Ihe mere m ji azọ ọkwa n'ụlọomeiwu Naịjirịa n'aha Labour Pati - Hilda Dokubo
Nwada na-eme ihe nkiri na Nollywood a ma ama bụ Hilda Dokubo ekwuola ihe mere o ji azọ ọkwa ịnọchịte anya ndị Asalga/Akulga, Rivers Steeti n’ụlọomeiwu nta nke Naịjirịa.
Na mkparịtaụka ya na BBC Igbo mere, ọ sị na ọ chọrọ ịnọchi anya ndị obodo ya ọfụma iji mee ka oke ruuru ha rute ya aka.
Ọ sị na ndị obodo ya enweghi ọtụtụ ihe dịka ụlọọrụ, ụzọ dị mma nakwa ihe ndị ọzọ na-agbanyeghi na gọomentị na-egwupụta mmanụ agbidi n’obodo ha.

Ebe foto si, Hilda Dokubo
Hilda bụ onye ji ọkọlọtọ Labour Pati azọ ọkwa a, sị na ọrụ ikwuchitere ndị mmadụ ọnụ bụ ihe ọ dị mbụ arụbu mana ugbua ọ chọrọ ka ọ gbatịkwuo ngalaba ya ka ọtụtụ ndị mmadụ keta oke n’ọrụ ya.
O kwuru na ihe mere o jiri họrọ Labour Pati bụ maka Peter Obi ma tinyekwara na ọ bụ pati nwere ezi ntọala metụtara ndị ọrụ.
Hilda gara n’ihu kwuo na-agbanyeghi na ọ bụ nwaanyị na ọ gaghị egbochi ya ịzọ ọkwa a ma nwete mmeri ịrụrụ ndị obodo ya ọrụ.
“Maka ndị na-ekwu na ọchịchị Naịjirịa abụghị maka ịgba nkiri, ha amaghị na ọ bụ ndị na-eme ihe nkiri maara ihe banyere ọnọdụ ndị mmadụ nakwa ihe a ga-eme ka obi dị ha mma.”
O kwuru na ndị niile nọ n’ọchịchị ugbua nwere ngalaba ha nọbu tupu ha abanye n’ọchịchị>
“Onye ọbụla nọ n’ọchịchi nwere ebe o si bịa ma banye n’ọchịchị, ihe dị mkpa bụ ị maara ihe ị ga-arụ ma ịbanye n’ọchịchị.”
Kirie ihe o kwuru n’uju;

Ebe foto si, Hilda Dokubo
Onye bụ Hilda Dokubo?
- Hilda Dokubo bụ onye na-eme ejije ama ama nke ukwuu.
- O so na ndị bidoro ime ejije na Naịjirịa.
- Ọtụtụ ihe nkiri Naijiria ọ merela gụnyere Gone Forever, My Goodwill, na The CEO.
- Dokubo eritela ọtụtụ nturuugo n'ime ejije.
- O hibere otu NGO a kpọrọ 'Center for Creative Arts Education (CREATE)', nke na-akwalite nka iji nyere ụmụnwanyị na ndị ntoroọbịa aka.
- Hilda Dokubo bụkwa onye ọ na-amasị ikwuchitere ndị na-enweghi ọnụ na-ekwuchitere ha.
- N'afọ 2020, Hilda Dokubo sonyere ndị ngagharịiwe EndSars na Legọs maka mmegbu ha sị na ndị uweojii na-eme ndị mmadụ.


