Presidential Election Petition: E hiwela ụbọchị ikpe ntuliaka dị n'etiti Tinubu, Obi na Atiku ga-ebido

Tinubu, Obi na Atiku

Ebe foto si, Tinubu/Obi/Atiku

Ụlọikpe pụrụiche na-ahụ maka ntuliaka onyeisiala bụ Presidential Election Petititon ehiwela ụbọchị Mọnde 8, 2023 dịka ụbọchị a ga-eleba anya n’akwụkwọ na-ama nhọpụta Bola Ahmed Tinubu nke All Progressive Congress (APC) aka dịka Onyeisiala Naịjirịa.

Otu n’ime ndị ọkaiwu Tinubu kwuru na ihe a ga-eme bụ ịṅa ntị na mkpesa nke a kpọro ‘pre-hearing session’ iji maara ma o nwere mkpesa ndị fọọ tupu amalite ikpe a kpọmkwem. Na oge ahụ ka a ga-ehiwezi usoro a ga-eji ekpe ikpe ahụ.

Cheta na ụlọikpe akwụsịla ịnabata mkpesa n’aka ndị gbara akwụkwọ kamgbe ụbọchị 23 nke ọnwa Eprelụ.

N’ụbọchị mbụ nke ọnwa Maachị ka onyeisi ụlọọrụ Inec bụ Mahmood Yakubu kpọpụtara aha Tinubu dịka onye meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala e mere n’ụbọchị 25 Febụwarị 2023.

Mana Atiku na Obi nke PDP na LP jụrụ ịnabata mpụtara ahụ nke mere ha jiri gbaa akwụkwọ n’ụlọikpw iji maa mmeri Tinubu aka.

Kedụ mgbe ikpe ntuliaka Peter Obi, Atiku na Tinubu ga-amalite?

Kamgbe ụbọchị 25 Febụwarị 2023 e mechara ntuliaka ọkwa onyeisiala Naịjirịa nke nyere Bola Ahmed Tinubu nke All Progressive Congress (APC) mmeri.

Ụfọdụ ndị pati e meriri dịka Peter Obi nke Labour Party (LP), Atiku Abubakar nke Peoples Democratic Party (PDP) na ndị ọzọ agbaala akwụkwọ n’ụlọikpe maka mpụtara ntuliaka ahụ.

Mana kamgbe ha gbachara akwụkwọ ndị a, ụlọikpe ‘tribunal’ ehiwebeghi ụbọchị ha ga-ebido ileba ya anya dịka ọ fọdụrụ otu ọnwa (29 Mee) ka e duo Tinubu n’iyi ọrụ dịka iwu si dị.

Nke a mere ndị mmadụ jizi na-ajụ ajụjụ sị “kedụzie ihe ji nkịta ọnwụ n’ileba anya n’ikpe a tupu oge idu n’iyi ọrụ e ruo?”

BBC Igbo kpọtụụrụ otu n’ime ndị na-ekwuchitere Peter Obi bụ Tanko Yunusa ịmata ma ụlọikpe ọ gwala ha mgbe ikpe a ga-amalite.

O kwuru na dịka usoro iwu Naịjirịa siri dị na ha agbaala akwụkwọ n’ụlọikpe maka ntuliaka ahụ, na e enyere APC otu ọnwa ịzaghachị ha bụkwanụ nke ha merela ugbua.

Yunusa sị na iwu kwuru na e kwesịrị ikpecha ikpe niile banyere ntuliaka tupu a na-edu Tinubu n’iyi ọrụ nke pụtara na ọ ga-amalite n’ime ụbọchị ole na ole na-abịa.

“A ga-agbakọ ụbọchị anyị nyere ha akwụkwọ anyị gbara n’ụlọikpe ruo ụbọchị ha zaghachịrị anyị, tinyere ya ụbọchị ise iji nye ha ohere ịhazi akwụkwọ nke ọma tupu ikpe amalite.

“Dịka ọ dị ugbua, ụlọikpe agwabeghi anyị ụbọchị ọ ga-abụ kama anyị nwere olileanya n’oge na-adịghị anya.”

Anya ụfụ mere Chimaroke Nnamani ji akatọ Peter Obi - Labour Party

Chimaroke na-akatọ Peter Obi

Ebe foto si, Chimaroke/Obi/Facebook

Mgbe BBC Igbo jụrụ Tanko Yunusa otu n'ime ndị na-ekwuchitere Obi maka ihe Labour pati nwere ikwu banyere nkatọ a Nnamani bu gọvanọ Enugu steeti na-akatọ Obi.

O kwuru na nke bụ eziokwu bụ na odoghi ha anya ihe mere Nnamani ji buru okwu banyere Obi n’isi.

“Ọ bụ anya ụfụ ka Nnamani na-emere Peter Obi maka etu o si bụrụ onye a na-ewusike ugbua, ọ chọrọ ka o mebie ya iji megide ọdịmma ndị Ọwụwa Anyanwụ.

“Ndụmọdụ na arịrịọ anyị na-arịọ ya bụ ka o lebara onwe ya anya ma hapụ atụmatụ ndị ọ na-eme iji mebie aha Obi.

O soghi zọọ ọkwa onyeisiala, ya mere ka ọ hapụ Obi aka ka ọ chụwa okwu ntuliaka a bụ nke dị n’ụlọikpe ugbua.”

Cheta Chimaroke depụtara ozi n’akara twitter bụ ebe ọ gwara Obi ka o wepu akwụkwọ ọ gbara n’ụlọikpe megide Bola Tinubu nke APC kama ka ọ kwadoo ya.