BBC agbaala onyeisi otu na-atụ mgbere mmetọ ahụ na mpaghara Dubai dị iche iche n'anwụ

- Onye dere ya, Runako Celina
- Ndị mere akụkọ a, BBC Eye Investigations
Ịdọ aka na ntị: Contains disturbing content and graphic descriptions of sexual acts
Nnyocha BBC achọpụtala otu nwoke na-atụ mgbere mmetọ ahụ na mpaghara Dubai dị iche iche ma na-aghọrị ụmụnwaanyị dị iche iche.
Charles Mwesigwa, onye kwuru na ọ bụbu ọkwọụgbọala bọs na Lọndọn, gwara onye ntaakụkọ nzuzo anyị na a kwụọ ya otu puku dọla, na ya nwereike ịkpọta ụmụnwaanyị ga-eme ihe ọbụla ụmụnwoke chọrọ na mmemme aramara.
Akụkọ banyere mmemme aramara a na-eme na UAE agbaala n'anwụ kemgbe ọtụtụ afọ. Akara #Dubaiportapotty, nke mmadụ nde narị anọ na ise kiriri na TikTok, bụ nke na-ekwu maka ụmụnwaanyị na-achụ ego site na mmemme aramara dị iche iche.
Nnyocha ụlọọrụ BBC mere chọpụtara na ihe a dị omimi.
Ụmụagbọghọ mba Yuganda gwara anyị na ha atụghị anya na ọ bụ ọrụ aramara ka ha ga na-arụrụ Maazi Mwesigwa. Oge ụfọdụ, ha na-eche na ha na-aga UAE ịga rụọ ọrụ n'ụlọ azụmahịa maọbụ ụlọ oriri na ọṅụṅụ.
Otu onye Mwesigwa na-akpọnye ụmụnwaanyị na-anyụkwasị ụmụnwaanyị a nsị dịka "Mia" onye anyị gbanwere aha ya iji chekwaa ya, ma bụrụ onye kwuru na Maazi Mwesigwa ji ya n'ọrụ..
Maazi Mwesigwa gọnarịrị ebubo ndị a niile. O kwuru na ọ na-enyere ụmụnwaanyị aka ịchọta ebe obibi n'aka ndị nwee ụlọ a kpọrọ 'landlord na bekee ma kwuo na ụmụnwaanyị na-eso ya aga mmemme maka na ya na ndị nwere ego na Dubai na-enwe mmekọ.
Anyị chọpụtara na ụmụnwaanyị abụọ Maazi Mwesigwa tụrụ mgbere ha si n'ụlọ elu daa ma nwụọ. N'agbanyeghị na e kwuru na ha ji aka ha gbuo onwe ha, ezinaụlọ ha na-ekwu na ndị uweojii kwesiri ime nnyocha zuruoke
Maazi Mwesigwa kwuru na ndị uweojii Dubai nyochara ihe ndị a ma gwa anyị ka anyị kpọtụrụ ha maka ozi. Ha azaghachighị oku anyị kpọrọ ha.

