Etu ọkụ igwe mmanụ agbidi si gbagbuo mmadụ 12 na Rịvas Steeti

Ọkụ pịpụ mmanụ agbịdị

Ebe foto si, DUMNAMENE FYNFACE

Gọọmentị ekwuola na ọkụ okporo igwe mmanụ agbidi egbuola mmadụ iri na abụọ na Rịvas Steeti n'ụtụtụ taa.

Ndị uweojii nke steeti ahụ kwuru na ya bụ ọkụ gbara n'obodo Rumuekpe nke dị n'okpuruọchịchị Emuoha nke steeti ahụ.

Ndị uweojii kwuru na ndị a ọkụ a gburu bịara ikuru mmanụ ụgbọala mgbe ọ baara ọkụ ma gbuo ha.

Ha kwuru sị, "Amabeghị aha ndị ọkụ a gburu, kama ụgbọala ise, keke anọ na otu ọgbatumtum gbariri na ya bụ ọkụ.

Rivas steeti bụ otu n'me steeti ndị e si amịpụta mmanụ agbidi na Naịjirịa, kwamgbe kwamgbe ka a na-anụ akụkọ maka ọkụ sitere na paịpụ mmanụ agbịdị.

N'afọ gara aga mmadụ iri abụọ na ise nwụrụ n'ogige ndị omekome ji agbanwe mmanụ agbịdị na steeti ahụ.

Ka nke a na-eme ka gọọmentị Naịjirịa na-ekwu na ha na-emefu ijeri kwụrụ ijeri naịra e ji edozi paịpụ mmanụ agbidi ndị a.

Ọkụ pịpụ mmanụ agbidi

Ebe foto si, DUMNAMENE FYNFACE

Gọọmentị Steeti ahụ ji ohere a dọọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha wepụ aka na imebi pịpụ mmanụ agbidi maọbụ ogige adịgboroja ebe a na-agbanwe mmanụ agbidi.

Onyeisi otu Nigeria Security and Civil Defence Corps (NSCDC) nke Rịvas steeti bụ Michael Ogar tiri ndị ezịnụlọ ihe a metụtara aka n'obi ma sị ka ndị ọzọ were ya mụta ihe.

O kwuru sị, "Ọtụtụ mgbe ka ndị otu anyị na-awakpo ma mebie ogige ndị omekome ji agbanwe mmanụ agbịdị, kama dịka ị na-ewepụ otu ọzọ ebilie".

Ogar gara n'ihụ kwuo sị, " Ụfọdụ mgbe ha na-alụso ndị otu anyị ọgụ kama anyị kwụ chịm".

Ohi a na-ezu mmanụ agbịdị na-emetụta akụnụba Naịjirịa dịka ọ bụ ya bụ ebe Naịjirịa si enweta ego karịa.

Nsogbu ọzọ kwa ọ na-ebute bụ ajọ ikuku dịka ndị omekome na-esi mmanụ agbịdị a na-ezipụ ikuku ụnyi na mbara eluigwe.

Ọkụ pịpụ mmanụ agbidi

Ebe foto si, DUMNAMENE FYNFACE