Ihe dị n'etiti mụ na Bam Bam - Uzor Arukwe
- Onye dere ya, Chinonso Ugorji
- Ndị mere akụkọ a, Journalist
- Onye dere ya, Donald Wogu
- Ndị mere akụkọ a, Video Journalist
Nwaafọ Imo Steeti a ma ama na-eme ejije bụ Uzor Arukwe akọwaala ihe dị n'etiti ya na onye otu ya nke nwaanyị bụ Bamike Olawunmi a maara nke ọma dịka Bam Bam.
Maazị Uzor Arukwe kpughere ụdị mmekọrịta dị n'etiti ya na Bam Bam oge ya na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụiche.
Dịka nwaokoroọbịa ahụ siri kwuo, oge mbụ ya na Bam Bam zutere ihu na ihu bụ mgbe ha mere ejije wuru ewu aha ya bụ 'Love In Every Word'.
"Agba nke mbụ n'ejije ahụ bụ oge mbụ mụ na Bam Bam hụrụ anya. Ahụbeghị m ya na mmadụ e wezụga oge m hụrụ ya n'ihe omume Big Brother," ka Uzor kọwara.
Oge a jụrụ ya gbasara asịrị ụfọdụ mmadụ na-ebugharị na o nwere ihe dị n'etiti ya na Bam Bam, Uzor kọwara nke ahụ dịka akaọrụ ndị na-efesa akụkọ ụgha na soshal midịa.
Ọ kọwara na tupu Bam Bam, ọ bụ Bimbo Ademoye ka ndị mmadụ chere na o nwere ihe na-aga n'etiti ha.
"Alụọla m nwunye, ma n'eziokwu nke ahụ abụghị ihe a ga-akọ maka ya, maka na nke ahụ abụghị oge mbụ mụ na ụmụnwaanyị soro mee ejije. Mana nke kachasị metụ m n'ahụ bụ akụkọ ụgha ha fesara na mụ atụwala nwaanyị ahụ ime. Ọ bụ oge ahụ ka m pụtara baa mba iji gwa onye na-efesa akụkọ ahụ na ọ bụghị eziokwu," ka ọ gwara anyị.
Uzor mere ka o doo anya na ọ bụ ọrụ ka ndị na-eme ejije na-arụ, dịka ha na-agba mbọ ime ka ihe niile dị ka ihe mere eme.
"Gị nye m Shaffy Bello ugbua, Mo Abudu maọbụ onye ọbụla, ọrụ m bụ ime ka ọ dị ka ọ bụ ihe mere eme," bụ ihe Uzor Arukwe kọwara.
Uzor Arukwe kwuru na ihe ọ na-eme tupu ọ malite ime ejije bụ izute nke nwaanyị ya na ya ga-eso mee ejije ma jụọ ya ụfọdụ ajụjụ dị iche iche.
"Kedụ nke m ga-eme mejọọ? M tinye aka ebe a di gị ọ ga-ewe iwe maọbụ baa mba? Ihe m ji eme ya bụ ka m ghara imefe ihe oke."

Ebe foto si, UZOR ARUKWE/INSTAGRAM
Nwoke Nkwerre ahụ na-eme ejije kwuru na ụjọ na-atụ ya ka ndị na-ahazi ejije ghara ime ka e jiri otu agwa mara ya, n'agbanyeghị na ihe dị etu ahụ dịkwa na Hollywood.
Mana o kwuru na ihe bụ obiụtọ ya bụ na agwa "Odogwu" na-enye ya ego ugbua, dịkwa ka ụlọorụ ndị a ma ama na-abịakwute ya n'ihi agwa ahụ.
"Odogwu Paranran akwụrụla chịm, ọtụtụ ụlọọrụ ndị a ma ama na-akpọtụrụ anyị maka na àgwà ahụ masịrị ha. Ha na-abịakwute m maka na ha chere na agwa odogwu dabara n'agwa e ji mara ụmụnne na ụmụnna anyị," Ka Uzor kwuru.
Ka o sina dị, o kwuru na ya ga-ebuso ọnọdụ ahụ agha, ka ndị mmadụ malite ịghọta na ya bụ naanị onye na-eme ejije, nakwa àgwà ọbụla e nyere ya ka ọ ga-eji mepụta ezigbo ejije.

Ebe foto si, Uzor Arukwe/Instagram
Uzor Arukwe kwukwara okwu gbasara ejije ọhụrụ o jiri aka ya mepụta, nke aha ya bụ "Alive Till Dawn".
Ọ sịrị: "O nwere mgbe m nụrụ maka ejije zombie ha mere na Naịjirịa mana ọ pụtaghị, ọ bụ ya ka m jiri gwa ndị otu m sị ka anyị gbalịa mee ejije dị iche na nke ndị ọzọ na-eme, ọ bụ etu ahụ ka ejije zombie anyị siri malite."
O kwuru na ejije ahụ na-eme nke ọma, maka na dịka ụdịrị ejije a na-ahụbeghị mbụ na Nollywood, o nwetala ihe karịrị nde Naịra iri asaa (N70m) na sịnịma.
Ọ gbara ndị mmadụ ume ka ha chere maka agba nke abụọ nke ejije ahụ n'ihi na ya na ndị otu ya ga-amalite ịchịkọta ihe ndị ha ga-eji mee ya oge na-adịghị anya.
Uzor gara n'ihu kwuo na ịgba egwu ekwesịghị ịbụ ihe e ji agbasara ọha ejije ma ọ bụrụ na a haziri ihe niile ahazi na Naịjirịa, kama o kwukwara na o nweghị ihe dị njọ ọ hụrụ n'ime ya.
"Ọ bụrụ ebe a haziri ihe ahazi, kedụ ihe jikọtara ịgba egwu na ịgbasa ejije, ọkachasị ndị so mee ejije ahụ na ndị chịkọtara ya? Mana ị hụlanụ na ahịa anyị dị iche ebe a, ma o nweghịkwa ihe dị njọ na ya".
"Ebe ndị Naịjirịa nọ ugbua bụ imepụta ihe ngosi na ihe nkiri. Ọ bụrụ na i nwereike iji ihe ngosi na ihe nkiri ndị i kepụtara maka ejije ahụ nweta ndị mmadụ ma mee ka ha chịa ọchị, echere m na ọ bụ ebe ịgba egwu batara. Ọ bụghị na ọ bụ naanị ịgba egwu, maka na ị gbachaa egwu oge ụfọdụ, ndị mmadụ agaghị apụta," ka Maazị Uzor kwuru.



