Gịnị mere ọnụahịa mmanụ gaasị eji esi nri ji arị-elu ugbua?

Onye bu igbe mmanụ gaasị

Ebe foto si, Gift Andrew/BBC

Nkọwa foto, Onye bu igbe mmanụ gaasị
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ọnụahịa mmanụ agbịdị gaasị eji esi nri na-arị elu n'ụfọdụ steeti dị na Naịjirịa kemgbe abalị ole ma ole gara aga.

Ọtụtụ ndị mmadụ gwara BBC News Igbo na ọnụahịa mmanụ gaasị gbagoro site na N1,200 ruo N2,500 n'ụfọdụ dị steeti.

N'isi obodo Abuja, a na-ere mmanụ gaasị bido na N1,000 ruo N1,800, mana na steeti dịka Ogun steeti a na-ere otu lịta gaasị N2,000 maọbụ karịa.

Akụkọ anyị na-enweta na ndịda ọwụwa anyanwụ Naịjirịa na-egosi na ọbụghị otu ihe na-eme na mpaghara ahụ ugbua.

Etu ọnọdụ dị na ndịda ọnụwa anyanwụ Naịjirịa

Onye bu igbe mmanụ gaasị eji esi nri n'isi

Ebe foto si, Tolu Owoeye/Getty Images

Nnoycha BBC News Igbo mere maka ọnụahịa a na-ere gaasị na steeti dị iche iche na ndịda ọnwụwa anyanwụ.

Ndekọ ọnụahịa mmanụ gaasị BBC News nwetere n'Enugwu, Ebonyi, Abia, Imo na Anambra steeti na-egosi na o rubeghị puku naịra abụọ N2,000 maọbụ karịa na mpaghara ahụ ọkachasị n'oge akụkọ a na-apụta.

Ọtụtụ ndị mmadụ kwuru ego ole a na-ere ya na steeti ha nakwa gburugburu ha:

  • Anambra – Gladys Uzoezie sị na a na-ere ya site na N1,050 ruo N1,300 n'Onitsha mana Ogochukwu Vincentia Igboayaka sị na ọ bụ N1100 ka a na-ere ya na Nnewi.
  • Ebonyi Steeti – Uchenna Sunday kwuru na ọ bụ site na N1,150 ruo na N1,200 ka a na-ere ya na mpaghara dị ichei che na steeti ahụ.
  • Imo – Chinedum Bibian sị na ọ bụ N1, 250 na Owere mana Zukky Nnadozie sị na ọ bụ N1,200 n'Orlu, ebe Vivian Obasi sị na ọ bụ N1,300 n'Ezinihitte Mbaise.
  • Abia -Innocent Monday Chimbo kwuru na ọ bụ N1,400 ka a na-ere ya n'Ụmụahia, Abia steeti mana Cynthia Chinaza sị na ọ bụ N1,200 n'Aba.
  • Enugwu – Juliet Chizoba Chima sị na ọ bụ N1,200 n'Abakpa Nike mana Anointing Ernest Ozioma sị na ọ bụ N1300 na Nsukka.
  • Asaba, Delta Steeti – Onyeisi Ndidi kwuru na ọ bụ N1,200 ka a na-ere ya n'Asaba mana Mordi Ifeanyi sị na ọ bụ N1,350 ka a na-ere ya na mpaghara Asaba ya nọ.

E ji oghere abụbọọrụ otu PENGASSAN gbara bulie ọnụahịa gaasị - NNPCL

Onyeisi ụlọọrụ NNPCL bụ Bayo Ojulari ekwuola na ọ bụ ndị mmadụ ji maka na ndị otu Petroleum and Natural Gas Senior Staff Association of Nigeria (PENGASSAN) gbara abụbọọrụ were bulie ọnụahịa mmanụ gaasị e ji esi nri.

Ojulari kwuru nke a mgbe ọ gwara Onyeisiala Bola Tinubu okwu banyere etu ọnọdụ ngalaba mmanụ agbịdị si dị ugbua na Naịjirịa .

N'okwu ya "ọnụahịa mmanụ gaasị eji esi nrị na-arị elu. Nke a bụ ihe aka mere, nke a pụtara na mgbe ndị PENGASSAN na-agba abụbọọrụ na a kwụsịrị ikesa gaasị ihe dịka abalị abụọ maọbụ atọ".

"Ọ bụ ihe a mere o ji akọ, ndị nwere ya ji tinye ego na nke ha nwere, mana dịka ụbọchị na-aga e bidoro ikesa ya, ihe ga-eji nwanyọọ nwanyọọ hazie".