe obibi dị n’obodo Amanzimtoti.
O kwuru na nwaamadị ahụ
a na-ekwughị aha ya, malitere ịgba ndị uweojii egbe ngwa ọ hụrụ ha. Ọ bụ oge ịkwakọrịta
mgbọ a ka ndị uweojii gburu ya.
Kọmịshọna ndị uweojii
na mpaghara ahụ bụ Nhlanhla Mkhwanazi kwuru na ihe ha nwetara n’aka nwoke ahụ gụnyere
akwụkwọ njirimara 28 na ọtụtụ ekwenti.
Idemmiri gburu mmadụ 110 n'ihi oke mmiri ozuzo na Naịjirịa
Ebe foto si, Mikail Musa
Nkọwa foto, Idemmiri ahụ rikpuru ma bufuo ihe karịrị ụlọ obibi iri ise (50) na ndị bi na ha
Ihe ruru
mmadụ otu narị na iri (110) anwụọla n’idemmiri nke oke mmiri ozuzo kpalitere na
mpaghara etiti Naịjirịa, ndị ọchịchị gwara ụlọ mgbasa ozi BBC.
Mmiri ozuzo
ahụ were ọtụtụ awa, ka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ihe mberede na Nịja steeti (Nsema),
Abullahi Baba-Arah siri kwuo.
Ọ
gbakwunyere na idemmiri ahụ rikpuru ma bufuo ihe karịrị ụlọ obibi iri ise
(50) na ndị bi na ha.
Nsema kwuru
na ọ bụ mpaghara Tiffin Maza na Anguwan Hausawa dị n’obodo Mokwa ka idemmiri ahụ
kacha metụta.
Onyeisi
mpaghara Mokwa bụ Muhammad Shaba Aliyu kwuru na o ruola afọ iri isii kemgbe
obodo ahụ malitere ịta ahụhụ maka idemmiri.
Ụgbọelu bu Onyeisiala Liberịa gbanarịrị nsogbu dị egwu mgbe ọ na-ada
Ebe foto si, Executive Mansion - Liberia / Facebook
Nkọwa foto, Ndị isi ọdụ ụgbọelu kwuru na otu taya ụgbọelu ahụ gbawara ka ọ na-agbadata
Akwụsịtụrụ ụgbọelu
nwa oge n’ọdụ ụgbọelu Liberịa n'abalị Tọzde 30 Mee 2025 ka ụgbọelu bu Onyeisiala
Joseph Boakai nwere nsogbu fọrọ nke nta ka ọkpọkaa mgbe ọ na-ada.
Ndị isi ọdụ ụgbọelu
kwuru na ụgbọelu Onyeisiala malitere inwe nsogbu mgbe ọ na-ada n’okporoụzọ ụgbọelu
nke mere ka o were ike daa.
Ihe ahụ
merenụ, nke kpalitere ụjọ na ọdụ ụgbọelu ahụ, manyere ịkagbu ụgbọelu niile e were
n'abalị ahụ, dịka ndị mgbasa ozi mpaghara kwuru.
Onyeisiala
Boakai na ndị so ya gara njem na mba Naịjirịa mana ha pụtara n’ụgbọelu ahụ n’udo.
E kwuru na ndị isi amalitela nnyocha ụgbọelu Onyeisiala ahụ iji a chọpụta ebe
mmiri si were baa n’opi ụgbọgụrụ.
Ndị mgbasa
ozi mpaghara, kwuru na ndị isi ọdụ ụgbọelu gwara ha na otu taya ụgbọelu ahụ
gbawara ka ọ na-agbadata ma tọgbọrọ n'okporoụzọ ụgbọelu.
Nkwupụta ndị
na-ahụ maka ọdụ ụgbọelu Liberịa (LAA) kwadoro kọwaara na ọnọdụ ahụ adịghị mma nke kara akpalite
ihe mberede metụtara ụgbọelu onyeisiala mba ahụ.
Nnukwu onyeisi otu Hamas agwala BBC na atụmatụ mba Amerịka
wepụtara maka nkwụsị ịkwa mgbọ na Gaza adabaghị n’ihe ndị ha chọrọ mana ha
ga-aga n’ihu na-enyocha ya bụ atụmatụ.
