Ndị ojiegbe gbara m egbe maka m na-azọ Gọvanọ Anambra Steeti - Jude Ezenwafor ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa

Aha onyonyo, Ndị wụrụ egbe n'ahụ m mere ya maka m na-azọ Gọvanọ Anambra - Jude Ezenwafor ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa
Ndị ojiegbe gbara m egbe maka m na-azọ Gọvanọ Anambra Steeti - Jude Ezenwafor ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa
    • Onye dere ya, Adline Okere
    • Ndị mere akụkọ a, Onyenchịkọta ndị ntaakụkọ (Editor)
    • Onye dere ya, Ebere Ekeopara
    • Ndị mere akụkọ a, Onyentaakụkọ (Reporter)
    • Ebeg o si,
    • Onye dere ya, Donald Wogu
    • Ndị mere akụkọ a, Onye ntaakụkọ na-ese onyoonyo (Video Journalist)

Kemgbe ndị omekome wakporo Maazị Jude Ezenwafor, a hụbeghị ya n'ihu igwe onyoonyo.

Kemgbe ahụ, ọ na-anata ọgwụgwọ maka mmerụ ahụ mgbọ egbe tụrụ ya merụrụ ya.

O ji obi ya niile kwụrụ chim na ọ ga-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

Onye bụ Jude Ezenwafor?

Jude Ezenwafor bụ onye na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti.

O si na Nnobi dị n'okpuru ọchịchị Idemili Saụt, Anambra steeti.

Ọ bụ onye ji ego achụ ego na-ere ụlọ.

O bi n'Abuja, ọ lụọla nwunye ma nwe ezinaụlọ nke ya.

O kwere nkwa inweta ezi nchekwa ma wulite ezi ọnọdụ agụmakwụkwọ ma o merie ntuliaka ọkwa Gọvanọ a ga-eme na Nọvemba 8, 2025 n'Anambra Steeti.

Lee nwa nke nke ihe gbasara ndị ọzọ na-azọ ọkwa n'Anambra steeti
Jude Ezenwafor yi okpu uhie na uwe ntụ ji mkpara o ji aga ka mgbe ndị oji egbe wakporo ya jiri gbaa ya egbe kọwara ihe ọ hụrụ na ebumnuche ya maka ịzọ ọkwa Anambra Steeti n'ụbọchị ntuliaka 8 Novemba 2025
Nkọwa foto, Maazị Jude Ezenwafor ji ọkọlọtọ PDP azọ ọkwa Gọvanọ Anambra steeti na ntuliaka ha a ga-eme na Novemba 8, 2025

Lee edemede mkparịtaụka ya na BBC Igbo nwere.

"Mgbọ egbe ka ndị omekome ji saa m ahụ", ka Jude Ezenwafor kwuru

Ọ gara n'ihu kwuo "Amaghị m ebe ha si, mana ama m na ọ bụ maka ọchịchị m na-azọ.

Amaghị m onye zitere ha mana ndị uweojii na ndị nchekwa na-agba mbọ ịchọpụta ndị ha bụ.

Abụ m onye Chukwu chọrọ iji napụta Anambra na ngalaba nchekwa, agumaakwụkwọ na mmepe ime obodo.

O nwere obodo ndị na-enweghị ọkụ latrik kemgbe.

O nwere obodo ndị na-enweghị ụlọakwụkwọ maọbụ na ụlọakwụkwọ ha na-ehi mmiri maọbụ na ha na-anọ n'ukwu osisi akụziri ụmụakwụkwọ ihe.

Ewepụtara m onwe m ka m nweeike dugaa Anambra n'ala e kwere ha na nkwa. Anambra ekwesịla inwe ọdọụgbọmmiri.

Ọ ga-eso n'ihe mbụ onyeisiala ga-emere m oge mbụ m ga-ezute ya dịka gọvanọ.

Ọ ga-abụ arịrịọ nke mbụ maọbụ nke abụọ maọbụ nke atọ m ga-arịọ ya ka o meere m.

Arụbuola m ọrụ dịka nnukwu onye enyemaka gọvanọ Anambra steeti n'ihe gbasara nchekwa obodo.

A sị na ọnọdụ enweghị nchekwa ọbụla gafere otu izuụka, a mara na aka gọọmenti dị ya."

Ọ gara n'ihu kọwa na, "Ọnọdụ enweghị nchekwa Anambra Steeti agafeela otu izuụka, gafee otu afọ, maka na a sị arụ gbaa afọ ọ bụrụzie omenala."

"Mana ribe okwu m ama, n'ime ọnwa abụọ m ga-abanye n'ọchịchị n'Anambra steeti, o nweghị ebe a na-abanye abanye nke mụ agaghị abanye."

Achụọla m nta vootu n'Isseke, gafee ebe ha anaghị aga. Ma Ọkịja, ma Lilu, anyị ga-abanye ma weghachi udo ebe ahụ.

Ebe a ga-eme udo, e mee udo. Ebe a ga-enye mgbaghara, e nye mgbaghara. Ebe a ga-akwa mgbọ, a kwaa mgbọ, maka na ndị be anyị ga-ebu ụzọ kwete na anyị ga-adị mma.

Mkparịtaụka ndị ọzọ na-azọ ọkwa Gọvanọ Anambra

Gbasara ntuliaka na-abịa o kwuru, "Ana m akwalite mmadụ 100 ga-akpọta mmadụ iri ga-atụnyere m vootu na wọọdụ niile, nke a pụtara na m ga-enweta vootu 1,100 na wọọdụ niile.

Anambra steeti enwetabeghị vootu ruru 200,000 n'oge ntụliaka, mana aga m enweta vootu 326,000.

Ndị a m na-akwalite bụ ndị m kpọrọ 'Anambra Millionaires Club'. Anyị bụ ndị Igbo... o nwee onye chọrọ ịmụ ọrụaka, anyị ga-akụziri ya.

Ma ndị ga-amụ ọrụaka, ma ndị ga-amụ kọmputa, ma ndị ga-amụ AI, robotics na ihe ndị ọzọ dị etu ahụ, ma ndị ga-amụ ka e si edozi isi anyị ga-akụziri ha ya.

Onye ọbụla ga-edebanye aha ya nakwa ihe ọ chọrọ ịmụ. Etu a ka anyị ga-esi zụọ ma ndị ọkwanka ma ndị ọkwọụgbọala nakwa ndị ọkwọụgbọelu.

Achọrọ m ịhụ na ọkpuru ọchịchị niile zụpụtara opekatampe ndị ọkwọụgbọelu ise maka na oge na-adịghị anya, a ga-enwe ụgbọala ndị na-efe efe.

Mụ onwe m bụ Jude Ezenwafor na-arịọ ụmụnne m ndị Anambra Steeti ka ha pụta n'ìgwè n'ụbọchị ntuliaka bụ 8 Nọvemba, 2025, ka ha bịa tụnyere pati m bụ mbụlarị na-echekwa pati ndị ọzọ, bụ PDP.

Ha bịa tụnyere Jude Ezenwafor na PDP ka ìhè bata n'Anambra steeti, ka Anambra chawapụ.