Nigeria Elections 2023: Ndị na-azọ ọkwa Gọvanọ ikpe ha n'ụlọikpe nwere ike ịgbajọ ohere ha

Ebe foto si, Facebook/Other
N'agbanyeghị na ọ fọrọ naanị izu ụka ole ma ole ka a tụọ vootu ndị ga-abụ Gọvanọ na Naijiria, ọtụtụ ndị na-azọ n'aha pati ha ka bụ usu n'ihi na ha amaghị ebe ha kwụ dịka ha nwere ikpe metụtara ntozu ha ịzọ ọkwa ahụ n'ụlọikpe.
Na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naijiria, egwu dị na ụfọdụ ndị na achụ nta votu ugbua nwere ike ha agaghị abụ ha ga-efe ọkọlọtọ ha pati n'abalị 11 nke ọnwa Maachị afọ 2023 bụ ụbọchị aga ama mbe nabọ nke buụ oke.
Lee pati ndị ka nọ n'ụlọ ikpe ugbua, lekwa ka eke si anya anwụ.
Enugwu Steeti

Ebe foto si, Peter Mbah/Facebook
PDP
Ikpe gbasara PDP Enugwu ugbua bụ na, otu nwa amadi aha ua bụ Chika Idoko kpụpụrụ Pati ahụ n'ụlọ ikpe Federal High Court Enugwu were kwuo na pati PDP ebugaghị akwụkwọ register ha nye INEC ụbọchị iri atọ tupu akwụsị ịnabata ya, nke mere na ha dara iwu Electoral Act.
Akwụkwọ ahụ mazị Chika Idoko gbara kwuru ka akagbuo aha ndị niile ji PDP azọ ọkwa ọbụla n'Enugwu, ma gbochie pati PDP iso na ntuliaka na abịanụ, ma nke Gọvanọ, nke ndị ome iwu steeti nakwa ndị ome iwu nke etiti.
Ka ọ dị ugbua, Justice Folashade Giwa-Ogunbanjo eyiela ụbọchị 15th nke February iji kpebie ikpe na ya bụ okwu.
LP
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Nke na-afịọ na Labour Party Enugwu bụ na Mazị Chijioke Edoga na Evarest Odengene na etikọ mpi ugbua na -azọ onye ọ bụ ya ji ọkọlọtọ pati ahụ azọ ọkwa Gọvanọ. Odengene gara ụlọ ikpe kwuo na ọ bụ ya gbatara form ebe Edoga bụ onye emeriri na praimari PDP tupu ọgbata na Labour Pati.
Odengene na-ekwukwa na onweghi mgbe Labour pati jiri họpụta efoga n'usoro eji ewepụta onye ga-azọ Gọvanọ.
N'ọnwa ole ma ole gara aga, ụlọ ikpe nta nyere Mazi Everest Odengene mmeri, nke ụlọikpe mkpegharị nye Chijioke Edoga mmeri. Ka mgbe ahụ,azị edoga na achụsi nta votu ya ike.
Mana ya bụ ikpe agaala n'ụlọikpe kachasị nke ala Naịjirịa.
Ka ọ dị ugbua ụlọikpe kachasị ahụ etinyela ụbọchị 27 ọnwa Febụwarị iji kpebie ikpe ahụ.
APC
Nsogbu dị pati APC n'Enugwu bụ na onye aha ya dị na akwụkwọ INEC dịka onye na-azọ “deputy governorship" bụ Robert Ogbonna Ngwu.
Mana onye ya na onye na achụ nta votu bụ Mazi George Ogara.
Nkea na ebute nnukwu nsogbu na pati ahụ ugbua.
Onye ji ọkọlọtọ APC azọ ya bụ ọkwa Gọvanọ Enugwu bụ Chief Uche Nnaji kachiri ntị duru Mazị Ogara na-achụ nta vootu.

Ebe foto si, Chijioke Edogu
Ebonyi Steeti

Ebe foto si, Ifeanyi Odii
PDP
Ọgụ na ada ugbua na PDP Ebonyi Steeti bụ na Mazi Ifeanyi Odii na Senato Obinna Ogba na-azọ onye ọ bụ ya ga eji ọkọlọtọ PDP zọọ ọkwa Gọvanọ n'ọnwa Maachị.
Isi esemokwu a nọ n'etiti ndị otu PDP n'Ebonyi malitere mgbe ndị pati ahụ kewara abụọ ma gaa mee praimarịị dị iche iche. Otu ngalaba wepụtara Mazi Ifeanyi Odii, ebe aka nke ọzọ wepụtara Sinatọ Obinna Ogba. Ka ọ dị ugbua, ụlọikpe eweghachila Mazi Ifeanyị Odii ụbọchị 30 ọnwa Jenụwarị dịka onye ji ọkọlọtọ PDP.
APC
Onye ji akara APC azọ ọkwa Gọvanọ ma bụrụkwa onyeisi ụlọomeiwu Ebonyi steeti bụ Francis Nwaifuru.
Ọtụtụ ndị out pati ahụ ekewala abụọ were sị na ha agaghị ekweta na ọ bụ Francis nwaifuru ga-eji ọkọlọtọ APC azọ ọkwa gọvanọ.
Ụfọdụ kwuru na iwe ha bụ na Nwaifuru esighi na Senatorial Zone kwesiri ịbanye ọchịchị.

Ebe foto si, Francis Nwaifuru