Obi ọchịchị Amerịka kwuru n’ụbọchị Tọzde na Izrel “anabatala”
atụmatụ onye nnọchiteanya Amerịka bụ Steve Witkoff ma na-echezi maka nzaghachi
Hamas.
Ụlọmgbasaozi Izrel kwuru na ndị ọchịchị Izrel sịrị na ha
ga-ahụ na Hamas nyefere ha mmadụ 10 dị ndụ na ozu mmadụ 18 ha ji eji, bụ nke ha
ga-eji gbanwerịta nkwụsị ịkwa mgbọ ụbọchị 60 nakwa ntọhapụ ndị Palestine a tụrụ
mkpọrọ n’Izrel.
Izrel tinyere mmachibido na Gaza ma maliteghachi ibu agha n’ụbọchị
18 Maachị n’isochi ndakpọ nke nkwekọrịta nkwụsị ịkwa mgbọ nke mba Amerịka, Qatar
na Ijipt nyere aka tinye.
Dịka Mịnịstrị na-ahụ maka ahụike ndị otu Hamas na-elekọta
siri kwuo, e gbuola ihe ruru mmadụ 4,000 na Gaza n’ime izuụka 10 gara aga.
Nwaanyị rere nwa ya nwaanyị dị afọ isii ka ụlọikpe tụrụ nga mkpụrụ ọka na Saụt Afrịka
Ebe foto si, Executive Mayor Andrè Truter/ Facebook
Nkọwa foto, A hụbeghị nwata nwaanyị ahụ ruo ugbua
Otu nwaanyị onye Saụt Afrịka nke a mara ikpe maka ịtọrọ nwa
ya nwaanyị dị afọ isii ka a tụrụ nga mkpụrụ ọka, ya na ndị otu ya abụọ.
Nga a tụrụ Racquel "Kelly" Smith, enyi ya nwoke
Jacquen Appollis na enyi ha Steveno van Rhyn na-abịa ihe karịrị otu afọ ka
Joshlin Smith furu n'ụzọ dị omimi n'azụ ụlọ ya nọ na Saldanha Bay, nke dị nso n’obodo
Cape Town.
N'agbanyeghị etu e siri gwa ọha na eze maka o fufu nwa agbọghọ
ahụ, onye furu n’ọnwa Febụwarị 2024, a ka ahụbeghị ya ruo ugbua.
Mkpebi a na-esochi ikpe were izu asatọ na Saụt Afrịka, ebe
ndị akaebe na ndị ọkaiwu kwupụtara ọtụtụ ebubo na-awụ akpata oyi n'ahụ.
Mana, ndị uweojii kwuru na a ga-aga n'ihu na-achọ obere nwa
agbọghọ ahụ, ọbụlagodi ịgafe okeala Saụt Afrịka.
'Igwe ndị agụụ na-agụ’ tiwara ụlọ nkwakọba ihe na Gaza - WFP kwuru
Ebe foto si, EYAD BABA/AFP
Nkọwa foto, Ọtụtụ puku mmadụ na-abanye n'ụlọ nkwakọba ihe Al-Ghafari na-ewere akpa ntụ ọka na katọn nri
Igwe ‘ndị agụụ na-agụ’ tiwara ụlọ nkwakọba ihe na mpaghara
etiti na Gaza dịka ụlọọrụ World Food Programme (WFP) nke UN siri kwuo.
Akụkọ kwuru na mmadụ abụọ nwụrụ ebe ọtụtụ ndị mmadụ merụrụ
ahụ, ụlọọrụ ahụ kwuru ma agbakwunye na ha ka na-achọpụta ihe mere.
Ihe onyonyo gosiri ọtụtụ puku mmadụ na-abanye n'ụlọ nkwakọba
ihe Al-Ghafari dị na Deir Al-Balah na-ewere akpa ntụ ọka na katọn nri, dịka mgbọ
egbe na-ada.
Amabeghị ebe mgbọ egbe ahụ si bịa maọbụ onye gbagburu ha.