Ebe foto si, Family handout
Otu nwaanyị ahụ nwụrụ aha ya bụ Monic Karungi, si mpaghara ọdịda anyanwụ Yuganda bịa Dubai.
Ya na ọtụtụ ụmụnwaanyị ndị ọzọ na-arụrụ Maazi Mwesigwa ọrụ bi n'otu ụlọ, nke a bụ ihe otu nwaanyị anyị na-akpọ Keira, onye kwuru na ya Monic bi ebe ahụ kemgbe afọ 2022.
"Be ya dịka ebe a na-azụ ahịa... Ha ruru ụmụnwaanyị 50. Obi adịghị ya mma maka na ọ bụghị ihe ọ tụrụ anya ka ọ na-ahụ," ka Keira gwara anyị.
Nwanne nwaanyị Monic bụ Rita kwuru na Monic chere na ọrụ ọ bụ orụ ụlọọrụ azụmahịa ka ọ bịara Dubai ịrụ.
"Nwoke a[Maazi Mwesigwa] mesiri m ike oge m gwara ya na m chọrọ ịlaghachi n'obodo,' ka Mia bụ onye makwaara Monic na Dubai kwuru. Okwuru na oge mbụ ọ bịara, ọ gwara ya na o ji ya ụgwọ puku pound abụọ £2,000 ($2,711) tinyere na ụgwọ ahụ mụbawayere ugboro abụọ n'ime izuụka abụọ.
"Ego njem ụgbọelu, maka akwụkwọ visa gị, maka ebe obibi gị na nri," ka Mia kwuru.
"Ihe nke a pụtara bụ bụ na ị ga-arụsi ọrụ ike ma na-arịọ ụmụnwoke ka ha bịa dịnaa gị."
Monic ji Maazi Mwesigwa ihe karịrị puku dọla iri abụọ na asaa $27,000 (£19,918) dịka ọtụtụ izuụka gara, nke a bụ ihe otu onye ezinaụlọ ya anyị na-akpọ Michael kwuru na ọ gwara ya. O kwuru na o zitere ya ozi na-agba anya mmiri ọtụtụ ugboro.
Mia gwara anyị na ụfọdụ ndị na-edina ya bụ ndị ọcha si mba Yurop ma bụrụ ọtụtụ ndị nwere ihe mmasị dị iche iche.
"E nwere otu nwoke a, na-anyụkwasị ụmụnwaanyị nsị. Ọ na-agwa ha taa nsị ya," ka o kwuru n'olu ala.
Nwaanyị ọzọ anyị na-akpọ Lexi, onye e ji ọrụ ọzọ ghọrịaa, kwuru na ihe Mia kwuru bụ eziokwu ma kwuo ahụhụ ịri nsị ahụ na-eme kwa mgbe kwa mgbe.
"E nwere otu nwoke kwuru na: Anyị ga-akwụ gị ego Dirham dị puku iri na ise ($4,084, £3,013) iji dinaa gị n'ike, yụọ gị mamịrị n'ihu, tie gị ihe ma nye gị puku ise ($1,361, £1,004)'" ma ọ bụrụ na anyị mee ihe onyonyo ebe ị na-eri nsị
"Oge niile m kwuru na m agaghị eme ya, ọ na-eme ka ha nwee mmasị karịa. Ha chọrọ onye ga-ebe akwa, tie mkpu ma gbaa ọsọ. N'uche ha, onye ahụ kwesiri ịbụ onye isi ojii.
Lexi kwuru na ọ gbara mbọ inweta enyemaka n'aka ndị uweojii. Mana ndị uweojii gwara ya na ndị Afrịka na-eji aka ha ewetara onwe ha nsogbu. Anyị achọghị itinye aka na ya. Ha tụhapụrụ ekwenti oku ha.
Anyị jụrụ ndị uweojii Dubai maka ebubo a mana ha azaghachighị anyị.
Lexi mechara gbaa ọsọ gbaga Yuganda ma na-enyere aka azọpụta ụmụnwaanyị ndị ọsọ dabanyere n'ụdịrị ọnọdụ a.

Ịchọta Charles Mwesigwa adịghị nfe. ọ bụ naanị foto ya dị n'ịntaneti e si n'azụ see ya ka anyị hụrụ. Ọ na-aza aha dị iche iche na soshal midia.
Mana ọtụtụ nnyocha anyị mere nakwa enyemaka si n'aka onye bụbu onye otu ya, anyị chọpụtara ebe o bi n'ogige ndị na-adachaghị ogbenye bi n'obodo Jumeirah Village Circle.
Iji chọpụta ihe ndị akaebe gwara anyị banyere ọrụ ya - ịtụ mgbere aramara ụmụnwaanyị - anyị zigara onye ntaakụkọ zoro ezo onye goziri onwe ya dịka onye na-ahazi mmemme na-achọ ụmụnwaanyị maka mmemme ndị ọgaranya.
Maazi Mwesigwa bụ onye na-ekwu okwu nwayọ nwayọ dịka ọ na-ekwu maka ọrụ ya.

