Ihe onyonyo ndị na-egosi ego n'ime akpatị e si mba Gabon?

Foto gosiri uwe ndị agha pụrụiche mba Gabon nakwa akpatị ego

Ebe foto si, Getty/Snip/Collage

Dịka ewepụrụ onyeisiala Gabon bụ Ali Bongo Ondimba, ụfọdụ ihe onyonyo na-efegharị na-egosi ndị na-arụbu ọrụ gọọmentị ejidere ebe ha bu akpa ego.

BBC achọpụtala na opekatampe otu n'ime ihe onyonyo ndị ahụ abụghị eziokwu.

Ihe onyonyo ahụ gosiri ebe a nwụchiri onyeisi ụlọomeiwu mba Gabon bụ Guy Nzouba-Ndama n'afọ 2022.

N'ime ihe onyonyo ahụ Nzouba-Ndama nọ n'etiti ọha mmadụ n'azụ ụgbọala ukwu dịka agbakara akpatị abụọ ma chọpụta na ọ bụ ego CFA mba ahụ juru n'ime ya.

Nke a bụ ihe mere n'oke ala mba Gabon nakwa Kongo.

Mana ihe ndị mmadụ na-ekwu na soshal midia na-akọwa na ọ bụ n'ụbọchị 30 n'ọnwa Ọgọst ka o mere nke abụghị eziokwu.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

O nwekwara ihe onyonyo ndị ọzọ nke ndi mmadụ na-ekesa na-ekwu na o si Gabon mana BBC achọpụtabeghi ma ndị ahụ a bụ eziokwu.

Abụọ n'ime ha na-egosi ebe ụfọdụ ụmụnwoke nọ n'imeụlọ ebe akpa dị icheiche nwere ego n'ime ya dịgasị.

O nwere ebe o ruru onye na-ese ihe onyonyo ahụ e gosi n'akụkụ aka nri onye yi uwe pụrụiche ndị nche mba Gabon bụ otu otu n'ime nke ndị agha napụrụ Ali Bongo ọchịchị n'ike.

Ụfodụ ndị mmadụ ekwuola na ọ bụ be nwa Ali Bongo ka esere ya bụ onyonyo ebe ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ be otu onye ezinaụlọ ha ka ihe a mere.

Nwa Ali Bongo bụ Nouredin Bongo Valentin nakwa onyeisi ndị ọrụ ya bụ Chislain Ngoulou so na ndị ndị agha nwụchiri n'ime ụlọ ha.