Nkwupụta ndị WFP kwuru na mkpa enyemaka mmadụ na Gaza enweghị
nchịkwa ugbua, dịka ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọnwa atọ mba Izrel malitere
mgbochi n’okeala ya na Gaza nke kwụsịrị n'izu gara aga.
Cheta na ụlọọrụ UN Humans Right Office kwuru na mmadụ iri anọ
na asaa (47) merụrụ ahụ n’ụbọchị Tuzde mgbe ndị mmadụ gafere otu n'ime ebe
nkesa ihe GHF dị na ndịda obodo Rafah, otu ụbọchị ka ọ malitere ịrụ ọrụ ebe ahụ.
N’aka nke ọzọ, ndị ọchịchị Izrel kwuru na Wenezde na
gwongworo narị na iri abụọ na otu (121) nke UN na mba ụwa bu gara ihe enyemaka mmadụ
gụnyere ntụ ọka na nri na Gaza.
N'ikpeazụ, Elon Musk ahapụla ọchịchị Onyeisiala Donald Trump
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Elon Musk kwuru na ya nwere nkụda mmụọ banyere ụfọdụ ịwu ndị Onyeisiala Trump mere.
Onye ọchụnta ego nke mba Amerịka bụ Elon Musk ekwuola na ọ ga-ahapụ ọchịchị Onyeisiala Amerịka bụ Donald Trump dịka o nyeere ya aka ibelata nha gọọmentị US nke mere ka ọtụtụ ọrụ gọọmentị etiti kwụsị.
Elon Musk onye kwupụtara nke a site na mbipụta o mere n'ọba mgbasa ozi X, kelere Onyeisiala Trump maka ohere o nyere ya ka o soro ya rụọ ọrụ na ngalaba gọọmentị arụmọrụ nke a na-akpọ DOGE n'okwu nkenke.
Musk kwuru na ya nwere nkụda mmụọ banyere ụfọdụ ịwu ndị Onyeisiala Trump mere.
Dịka ohere enyere Elon Musk iji rụọ ọru na DOGE nwere oge oji abia na njedebe, mana nke a biara n’eme mgbe ọ katọrọ isiụlọ omebe iwu nke atụmatụ Trump dịka o kwuru na "o nwere mmechu ihu" na ụgwọ mmefu ego nke Trump, nke na-atụ aro nkwụsịtụ ụtụisi nke ọtụtụ puku ijeri dollar na nkwalite ego ndị nchekwa.
Ụlọikpe azụmaahịa mba Amerịka egbochiela ụtụisi Trump tinyere, na-ekwu na onyeisiala 'gafere ikike ya’
Ebe foto si, Getty Images
Nkọwa foto, Ụlọikpe azụmaahịa mba Amerịka egbochiela ụtụisi Trump tinyere
Ọkaipe atọ n’ulọikpe gọọmenti etiti mba Amerịka etinyela ọnụ na-ụtụisi Donald Trump tinyere ma gbochie ya iga n’ihu dịka ha kwuru na ọdika omume ahụ ‘gafere ikike ya’.
N’ihi nkwupụta a ndị ọkaipe mere, ndị okammuta na ọkachamara azụmaahịa na-ele anya ma nkwupụta a onwere ike imetụta azụmahịa ụwa nke ọma.
"Ọ dighị ndị ikpe a na-ahọpụtaghị n’aka ịkpebi ka ha ga-esi edozi nsogbu ọbula metụtara mba Amerịka"
Ka ọna eme ugbu a, US na-akparịta ụka azụmahịa otu n'otu na ọtụtụ mba mana okwu ndị ahụ ugbua abala n'ọgba aghara n’ihi ihe ụlọikpe gọọmenti etiti mba Amerịka kwuru.
Otu onye anwụọla oge nnukwu ugbo 'billboard' dara n'Abịa steeti
Opekatampe otu mmadụ nwụrụ na nnukwu ọdachi mere oge nnukwu
ugbo mgbasa ngwaahịa bụ billboard n'asụsụ Bekee dara ma kụgide ha.