"Anyị nwere ihe ruru ụmụnwaanyị iri abụọ na ise," ka o kwuru. "Ọtụtụ n'ime ha nwere obi ime ihe ọbụla... ha nwereike ime ihe ọbụla."
Ọ kọwara na a na-akwụ otu nwaanyị otu puku dọla $1,000 (£738) iji dinaa ya n'otu abalị na kwụọ ya ego ole a na-akwụ ma kwụọ ya karịa ma ọ bụrụ na ọ ga-eme ihe dị agha". Ọ gwara onye ntaakụkọ anyị ka ọ bịa hụ etu ihe si aga n'otu abalị.
Oge a jụrụ ya maka "Dubai porta potty" ọ zara: "Agwala m gị, ha nwere obi ie ihe ọbụla. Mụ kwuo maka inwe obi... Aga m ezitara gị onye kachasị ha eme ihe siri ike."
Oge mkparịtaụka a na-aga n'ihu, Mazzi Mwesigwa kwuru na ya bụbu ọkwọụgbọala bọs na Lọndọn. Anyị hụrụ ihe akaebe gosiri na ọ malitere ọrụ ahụ n'ọwụwa anyanwụ Lọndọn n'afọ 2006.
Ọ gara n'ihu gwa onye ntaakụkọ anyị na ọ hụrụ ọrụ n'anya
"N'agbanyeghị ụdịrị ego ọbụla m nwetara taa, aga m aga n'ihu na-arụ ọrụ...ọ bụ ihe na-enye m obi aṅụrị
Troy, nwoke rụbuuru Maazi Mwesigwa ọrụ, gwara ọtụtụ ihe ndị ọzọ banyere etu ọrụ ya si aga.

O kwuru na Maazi Mwesigwa na-enye ndị ọrụ nchekwa ego iji nye ụmụnwaanyị ya ohere ka ha banye n'ụlọ oriri na ọṅụṅụ n'abalị.
"Anụla m ụdịrị ndina nwoke na nwaanyị mụ na-ahụtụbeghị na ndụ m. Ọ naghị etinye uche ya n'ahụhụ ọbụla ụmụnwaanyị ya na-ata, ihe dị ya mkpa bụ obi aṅụrị ụmụnwoke na-agba ya aka ahịa...ụmụnwaanyị a enweghị ohere inwereonwe ha...Ha na-ahụ ndị otiegwu, ndị na-agba bọọlụ, ha na-ahụ ndị isiala."
Troy kwuru na aka iwu gọọmenti akarọ kparaMaazi Mwesigwa maka na ya bụ Troy na ndị ọzọ bụ ndị ọkwọụgbọala. O kwuru na Maazi Mwesigwa na-eji aha ha zụrụ ụgbọala na ụlọ iji gbochie aha ya ịgba n'akwụkwọ ọbụla.
Na 27 Eprel 2022, Monic gosiri foto o sere n'Al Barsha - n'ogige obibi a ma ama na Dubai. Ka abalị anọ gara, ọ nwụrụ. Ọ bụ ọnwa anọ ka ọ nọrọ na UAE.
Dịka Mia si kwuo, Monic na Maazi Mwesigwa nwere esemokwu nke mere ka ọ pụọ. Mia kwuru na Monic anaghị erube isi nye maọbụ mee ihe ụfọdụ Maazi Mwesigwa chọrọ ma chọpụta ụzọ ọ ga-eji kwụsị ịrụrụ ya ọrụ.
"O nwetara ọrụ dị aghaa. Obi dị ya ụtọ. O chere na ọ ga-abụ nwereonwe ya ma jiri ndụ ya mee ihe ma kwụsị idina ụmụnwoke dị iche iche," ka Mia kwuru.
Monic kwagara n'ụlọ na-adịghị anya ebe ahụ. Ọ bụ n'elu ụlọ ahụ ka o si na ya dd na Mee 1, 2022.

Ebe foto si, Instagram
Ikwu na ibe Monic bi na UAE aha ya bụ Michael, kwuru na ọ chọrọ inweta asịsa banyere ọnwụ ya oge ahụ.
Ndị uweojii gwara ya na ha akwụsịla ime nnyocha maka na ha hụrụ hụrụ mmanya na-aba n'anya na ọgwụ n'ime ụlọ ahụ Monic si na ya daa, ọ bụ naanị akara aka ya ka a hụrụ n'ogige ụlọ ahụ.
O nwetara akwụkwọ kpebiri na Monic anwụọla n'ụlọọgwụ, mana o kwughị etu o si nwụọ. Ezinaụlọ ya enweghị ika inweta nchọpụta nnyocha toxicology maka ọnwụ ya.
Mana otu nwoke si mba Gana bi n'ụlọ ahụ nyere aka ma kpọrọ ya gakwuru nwoke o kwuru na ọ bụ ya bụ onyeisi n'ebe Monic na-arụ ọrụ.
Michael kọwara etu ụlọ ahụ dị oge ọ bịara ebe ahụ ma hụ ebe ụmụnwaanyị ahụ bi.
O kwuru na anwụrụ sịga shisha juru ebe niile n'ime ụlọ ahụ. Ọ hụkwara ọgwụike cocaine dị n'elu tebulu nakwa ụmụnwaanyị na-eme aramara ahụ.
He says through the cloud of shisha smoke in the living room, he made out what looked like cocaine on the table and women having sex on chairs with clients.

