You’re viewing a text-only version of this website that uses less data. View the main version of the website including all images and videos.
Ndịagha Russia ole ka e gbuorola na Ukraine?
- Onye dere ya, Olga Ivshina, Becky Dale& Kirstie Brewer
- Ndị mere akụkọ a, BBC Russia
Ndịagha Rọshịa tụnyerela isi ha na Yukren akarịala mmadụ 50,000, dịka BBC si chọpụta.
Dịka ọ nabnaa ọnwa iri na abụọ ọzọ Moscow ji malite ihe ha kpọrọ ' atụmatụ 'nkwọrị dịka anụ'- anyị agụtala ọnwụ ji pasent 25 karịa ihe ọ bụ n'afọ gara aga.
BBC Russian, otu ụlọọrụ mgbasaozi nọrọ onwe ya a kpọrọ Mediazona na ndị ọzọ wepụtara onwe ha gụkọrọ ndịagha nwụọrọla kemgbe ọnwa Febụwarị afọ 2022.
Ili ọhụrụ e gwuru na ebe a na-eli ozu nyere aka ka a mata aha ọtụtụ ndịagha nwụrụ.
Ndị otu anyị lekwara anya n'ozi si n'aka gọọmentị, akwụkwọ akụkọ nakwa na soshal midia.
Nnyocha anyị gosiri na ndịagha Rọshịa karịrị 27,300 nwụrụ n'afọ nke abụọ nke agha- nke a gosiri na isi o riri ha ịzọta ala na Yukren karịrị akarị.
Rọsụ̄ịa asaghị anyị ihe ọbụla.
Atụmatụ ịkwọrị ka anụ(meat grinder) bụ ihe e ji akọwa etu nRọshịa si eziga ndịagha ha n'igwe na mba Yukren iji mee ka ike gwụ ndịagha Yukren ma gosi ndịagha Rọshịa ebe ha nọ.
Ngụkọ ndị nile nwụrụ gosiri na ihe karịrị ndịagha 50,00 anwụọla nke bụ mmaji asatọ karịa ole gọọmentị ha kwetara nwụrụ n'ọnwa Septemba afọ 2022.
N'ezie ọnụọgụgụ ndịagha Rọshịa nwụọrọlka nwere ike ịkarị nke a.
Ngọkọ anyị agụnyeghị ndị agha nnupuisi nọ na ebe Rọshịa weghara dịka Donetsk na Luhansk dị n'Ọwụwa Anyanwụ Yukren.
Ọ bụụ na a gụnye ha, ọnụọgụgụ ndịagha Rọshịa nwụụ ga-akarị.
N'aka nke ọzọ, Yukren anaghị ekwukarị banyerere ọnụọgụgụ ndhịah=gha ha nwụrụ n'ihu agha.
N'ọnwa febụwarị onyeisiala Volodymyr Zelensky kwuru na ndịagha Yukren 31,000 atụnyela isi ha, mana nnyocha nke Amerịka mere na-ekwu na o nwere ike ndịagha ha nwụrụ erughị etu ahụ.
Atụmatụ nkwọrị dịka anụ
Akwụkwọ ndekọ ndị agha nwụrọrọla nke BBC na Mediazona nwetara gosiri isi o riela Rọshịa dịka ha na-agbanwe usoro ha ji alụ agha ahụ.
E nwere ihe gosiri na ọnụọgụgụ ndịagha Rọshịa nwụrụ n'ọnwa Jenụwarị afọ 2023, dịka o malitere kwawa mgbọ na ogbunigwe aghara aghara na mpaghara Donetsk dị na Yukren maliri elu.
Oge ndị Rọshịa lụrụ agha n'obodo Vuhledar, ha ji usoro iiiiiiiji mmadụ rinne nke amịtaghị mkpụrụ dịka, ụlọmmụta agha 'Institute for the Study of War' (ISW) siri kwuo.
"Amaghị ala, enweghị ike ọkpọaka ọgụ, nakwa enweghị ihe ime ndịagha Yukren ihe na na ntụmadi, butere na ha enwetaghị ihe were anya kama ha tụnyerere nnukwu ihe.
Ọnwụ ndịagha Roshia gbalitekwara n'oge 'Spring' afọ 2022 oge ọgụ a lụrụ na Bakhmut - oge otu ngobi , Wagner Group, nyeere Roshịa aka inweta mmeri n'obodo ahụ.
Onye ndu otu Wagner bụ Yevgeny Prigozhin, kwuru na o furu ha ndịagha 22,000.
Mmerị Rọshịa meriri obodo Avdiivka dị n'Ọwụwa Anyanwụ Rọshịa n'oge autum afọ gara aga mekwara ka ọnụ ọgụgụ ndịagha Rọshịa nwụrụ gbalie.