Ya bụ mkpamkpa kpara na Salad Market Junction n'okporoụzọ si
Aba gawa Owere n'Abia steeti n'ụbọchị Wenezde 28 Mee 2025.
Ndị hụrụ ihe merenụ kwuru na nnukwu ugbo mgbasa ngwaahịa ahụ
eji igwe rụọ dara oge ifufe mmiri na-efe ma kụgide ụgbọala keke anọ ndị nọ ebe
ahụ n'oge ahụ.
Onye Mayor nke okpuru ọchịchị Aba North bụ Timothy Kalu Iheke, onye duuru ndị ọrụ enyemaka gaa n'ogige ahụ ihe ọdachi mere gwara onye ntaakụkọ BBC News Igbo na ọ kụgidere mmadụ asaa ndị nọ n'ime ụgbọala Keke.
O kwuru na otu onye nọ ebe ahụ nwụọ ozugbo dịka e bugara ozu ya n'ọbaozu.
Kalu kwuru na akpọgaala ndị nke merụrụ ahụ n'ụlọọgwụ Living Word Hospital nọ n'Aba maka nlekọta ahụike.
Emefiele na-achọ onye ọkachamara nnyocha ka o nyochaa nde $17 nke ahụrụ na WhatsApp nke gosiri na ọ natara otu nwoke azumahia
Onye bụbu Gọvanọ ụlọakụ etiti Naịjiria CBN bụ Godwin Emefiele ariọla ụlọikpe pụrụiche dị na Legọs steeti ka ha nye ya ikike itinye onye ọkachamara n'ihe gbasara nnyocha ka o nyochaa ekwentị e jiri wepụ mkparịtaụka WhatsApp gosipụtara dịka ihe akaebe na ikpe ya na-aga n'ihu maka ebubo ijeri $4.5 na ijeri naira 2.8.
Ụlọọrụ na-ahụ maka mmegide mpụ na nrụrụaka ego, Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) boro Emefiele ebubo na ọ natara $17,100,000 n'aka onye ọchụnta ego site n'aka otu onye ọrụ ha a nakpọ Monday Osazuwa, dịka ụgwọ ọrụ maka ịkwado oke ego mgbanwe mba ọzọ n'aka CBN.
Mgbe a na-ekpe ikpe ahu ubọchi Tuzde Mee 27, 2025, onye ọrụ EFCC bụ Alvan Gurumnaan gbara akaebe na n'ọnwa Septemba 2020 na Junn 2, 2023, ụbọchị ole na ole tupu Emefiele akwusi ọrụ dịka Gọvanọ CBN, ọ natara ọtụtụ ụgwọ ruru nde $17.1 site n'aka Osazuwa.
Onyeisi ọkaiwu EFCC, Rotimi Oyedepo (SAN) chọrọ ka e jiri mbipụta nọ na WhatsApp nke mkparịtaụka dị n'etiti onye ọchụnta ego ahụ na onye were ya n'ọrụ dịka ihe akaebe.
Ọkaiwu na-anọchiteanya Emefiele, Olalekan Ojo (SAN), emegideghị ntinye akara ekwenti na mbipụta ahụ dịka akaebe mana o kwuru na ha kwesịrị inwe ikike inyocha ngwaọrụ ahụ n'onwe ha maọbụ site n'aka onye ọkachamara n'ihe gbasara nnyocha iji chọpụta na ozi ahụ ọ bụ eziokwu.
Ihe na-ebe ka na-ebe na pati PDP dịka ha na-agba mbọ ime udo n'etiti ha
Ebe foto si, Stella Kalu
Ọgbaghara dị n'etiti otu ndọrọndọrọ
ọchịchị Peoples Democratic Party (PDP) nwereike ọ gaghị akwụsị ozugbo dịka ngalaba National Executive Committee (NEC) na-eme mkpebi kachasị n'otu ahụ,
enwebeghi ike idozi nsogbu ahụ n'ọgbakọ ha nwere n'Abuja n'ụbọchị Tuzde 28 Mee, ma yigharịa ya na Fridee 30 Mee.
