Ministri anụmanụ ọhụrụ ga-ebelata nsogbu ndị ọrụ ugbo na ndị ọchịehi - Miyetti Allah

Ebe foto si, Other
Osote onyeisi ndị Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria, MACBAN bụ Gidado Siddiki etinyela ọnụ na iwu gọọmenti etiti Naịjirịa mere maka ikewaputa mịnịstrị na ahụ maka ịkpa anụmanụ.
Gidado Siddiki sị na mbụ, mịnịstrị ọlụ-ugbo nwere ngalaba na ahụ maka anụmanụ, mana ha so na-arịọ ka e kewapụta mịnịstịrị na -hụ maka anụmanụ ka ọ kwụrụ onwe ya.
N'okwu ya “adịghị etinye anya ọfụma na ngalaba na ahụ maka ịkpa anụmanụ nke so ebute nnukwu ọgbaaghara n'etiti ndị na achi ehi na ndị ọrụ ugbo”.
“Anyị na ekele gọọmenti etiti nakwa ndị cheputara echiche ikewaputa mịnịstrị na-ahụ maka ịkpa anụmanụ”.
“Maka ajọ aha ọgụ ndị na achi ehi na ndị ọrụugbo na ewetara ndị Fulani, anyị na-achọ ụzọ anyị ga eji kwụsị ya.
Ọ dị anyị ka mịnịstrị na ahụ maka anụmanụ aga enyere aka beleta ya”
“Oge ụfụdụ ọ bụ enweghị ezi mkparịta ụka na ebute ụfọdụ ọgụ ahụ niile ị na anụ maka ya”.
“Ọtụtụ n’ime ọgụ ahụ abụghị na etiti ndị ọlụ ugbo na ndị na achụ ehi, mana ọ bụ ndị bịara zọọ na aha ha nwere na akpa mkpamkpa”.
“Mịnịstrị a ga enyere aka kpaa oke na etiti ndị omekome na ndị ọrụ ha bụ ịchụ ehi ma ọ bụ ọrụ ụgbọ”.
Gidado Siddik kwuru na nnukwu nnsogbu enwere bụ na ọtụtụ na ndị na achụ ehi anaghị agụ akwụkwọ.
Ọ gara n’ihe kwụọ na akọọla ugbo ma ọ bụ rụọ ụlọ na ala ebe ndị na achụ ehi na eso agagharị nke mere e ji ekwu maka usoro ọhụrụ eji akpa anụmanụ.
“Anyị bụ ndị na achụ ehi kwadoro usoro ọhụrụ eji achụ ehi mana ọ bụghị ihe na eme na otu ntabịanya ka ndị mmadu sị ekwu maka ya. Ọ bụ ihe a ga eji nwayọọ mee”
“Ndị na achụ ehi amaghi usoro ọhụrụ ahụ ndị mmadụ na ekwu maka ya. E kwesiri ịnye ha ezigbo nkuzi bụ nke ga ete aka tupuu ọmịta ezi mkpụrụ”.
Gidado Siddik wekwara ọkwa ọzọ dịka Sarkin Fulani na Awka, Anambra steeti, Naịjirịa.
Onyeisiala Tinubu ehiwela kọmitii ga-ahụ maka iwulite ọnọdụ anụmanụ

Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ehiwela kọmitii ga-ahụ maka itinye nnwogharị ọnọdụ ụmụ anụmanụ n’ọrụ.
Kọmitii ahụ a kpọrọ Presidential Committee on Implementation of Livestock Reforms bụ nke Tinubu hiwere iji zute ihe mkpọbiụkwụ ndị a na-ahụta na ngalaba ọrụ ugbo ma kepụta ohere ọhụrụ ga-abara ndị ọrụ ugbo uru.
Ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Ajuri Ngelale kwupụtara nke a n’ozi ọ wepụtara n’ụbọchị Tuzde 9 Julaị 2024.
Dịka ozi ahụ siri kwuo, Onyeisiala Bola Tinubu bụ onyeisioche kọmitii ahụ ebe onye bụbu onyeisioche INEC bụ Attahiru Jega bụ osote ya.
Oge ọ na-ehiwe kọmitii ahụ, Tinubu kwuru na ọ dị mkpa inwogharị usoro ọdịnaala e si akpa ụmụ anụmanụ site na nkwado ndị ọnụ na-eru n’okwu na gọọmenti steeti dị iche iche iji kepụta ohere ọhụrụ maka uto na ọganịihu nke Naịjirịa.
Onyeisiala Bola Tinubu ekepụtala mịnịstrị anụmanụ

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Naịjirịa bụ Bola Tinubu ehiwela mịnịstrị na-ahụ maka nkwalite ụmụ anụmanụ.
Ọ gbapekwara kọmitii ga-ahụ maka nnwogharị ụmụ anụmanụ a kpọrọ Presidential Committee on Livestock Reforms.
Kọmitii ahụ Onyeisiala ga-anọ n’isi ya ka a tụrụ anya iwepụta atụmatụ ndị ga-akwalite udo n’etiti ndị na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo nakwa ịdịnootu Naịjirịa.
Osote onyeisioche kọmitii ahụ ga-abụ onye bụbu onyeisioche ụlọọrụ na-ahazi ntụliakaelu na Naịjirịa (INEC) bụ Attahiru Jega.
Cheta na ndị otu Miyetti Allah nọọrọ izuụka ole na ole gara aga kpọọ oku ka esite na mịnịstrị ọrụ ugbo kepụta mịnịstrị ụmụ anụmanụ.