Ebe foto si, Instagram
Ikwu na ibe Kayla kwuru na dịka ezinaụlọ Monic, ha nụrụ na ọ bụ mmanya ọkụ na ọgwụike butere ọnwụ ya. Mana nnwale nsị BBC hụrụ gosiri na o nweghị nke ọbụla n'ime ha dị ya n'ahụ oge ọ nwụrụ.
Dịka ndị ezinaụlọ Kayla nwereike bulata ozu ya maka olili, ebulataghị ozu Monic.
Nnyocha anyị mere chọpụtara na ọ dịka e liri ya na mpaghara ogige ili Al Qusais dị na Dubaị a maara dịka "The Unknown".
Monic na Kayla bụ akụkụ obosara njikọ dị n'etiti Yuganda na mpaghara Gulf nke mmadụ ọbụla amaghị.
Dịka Yuganda na-ahụta ogogo anamachọrụ na-arị elu n'etiti ndị ntoroọbịa, ịga mba ofesi maka ọrụ, tụmadụ na mba ndị nọ na mpaghara Gulf abụrụla ngalaba na-ewetara Yuganda ụtụisi $1.2bn (£885m) kwa afọ.
Mana ohere ndịa nwereike inwe ọghọm.
Mariam Mwiza, onye a na-anụ olu ya na Yuganda gbasara mmegide kwuru na ya enyela aka napụta ihe karịrị mmadụ narị asaa na mpaghara Gulf.
"Anyị na-enweta mkpesa gbasara mmadụ ndị e kwere nkwa ọrụ, ka anyị sị, n'ụlọahịa. Mana [onye ahụ] emechaa bụrụ onye e refuru maka ịgba akwụna," ka ọ gwara anyị.

Maka ndị ezinaụlọ Monic, ha na-eru uju n'ime ụjọ. Ụjọ maka ezinaụlọ ndị ọzọ nwereike ịgabiga otu ọnọdụ ahụ ha na-agabiga, ma ọ bụrụ na e nweghị ihe e mere.
"Anyị niile na-ele ọnwụ Monica," ka ikwu ya bụ Michael gwara anyị. "Mana ọ bụ onye nọ ebe ahụ maka ụmụagbọghọ ndị nke ka dị ndụ? Ka ka nọ ebe ahụ. Ha ka na-ata ahụhụ.
BBC gwara Charles "Abbey" Mwesigwa ka ọ zaghachi ebubo niile e boro ya na nnyocha anyị. Ọ gọrọ agọ na ya enweghị ndị na-agbara ya akwụna.
Ọ sịrị: "Ihe ndị a bụ ebubo ụgha.
"Agwara m gị na abụ m naanị onye na-agba oringo, onye na-akpọta ndị ma ka e si eri ego na tebụlụ m, nke mere ọtụtụ ụmụagbọghọ ji efegharị na tebụlụ m. Ọ bụ ya mere m ji mara ọtụtụ ụmụagbọghọ, ọ gwụchaala."
O kwukwara na "[Monic] ji akwụkwọ nkọwa onwe ya nwụọ, nke pụtara na o nweghị onye na-anara ya ego maka ịkpọrọ ya. Tupu ọ nwụọ, ahụghị m ya anya ihe karịrị izuụka anọ maọbụ ise.
Amaara m [Monic na Kayla] ma [ha] bi n'ụlọ dị iche iche. Ọ bụrụ na e nweghị onye a nwụchiri n'ụlọ abụọ ahụ maọbụ ndị nna nwe ụlọ ha, ya bụ na o nwere ihe kpatara ya. Ndị uweojii Dubaị mere nnyocha gbasara ọnọdụ abụọ ahụ, ikekwe ha ga-enyere ụnụ aka."
BBC kpọtụụrụ ụlọọrụ ndị uweojii Al Barsha iji rịọ maka akwụkwọ nnyocha Monic Karungi na Kayla Birungi. Ha azaghị oku arịrịọ ahụ maọbụ ebubo e boro na e mebeghị ezigbo nnyocha gbasara ọnwụ Monica na Kayla.
BBC enweghị ike hụ onye na-eme nnyocha gbasara nsị, dịka o siri metụta Monic Karungi, maọbụ kwusara nna nwe ụlọ ya okwu tupu ọ nwụọ.