Na nkwupụta onye na-aru ọru dịka Onyeisioche bụ Iliyasu Umar Damagum
kwuru na ha nwere ike ịme nzuko NEC ọzọ n'ihu tupu ọgbakọ ha a na-akpo 'National Convention' eruo.
Ebe foto si, Stella Kalu
Otu n’ime nsogbu ndi pati PDP na-akwado idozi bụ gbasara ntuziaka di iche iche nke odeakwụkwọ Samuel Anyanwu na osote odeakwụkwọ Setonji Koshoedo nyere dịka ha na-achọ idozi onye ga-abu ezigbo onye odeakwụkwọ pati ha.
Ndị so bịa nzukọ ahụ gụnyere; ndị Gọvanọ Bauchi, Enugwu, Adamawa, Taraba, Oyo, Osun, Zamfara na Bayelsa steeti na ndị otu Board of Trustees, ndịisi oche otu pati steeti na ndị otu ọgbakọ omeiwu si na pati ahụ.
Onye bu ọkọlọtọ onyeisiala n'afọ 2023 Atiku Abubakar, Minista nke Federal Capital Territory. Nyesom Wike na Gọvanọ Akwa Ibom, Umo Eno anọghị na nzukọ ahụ
Amerịka akwụsịtụla inye ụmụakwụkwọ si mba ọzọ ohere inwete 'visa'
Ebe foto si, Bloomberg via Getty Images
Nkọwa foto, Ụmụakwụkwọ Mahadum Havard mere ngagharịiwe n'ụbọchị Tuzde maka mmachi Trump machiri ụlọakwụkwọ ịnabata ụmụakwụkwọ si mba ọzọ
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump enyela iwu ka ụlọọrụ ha dị na mba ndị ọzọ kwụsị inye
ụmụakwụkwọ ikike ịbata n’obodo dịka ha na-akwado ịgbatikwu oge nnyocha ha
na-eme n’akara soshal midia ndị dị etu ahụ.
N’akwụkwọ ozi,
e zigaara ụlọọrụ ha dị iche iche, odeakwụkwọ gọọmentị bụ Marco Rubio kwuru na “nkwụsịtụ
ahụ ga-adị ire ruo oge a ga-enye ntuziaka ọzọ”.
Ozi ahụ
kwuru na ha ga-ewelite aka n’inyocha akara soshal midia ndị mmadụ nakwa akwụkwọ
njem ndị a, nke a sị ga-asị dị “oke mkpe” nye ụlọọrụ nnọchiteanya.
Nke a na-abịa
dịka Trump na-ewesara ụfọdụ ụlọakwụkwọ Amerịka iwe, bụ ndị o kwenyere na ha
anaghị eme nnyocha ọfụma, ma kwuo na ụfọdụ ha na-akpaoke n’ịnabata ụmụakwụkwọ n’ụlọakwụkwọ
ha.
Ozi a nke ụlọọrụ ntaakụkọ CBS hụrụ nyere ụlọọrụ ndị a iwu ka
ha kagbuo nnyocha akwụkwọ njem ọbụla ha na-etinyebeghi ụbọchị onye ahụ ga-abịa kama
gaa n’ihu mee ndị nke e tinyerela ụbọchị a sị ha abịa.
A na-enyocha ụmụakwụkwọ si mba ọzọ chọrọ ịgụ akwụkwọ n’Amerịka
n’ụlọọrụ ha dị na mba ndị a tupu e nye ha akwụkwọ ikike ịbanye Amerịka.
Ọtụtụ ụlọakwụkwọ ndị a na-enwetekaarị ọkpụrụkpụ ego ha ji arụ
ọrụ site n’aka ụmụakwụkwọ si mba ọzọ bịara ịgụ akwụkwọ n’Amerịka.
Mahadum Havard bụ otu ụlọakwụkwọ Onyeisiala Trump kpụụ n’ọnụ
n’okwu ahụ, n’izuụka gara aga Trump machiri ụlọakwụkwọ ịnabata ụmụakwụkwọ si na
mba ndị ọzọ ma kwụsị ndị nkuzi si mba ọzọ ịbịa mee nnyocha na mahadum ahụ.