Ndị dọkịta mbịarambịara na UK na-atụ egwu etu mmegbu ha na-agabiga ga-esi metụta ndị ha na-elekọta

Ụfọdụ ndị dọkịta e si na mba ndị na-enwechaghị ego wee n'ọrụ n'ụlọọgwụ ndị dị na mba UK ekwuola na a na-erigbu ha n'ọrụ, ma kwuo na ha arụgbuola onwe ha n'ọrụ nke mere ha ji atụ ụjọ na o nwereike imetụta ahụike ndị ha na-elekọta.
Nnyocha BBC mere gosiri na e nwere otu ụlọọrụ ahụike mba Briten na-esi Naịjiria akpọfeta ndị dọkịnta, mana ụdịrị ọrụ a na-enye ha rụọ n'ụlọọgwụ abụghị nke gọọmentị, adịghị mma ka ụdịrị nke National Health Service (NHS).
British Medical Association (BMA) bụ otu ndị ọrụ ahụike na mba ahụ kwuru na ya bụ ihe "tụrụ ha n'anya", ma kwuo na e kwesịrị ime ka ndị nkịtị na ndị ọrụ NHS nwee otu ụdịrị ụkpụrụ na-achị ha.
BBC na ụfọdụ ndị dọkịta mbịarambịara gụnyere otu dọkịta bụ nwaafọ Naịjiria rụrụ n'ụlọọgwụ Nuffield Health Leeds Hospital n'afọ 2021.
Augustine Enekwechi kwuru na ọ hụrụ nwịị n'ọrụ ahụ dịka o nwechara mgbe ndị ọ rụruru awa 24 na-ezughi ike ma rụruo ya otu izu, nke bụ na ọ gaghịdị enwe ohere isi n'ụlọọgwụ pụọ. Ọ kọwara na ịrụ ọrụ ebe ahụ bịara dịka onye nọ "n'ụlọmkpọrọ".
Ọ sị na ike ọgwụgwụ na-eso ya bịara sie ike, nke bụ na ụfọdụ oge ụjọ na-atụ ya ma ọ ga-arụlikwa ọrụ etu o kwesịrị.
Enekwechi sị "Ama m na iburu ike ọgwụgwụ arụ ọrụ na-etinye ndị m na-elekọta n'ihe ize ndụ ma na-etinyekwa mụ onwe m n'ihe nwere ike iwetara m nsogbu agbamakwụkwọ ụlọikpe. Ọgwụrụ m ike, ịnọ n'oke nchekasị na ihe nwere ike imebi."
Mana ụlọọgwụ Nuffield Health kwuru na ọ bụghị eziokwu na ha na-esi etu a arụ ọrụ. Ha kwuru na ndị dọkịnta ha na-enweta ohere izu ike kwa mgbe kwa mgbe, ụbọchị ndị dọkịnta ga-eji zuru ike ma ghara ịbịa ọrụ, nakwa ikike ha na ndị otu ha ịgbanwe oge ọrụ ha ma ha chọọ.
Ha kwukwara na "ahụike ndị anyị na-elekọta na ndị ọrụ anyị dị anyị oke mkpa".
Ọ bụ ụlọọrụ NES Healthcare chọtaara Augustine ọrụ n'ụlọọgwụ Nuffield Health. Akaọrụ ha bụ iwe ndị dọkịnta si ofesi ọrụ - nke ọtụtụ n'ime ha bụ ndị Naịjiria - ma were ha mee ndị ọrụ bi ebi nke a kpọrọ Resident Medical Officers (RMOs) na Bekee, bụ ụdịrị ndị dọkịta a na-ahụkarị na mpaghara nke abụghị nke gọọmentị.
Augustine kwuru na ọṅụ na o nwetere ọrụ mere na o jighi tọọchị nyochaa nkwekọrịta ya na NES. Nkwekọrịta ha wepụrụ ya n'iwu na-echekwa ndị ọrụ UK ịrụfe ọrụ oke - nke a kpọrọ Working Time Directive - ma mekwaa ka e nwee ike ị na-amịpụ ego n'ụgwọ ọnwa ya aghara aghara iji taa ya ahụhụ.

Ọ bụghị naanị Augustine ka ụdịrị ihe a na-eme, dịka otu BMA gosiri BBC ọsịsa ajụjụ ndị dọkịta RMO 188 NES na ndị ọzọ dị ka ha were n'ọrụ.
Ha chọpụtara na e si n'Afrịka wee pasentị 92 n'ọrụ, dịka pasentị 81 n'ime ha si Naịjiria. Ọtụtụ n'ime ha kwara arịrị na ha arụfe ọrụ oge ha kwesịrị dịka a na-amịpụkwa ụgwọ ọnwa ha aghara aghara.
Ndị dọkịta NHS na-arụ ọrụ awa 48, maọbụ ha jiri aka ha rịọ ka ha rụruo awa 72 kwa izu.

Dkt Jenny Vaughan si n'otu Doctors Association, kwuru na "Ndị dọkịta nọ n'okpuru NHS anaghị arụkarịa abalị anọ otu oge n'ihi na anyị ma n'ezie na ọ dịghị mma ịrụfe ọrụ oke.
"Ọ dịghị mma maka nchekwa ndị a na-elekọta. Ọ dịghịkwanụ mma maka ndị dọkịnta."

Emma Runswick bụ osote onyeisioche BMA, kwuru na ọnọdụ a bụ "ihe ihere nye ọrụ ahụike mba UK".
"Ndị otu anyị esila ofesi gaa ogologo ụzọ bịa UK, bịa hụ na ọnọdụ ọrụ a bụ ịrụgbu onwe gị n'ebe ọ dị ịtụ n'anya."
NES gwara BBC na "ozi nzaghachi gbasara ahụmihe ndị dọkịta" na-arụ n'ụlọọrụ ahụ "dị ezigbo mma".
Ha kwuru na ha na-enye ndị dọkịta "ụzọ dị mma na nkwado ịchụrụ akaraka ha n'ọrụ ha chọrọ na NHS, nakwa mpaghara ọrụ ahụike mba UK gbaa gburugburu, ma kwukwaa na ọrụ ha "baara ndị Briten ezigbo uru".









